Presidenti Muhammadu Buhari enyela ntụzi-aka ka E dunye ndị nnọchite anya ga-aga maka olili Lt. Col. Abu Ali, bụ onye ndị Boko Haram gburu n’ụbọchị Fraịdee na Steeti Borno.

N’okwu onye isi ala:

“Agwara m onye isi ndị agha ala anyị bụ Abba Kyari ka ọ bụrụ onye ndu ndị ga-aga nọchite anya m n’akwam ozu Lt Col Abu Ali nakwa ndị ọzọ E gburu ha na ya echi.”

Buhari kwukwere sị obi mapụrụ ya mgbe ya natara ozi maka ọnwụ ndi soja ahụ. Nwa amadị a bụ Lt. Col. Abu Ali bụ onye ndu pụrụ iche, nke nwere ugwu n’ebe ndị ọ na-achịkọta nọ.

Buhari gbakwụnere sị na:

“E nweghị ịhe A ga-eji akwụghachi ndị agha ndị a jiri ndu ha chụọ aja maka ala Naịjirịa.”

Onye isi ala kpọkuru nd agha ala any ka ha gharakwa ikwe ka dachi a mee ka mmụọ ha daa mba.

Support Our Projects

If you shop online, if you go through our website and buy your products from the AMAZON STORE, we will get a little commission. When it adds up, we will be able to continue to fund our free programs like the IGBO RADIO and IGBO CARTOON.

Buy Igbo Books

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya....

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

SUBSCRIBE TO NEWSLETTER

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by