Ala Naịjirịa eweputego taa bụ Mọnde, abalị 29 nke ọnwa Mee, dịka ụbọchị ezum-ike ndị ọrụ maka mmemme ọchịchị onye kwuo uche ya. Ozi anyị nwetere site n’aka ngalaba mgbasa ozi n’asụsụ Igbo nke ụlọ ọrụ Voice of Nigeria kwuru n’onye Mịnịsta na-ahụ maka ịhe na eme n’ala Naịjirịa bụ Adulrahman Bello Dambazau, onye lagoro ezum-ike nka dịka Lieutenant General, kelere ndị Naịjirịa maka emume a.

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ na-agba ka ndị Igbo nwete Biafra, abụrụgo onye nwere onwe ya ọzọ. Nke a mere n’abalị iri abụọ n’ise nke ọnwa Eprelu afọ 2017. Onye ọkaịkpe bụ Binta Nyako ekpebigo ka A nara Nnamdi Kanu n’aka mbe site n’ịnwete mmadụ atọ ga-akwụ narị nde naịra, were gbara ya n’aka mbe.

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, agala ọgbakọ nke iri abụọ n’ abụọ (COP22) nke United Nations Framework Convention on Climate Change (UNFCCC)n’olu bekee, na Marrakech nke mba Moroko.

Buhari ga-esonyekwa na mmalite ọgbakọ ahụ. Ọ ga-enwe ohere ikwu okwu maka ala Naịjirịa itinye oke ya n’agha ahụ A na-ebu megide ekpom ọkụ yana mgbanwe ihu elu igwe.

Ụlọ nzukọ ome iwu mba Saụtụ Afrịka ga-arụrịta ụka n’ọnọdụ enweghị ntụkwasị obi n’onye isi ala mba ahụ bụ Jacob Zuma dịka oku A na-akpọ ka onye isi ala ahụ rịtuo n’ọchịchị na-abawanye.

Nnyocha nke otu ọrụ na-agba mpụ na aghụghọ ukwu wepụtara n’izu ụka gara aga na mba ahụ boro ebubo n’aka adịghị Maazị Zuma ọcha. Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị  African National Congress (ANC) na-achị mba Saụtụ Afrịka kọwara na amụma ahụ agaghị achịta aja.

Presidenti Muhammadu Buhari enyela ntụzi-aka ka E dunye ndị nnọchite anya ga-aga maka olili Lt. Col. Abu Ali, bụ onye ndị Boko Haram gburu n’ụbọchị Fraịdee na Steeti Borno.

N’okwu onye isi ala:

A kpachiela  mmadụ asatọ bụ ndị na-agba mbọ ihụ na ọchịchị onye kwuo uche ya kwụdosiri ike na mba  Kongo Demokratik. Nke a mere n’ụbọchi Nwenezdee gara aga, oge ha na-akwado ime ngaharị udo maka oge A na-egbu n’ime ntụliaka nke E ji ahọpụta onye isi ala.

Onye minista ala Naịjirịa na-ahụ maka mgbasa ozi na omenala, bụ Lai Mohammed, ekwugo na mbọ gọọmenti etiti na-agba iji wulitegharịa akunuba ala Naịjirịa agaghị amịta mkpụrụ ọbụla ma ọ bụrụ na E tinyeghị uchu n’ọgụ ahụ A na-alụso mpụ na aghụghọ.

Ndị agha mba Ijipt ekwuola na a hụrụ mpempe ụgbọ elu ahụ kpọkasịrị n’oshimiri Mediterenịan. Onye okwuchite ọnụ ndị agha mba Ijipt kwuru na a hụrụ mpempe ụgbọ elu ahụ na ngwongwo ndị mmadụ nọ n’ụgbọ elu ahụ na maịlị otu narị na iri asatọ na Alegzandrịa.

O pekata mpe, mmadụ 17 anwụọla n’obodo Mogadishu, isi ala mba Sọmalịa, mgbe ndị agha iyi egwu a na-akpọ Al Shabaab wakporo ndị na-enwere onwe ha aṅụrị n’ogige ụlọ oriri na nkwari a kpọrọ Beach View Café nke dị n’akụkụ mmriri Lido na Mogadishu.

Gọọmenti ala Naịjiria ekpebiena n’ọgụ ịkpa oke ahụ a na-abusa ndị mmadụ na mba Sautụ Afrịka bụ ịhe ọjọọ. Naịjiria kpọrọ gọọmenti Sautu Afrịka ka o mee ihe kwesiri ekwesi, gbaa mbọ hụ n’a kwụsịrị ọgụ ahụ a na-ebusa ndị ọbịa na mba ahụ.

O pekata mpe, mmadụ 147 anwụọna n’ụlọ akwụkwọ mahadum Garissa, ebe ndị otu al-Shabaab wakporo ndị mmadụ na Kenya. Nke a mere n’ụbọchị Tọzdee abalị abụọ nke ọnwa Eprel. Ndị otu al-Shabaab jiri egbe ogbu nnụ mmadụ ga n’ogige mahadum Garisa...

Simone Gbagbo, nwunye Laurent Gbagbo, aka chịburu mba Kotovua, ga-aga mkpọrọ afọ 20 maka ịhe ndị o mere dọrọ ọgụ ahụ e jiri gbuo ọtụtụ mmadụ na mba ahụ, mgbe e mechara ntụli aka ndọrọndọrọ ọchịchị na Kotovua n’afọ 2010. O tego aka a na-ekpe nwanyị ahụ ikpe maka ịkwado na ikpalite ọgba agha...

Anyị nụrụ na e gbuona mmadụ 10 ndị agha mba Chad ndị na-enyere ndị Naịjirịa aka n’ọgụ ahụ a na-alụ maka ịchụpụ ndị Boko Haram n’ugwu awụsa. Ọnụ na-ekwuru ndị agha mba Chad na mba Nije gwara ndị nta akụkọ Reuters n’ọ bụ ezi okwụ...

E kee mba Burundi ụzọ atọ, ụzọ abụọ bụ ndị ụka Katọlik. Ndị otu okpukperechi katọlik na Burundi ekwuona n’onye isi ala mba ahụ, bụ Pierre Nkurunziza, ekwesịghị ịlọghachị n’ọchịchị. Mba Burundi na-akwado ime ntụli aka maka ịhọpụta onye isi ala n’ọnwa Junu nke afọ a.

Cisse bụ Kaptin ndị otu bọọlụ mba Senegal mgbe otu ahụ mere ọfụma n’asọmụpi iko mba ụwa nke e mere n’afọ 2002. Cisse, onye nke dị afọ 38 ugbu a, ga-ewere ọkwa site n’aka nwoke onye mba Frans...

Onye ji aha ndị otu All Progressive Congress (APC) azọ ọkwa onye isi ala na Naịjiria, bụ Jenaral Muhammadu Buhari, akpọkuona ụmụ Afrịka niile ka ha na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya, n’ihi na nanị ọchịchị onye kwuo uche ya nwere...

Mba Togo enweputego ozi nke na-akọwa na ha ga-eme ntụli aka nke e ji ahọ onye isi ala n’abalị 15 nke ọnwa Eprel afọ 2015. Anyị nụrụ n’aka na-achị mba ahụ, bụ Faure Gnassingbe, ekpebigo iso azọ ọkwa na ntụli aka ahụ a na-akwado ime, na-agbanyeghị n’ọtụtụ ndị obodo ahụ achọghị ka ọ lọghachị n’ọchịchị.

Otu nwanyị onye ala Naịjiria na-agụ akwụkwọ n’ogo ọka mmụta abụrụla onye a na-eṅomi eṅomi maka agụm akwụkwọ mgbakọ na mwepụ na mba Sautu Afrịka. Ọkammụta Oghenetega Ighedo nke ala Naịjiria eturula ugo dịka nwanyị izizi nwetere nzere ọka mmụta PhD n’agụmagụ mgbakọ na mwepụ.

Ndị isi ọchịchị mba dị iche iche n’Afrịka na-eto ndị ọrụ nchekwa nke ala Naịjiria maka mbọ ha na-agba, ya na mkpụrụ ọma mbọ ha na-amịta n’ọgụ ahụ ha na-ebuso ndị Boko Haram n’ugwu awụsa. Mmeri a ndị agha na-enwete kemgbe abalị ole n’ole bụ mkpụrụ sitere na njikọ aka...

Nelson Mandela, onye ndị Afrịka niile ji eme ọnụ maka ịlụ nwere onwe anwụọla. Ọnwụ gburu ya taa n'obodo ya bụ Saụtụ Afrịka.

PROMO

learn 2001848 640

 

FREE PROFESSIONAL WEB DESIGN FOR 30 PEOPLE

Website Plaza is a Regina-based website designer serving in Saskatchewan since 2009.

We are here to provide real help to people, new (starting small) businesses, community associations, churches, small not-for-profit organizations to strengthen their presence and take advantage of the cyberspace and social media for their own growth.

If you need a professionally done website for FREE, contact us today (info@websiteplaza.net or 306-581-4493)!

SUPPORT THIS PROJECT

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



Ala Naịjirịa eweputego taa bụ Mọnde, abalị 29 nke ọnwa Mee, dịka ụbọchị ezum-ike ndị ọrụ maka mmemme ọchịchị onye kwuo uche ya. Ozi anyị nwe...

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by