Puku kwuru puku ndị mmadụ pụtara n’okporo ụzọ na steeti dị iche iche na–eme ngagharị iwe gbasara mmeri Donald Trump nwetere na ntụli aka elu nhọpụta onye isi ala mba Amerịka.

Ọtụtụ n’ime ndị ahụ na–eme ngagharị iwe na-eti mkpu na-asi:

“Ọ bughị onyeisiala m”.

Otu nwanyị onye rụrụ Gọvanọ Chris Christie ọrụ dịka onye aka mbụ ya na Steeti New Jersey agwana ndị ọkaịkwe na Gọvanọ Christie mara ịhe banyere brijigeti.

Brijigeti bụ aha E jiri mara arụ ahụ mere n’obodo Fort Lee na New Jersey, site n’abalị 9 ruo abalị 13 nke ọnwa septemba afọ 2013. Ngalaba na-ahụ maka njem okporo ụzọ mechiri ọwara abụọ n’ime ọwara atọ si na akwa mmiri George Washington abata na Fort Lee. Nke a malitere n’isi ụtụtụ n’oge ndị mmadụ ji aga ebe dị ịche ịche.

Gere nu ajuju onu a Chidi Igwe gbara Okammuta Chika Okpalike, onye na-akuzi nkuzi na mahadum Nnamdi Azikiwe n'Awka.

Okammuta Oby Okonkwo na-aza anyi ajuju onu gbasara onodu umu nwanyi n'ala Igbo. Okonkwo na-akuzi nkuzi na mahadum Nnamdi Azikiwe di n'Awka. Okwu ya gbadoro ukwu n'otutu ihe e nwere ike ime ka onudu umu nwanyi na-adiwaga mma n'ala Igbo.

Okammuta Okey Ndibe na-ekwu ihe o choputara maka ilu Igbo.

Okammuta Okey Ndibe na-ekwu maka akwukwo o dere, Foreign Gods, Inc.

Nwa afọ mba Amerịka ahụ bizi na Rushịa kemgbe afọ 2013 maka ịgba ama megide otu CIA na-enwe nkwado ịlọghachi Amerịka. Onye ọkaikpe Snowden na Rushịa, Anatoly Kucherena, gwara ndị nta akụkọ na Snowden na ndị ọkaikpe si mba Amerịka na mba Jamini amalitego ịkpa ụbụbọ maka...

Aka na-achị mba Izrel, bụ Benjamin Netanyahu, adọọla mba Amerịka aka na ntị maka nzukọ mkparịta ụbụbọ ịkpe udo ahụ nke na-aga n’ihu ugbu a n’etiti mba ụwa na mba Iran. Mgbe ọ na-agwa ndị omebe iwu nke mba Amerịka okwu n’isi obodo mba Amerịka...

www.igboschool.org

Gọọmenti mba Canada ekwuela na o ge-enye otu puku ọgwụ e ji eme ntule ọgwụgwọ nje ọrịa ebola, iji nye aka gbochie ndapụta ọrịa na mpaghara ndịda anyanwụ Afrịka. O mere mkpebi a ka ụlọ ahụike mba ụwa bụ World Health Organisation...

Otu nwanyị olu ọma, onye Amerịka, a ma ama maka ịgụ egwu, bụ Whitney Houston, anwụọla. E butere ozu Whitney n’ime ụlọ oriri n’ọñụñụ Beverly Hilton.

Taa ka a na-achụ afọ. Taa bụ abalị mbụ nke ọnwa jenụwarị ka a na-achụ afọ n’ebe dị iche iche. E jiri ọkpụkpa ọkụ nọkaụtụ mara ịchụ afọ.

Onye isi ọchịchị mba Kanada, Steven Harper, ekwuona na Kanada adighị njikere iziga ndị agha na mba Mali, na-agbanyeghị na ndị Al-kaida juputeziri na Mali.

Ndị Nigeria bụ oji abalị eme ihe. Ha abụghị kwa oji abalị eje, ndị ekperima cha cha! Kama na ọ bụ mgbe ohere dapụtara ha iji gbo mkpa nke ha. Dịka agwa ndị e nwe enwe ha na-emechasị ihe ọga chọrọ, tupu ha nwee ohere ime ihe nke dị ha mkpa.

Onye isi ala mba Venezuela, Hugo Chavez, anwụọla. Ọ nwụrụ taa bụ Tuzdee. Ọ gbara nanị afọ 58 tupu ọnwụ egbuo ya.

 Ị mela were wetara anyị egwu Chief Stephen Osita Ọsadebe, ọ gụrụ maka Ome ife jide Ọfọ. Nke a na-akọwa n’asụsụ Igbo kajara akaja.

Mgbọ ogbunigwe awụnyego aja na garrị n’obodo Boston, na Steeti Massachusetts, na mba Amerịka. N’ụbọchị Mọndee, ụwa niile gbakọtara na Boston maka asọmụmpi ọsọ onye mere ike ya, nke a kpọrọ Boston marathon, n’olu bekee.

Chris Rogers gbara afọ 21. A mụrụ ya na St. Albert, na Alberta. Ọ na-aga akwụkwọ na mahadum University of Alberta.

Gịnị bụ nzuzu? Onye nzuzu na-akpa agwa dịka onye na-enweghị echiche ma ọlị. Onye nzuzu na-akpa agwa ka ụmụ aka. Onye nzuzu na-akpa agwa ka onye mmanya na-egbu. Onye nzuzu na-akpa agwa ka onye agwụ na-akpa.

Igidi ọgụ ahụ mmadụ abụọ ndị omekome ahụ tụrụ ogbunigwe na Boston na ndị ọrụ nchekwa na-agba kemgbe mkpụrụ abalị anọ abịago n’isi njedebe.

PROMO

learn 2001848 640

 

FREE PROFESSIONAL WEB DESIGN FOR 30 PEOPLE

Website Plaza is a Regina-based website designer serving in Saskatchewan since 2009.

We are here to provide real help to people, new (starting small) businesses, community associations, churches, small not-for-profit organizations to strengthen their presence and take advantage of the cyberspace and social media for their own growth.

If you need a professionally done website for FREE, contact us today (info@websiteplaza.net or 306-581-4493)!

SUPPORT THIS PROJECT

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



Ala Naịjirịa eweputego taa bụ Mọnde, abalị 29 nke ọnwa Mee, dịka ụbọchị ezum-ike ndị ọrụ maka mmemme ọchịchị onye kwuo uche ya. Ozi anyị nwe...

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by