A kpachiela  mmadụ asatọ bụ ndị na-agba mbọ ihụ na ọchịchị onye kwuo uche ya kwụdosiri ike na mba  Kongo Demokratik. Nke a mere n’ụbọchi Nwenezdee gara aga, oge ha na-akwado ime ngaharị udo maka oge A na-egbu n’ime ntụliaka nke E ji ahọpụta onye isi ala.

Onye isi ala mba Kongo,  Joseph Kabila, achịala yabụ mba kemgbe afọ puku abụọ n’out. Iwu mba ahụ gosiri na Ọ ga-arịtu n’ọnwa  December. Mana otu ndọrọ ndọrọ na-achị mba ahụ nakwa ụfọdụ ndị na-agba ya ụkwụ kwekoritara ka Ọ nọrọ n’ọkwa ruo n’ọnwa  April afọ puku abụọ n’iri na asatọ. Mgbe ahụ ka A ga-ahọpụta onye onye isi ala ọhụrụ.

A kpachiri mmadụ asatọ ndi ahụ so n’otu A kpọrọ Struggle for Change n’olu bekee, n’obodo Goma, oge ha na-akwado ịga nọrọ n’akụkụ isi ụlọ ọrụ mba ụwa.

Akụkọ kọrọ na ụfọdụ mmadụ ka A kpachiri na Goma n’ụbọchị Mọndee, oge ha na-eke akwụkwo ozi maka inwe ngagharị udo n’ụlọ akwụkwọ mahadum.  A kpachiri ndi ọzọ ebe ha gara ileta ha n’ụbọchị Tuzdee.

Ọnụ na- ekwuru ndị uweojii kwenyekwara na E mere yabụ mkpachi n’ụbọchị Nwenezdee, ma kwuo na ọ bụ maka inye ohaneze nsogbu.

Gọọmenti tọghapụrụ ọtụtụ ndị ahụ na-akpọ ganị ganị tinyekwara ndi otu LUCHA, n’ọnwa Julaị nakwa Ọgọst, iji hụ na E nwere mkparị ụka udo gbasara oge A ga-eme ntụliaka.

Support Our Projects

If you shop online, if you go through our website and buy your products from the AMAZON STORE, we will get a little commission. When it adds up, we will be able to continue to fund our free programs like the IGBO RADIO and IGBO CARTOON.

Buy Igbo Books

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya....

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

SUBSCRIBE TO NEWSLETTER

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by