Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, agala ọgbakọ nke iri abụọ n’ abụọ (COP22) nke United Nations Framework Convention on Climate Change (UNFCCC)n’olu bekee, na Marrakech nke mba Moroko.

Buhari ga-esonyekwa na mmalite ọgbakọ ahụ. Ọ ga-enwe ohere ikwu okwu maka ala Naịjirịa itinye oke ya n’agha ahụ A na-ebu megide ekpom ọkụ yana mgbanwe ihu elu igwe.

Onye ndụm ọdụ pụrụ iche nye onye isi ala n’ịhe gbasara ngbasa ọzi, Maazị Femi Adesina, kwuputere nke a:

Okwu onye isi ala ga-eleba karị anya n’ebe kachasị mkpa bụ  mgbanwe ihu elu igwe nke nwa bekee kpọrọ climate change na mbọ A na-agba ịhụ na E nweghị mgbanwe ihu eligwe.

Ndi ndụ ala Naịjirịa na-eti mkpu na-akwadọ mpaghara  Niger Delta, ebe kwesiri ka E hicha mmanụ  nakwa iti mkpu maka inwete mmepe n’ebe ahụ.

Femi gbakwụnyere na:

Prezidenti Buhari ga-ewere ohere a E nyere ya ikwu okwu  iji nwete nkwado mba ụwa maka ịdozi ala Ogoni na mpaghara Niger Delta nakwa ịdozi Lake Chad Basin.

Buhari ga-esonyekwara ọgbakọ ndị isi ala mba Afrịka marịa ụbụbọ gbasara mgbanwe ihu elu igwe.

Support Our Projects

If you shop online, if you go through our website and buy your products from the AMAZON STORE, we will get a little commission. When it adds up, we will be able to continue to fund our free programs like the IGBO RADIO and IGBO CARTOON.

Buy Igbo Books

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya....

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

SUBSCRIBE TO NEWSLETTER

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by