Ka mụ gwa gị nke bụ eziokwu. Maka na e meputazịrị egbe, dimkpa hụzịa onye ka ya, ọ ma ya ụra. Omenala ndị ọcha bụ omenaelu n’ala Igbo. Ndị a emebiela ụwa maka ngwa agha dị iche iche. Ogbu mma ga-alarịrị na nma. Ọgba egbe ga-alakwa na egbe.

Okwu a bụ okwu Igbo bụ eziokwu. Onye kpatara nkụ ahụhụ sị ka ngwere bịara ya ụgwụọ. Ndị a na-aga mba ndị ọzọ na agbarị obodo ha na agbanyeghị na ndịa bụkwa nụ ụmụ mmadụ ka hanwa.

Ihe ndị a ji tụara mba ọzọ ka a ga-ejikwa tụara ha. Mgbe mbụ ka Amerịka sị na osimiri chere ha azụ, na ọ dịghị onye ga akpatụ ha aka. Gịnị meziri ugbu a? Nkịta nazịkwa ata ọkpụkpụ a nyanyere ya n’olu.

E buru ozu onye ọzọ, ọ dị ka e bu ukwu nkụ. Mana o metụta gị n’ahụ, ị mara na ụgụrụ na atụ oyi. Ka anyị na-ekiri ndị a ndị ara sị na ha mara ihe nile. Ụwa dịrị mụ na gị na ụmụ Igbo nile mma!

Ọ bụrụ na Chineke echeghị obodo, na efu ka ndị nche na eche. Mmadụ abụghị Chukwu. Ndị ọcha abụghị Chineke. Agwọ na ihe o loro agbatọrọla, kpọm kwem!

Abaraham Madu, USA
Thursday, 17 January 2013 00:00
Ekele diri ndi World Guns maka foto a.
 
 

Support Our Projects

If you shop online, if you go through our website and buy your products from the AMAZON STORE, we will get a little commission. When it adds up, we will be able to continue to fund our free programs like the IGBO RADIO and IGBO CARTOON.

Buy Igbo Books

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya....

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

SUBSCRIBE TO NEWSLETTER

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by