Mbediọgụ hụrụ mụ tata na-akọsara mụ ihe ya hụrụ na-agbagwoju ya anya. Mbediọgụ sị na  ya hụ ụmụ mmadụ na anụ ọhịa ka ha na-agba ọsọ ka a gasị na ha anaghị anwụ anwụ, ka ha na ezu ike, ya ajụa onwe ya sị ọ bụ gịnị na bụ nsogbu ha?

Na ya nakwa ajụ onwe ya ajụjụ sị:

Kedu mgbe anụmanụ ndị a na ụmụ mmadụ ga-ele ya anya were mụrụ akọ? Kedu ihe ya ga-emezị iji kụziere ha na nwayọ nwayọ bụ ije? Na ọ pụtara na ha enweghị echiche, ka ọ bụ na anya kpọrọ ha iji hụ na ya anaghị alụ ndụ mgbe ya na eje ije?

Ọ jụkwara mụ ma ọ bụ amaghị ihe na-eme ha? Ọ sị na ọ bụ na ha amaghị na ebe onye ọsọ ruru ka onye ije na-eru? Ọ jụrụ mụ ka ọ bụ na ha amaghị na o ji ọsọ agbakwu ọgụ amaghị na ọgụ bụ ọnwụ?

Ajụjụ ndị a tara akpụ. Ọ bụrụ na ị nwere asịsa ị nwere ịsa banyere ajụjụ ndị a, biko depute ha na ọgbakọ ụmụ Igbo bụ Igbo ka anyị gụa, were nwee ike zigara Mazị Mbediọgụ ozi, ka obi were zue ya ike.

Biko ka anyị leba anya na ndụmụọdụ Mazị Mbediọgụ, dịka o kwuru na ebe onye ọsọ ruru ka onye ije na kwa eru. Ka anyị were nụ ya ka egwu, maka na akụ fechasịa ọ dara awọ.

Abraham Madu, USA
Monday, 28 January 2013 00:00
Ekele diri ndi Ann's Running Commentary maka foto a.
 
 
 

PROMO

learn 2001848 640

 

FREE PROFESSIONAL WEB DESIGN FOR 30 PEOPLE

Website Plaza is a Regina-based website designer serving in Saskatchewan since 2009.

We are here to provide real help to people, new (starting small) businesses, community associations, churches, small not-for-profit organizations to strengthen their presence and take advantage of the cyberspace and social media for their own growth.

If you need a professionally done website for FREE, contact us today (info@websiteplaza.net or 306-581-4493)!

SUPPORT THIS PROJECT

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



Ozi anyị nwetere taa bụ ụbọchị ụka site na Steeti Imo na-ekwu na mmadụ anọ etufuona ndụ ha n’ịke, ebe mmadụ isii merụrụ ahụ. Nke a sitere n’...

Onye ndu nke ndi otu Indigenous People Of Biafra(IPOB) bụ maazị Nnamdị Kanụ ekwuona hoohaa n'ebe o doro anya, na igbu mmadụ esoghị na omenal...

Ndi otu na-eme ngagharị iwe ma na-akpọkwa oku ka onye isi ala bụ Muhammad Buharị chighata malite ọrụ ma ọ bụ gbaa alụkwaghị m, ekwuputana na...

More From: Afrika

Puku kwuru puku ndị mmadụ pụtara n’okporo ụzọ na steeti dị iche iche na–eme ngagharị iwe gbasara mmeri Donald Trump nwetere na ntụli aka elu...

Photo a si n'aka ndi politico.com

Otu nwanyị onye rụrụ Gọvanọ Chris Christie ọrụ dịka onye aka mbụ ya na Steeti New Jersey agwana ndị ọkaịkwe na Gọvanọ Christie mara ịhe bany...

Gere nu ajuju onu a Chidi Igwe gbara Okammuta Chika Okpalike, onye na-akuzi nkuzi na mahadum Nnamdi Azikiwe n'Awka.

Okammuta Oby Okonkwo na-aza anyi ajuju onu gbasara onodu umu nwanyi n'ala Igbo. Okonkwo na-akuzi nkuzi na mahadum Nnamdi Azikiwe di n'Awka...

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by