Ndị mba Amerịka eduona Barack Husain Obama n’iyi-ọlụ maka ịmalite agba nke abụọ ọchịchị ya. Obama na-achị Amerika kemgbe afọ anọ. N’usoro akwụkwọ iwu mba ahụ, onye isi ala na-achị afọ anọ. Afọ anọ ahụ gafee, o nwere ike iso me ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ bụrụ n’o nwee mmeri, ọ ga-achị afọ anọ ọzọ. Nke a pụtara n’onye isi ala nwere ike ịchị nanị afọ asato na mba ahụ.

Barack Obama malitere agba nke mbụ ọchịchị ya n’ụdị oge a n’afọ 2009, ka o meriri ogbo ya bụ John McCain, onye jiri aha ndị Rịpọblikan zọ ọkwa onye isi ala n'afọ 2008.

Ka agba nke mbụ ọchịchị ya na-erute n’isi njedebe, Obama weputere onwe ya maka iji aha ndị otu Demokrat azọ ọkwa, n’ọnwa Nọvemba afọ 2012. Ndị otu Demokrat kwadosiri ya ike, na-agbanyeghị na ha emezichaghị ọnọdụ akụ n’ụba mba ahụ otu ha siburu chee.

Aka chịburu Steeti Massechussets, Mitt Romney, bụ onye ndị Rịpọblịkan họpụtara ka o cheere Obama aka mgba. Igbo sị na mbe na mbe pụta, e nwere nke bụ oke mbe. Barack Obama meriri Romney n’ụdị Romney na ndị Rịpọblịkan na-atụwaha anya, mgbe ndị Amerịka mere ntụli-aka ozuru ọha, n’abalị 6 nke ọnwa Nọvemba afọ 2012.

Taa bụ abalị 21 nke ọnwa Jenụwarị ka onye isi ulọ-ikpe ukwu nke mba Amerịka, John Robert (jr), duru Obama n’iyi-ọlụ. Ọ ga-achịgide Amerịka ruo na ngwụsị afọ 2016.

Chidi Igwe, Canada
Monday, 21 January 2013 00:00

 

 

 

Support Our Projects

If you shop online, if you go through our website and buy your products from the AMAZON STORE, we will get a little commission. When it adds up, we will be able to continue to fund our free programs like the IGBO RADIO and IGBO CARTOON.

Buy Igbo Books

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya....

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

SUBSCRIBE TO NEWSLETTER

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by