Otu nwanyị onye rụrụ Gọvanọ Chris Christie ọrụ dịka onye aka mbụ ya na Steeti New Jersey agwana ndị ọkaịkwe na Gọvanọ Christie mara ịhe banyere brijigeti.

Brijigeti bụ aha E jiri mara arụ ahụ mere n’obodo Fort Lee na New Jersey, site n’abalị 9 ruo abalị 13 nke ọnwa septemba afọ 2013. Ngalaba na-ahụ maka njem okporo ụzọ mechiri ọwara abụọ n’ime ọwara atọ si na akwa mmiri George Washington abata na Fort Lee. Nke a malitere n’isi ụtụtụ n’oge ndị mmadụ ji aga ebe dị ịche ịche.

A na-ebo Gọvanọ Christie na ndị otu ya ebubo na ha mechiri okporo ụzọ ahụ na Fort Lee maka iji taa ndị obodo ahụ afụfụ n’ihi na onye meyọ Fort Lee bụ Mark Sokolich akwadoghị Chris Christie mgbe Ọ na-azọ ọkwa gọvanọ na New Jersey.

Kemgbe ahụ, ndị ọkacha mara na-eme nnyocha ka A mata ma aka Gọvanọ Christie ọ dịkwa ọcha, tumadị ebe Ọ bụ na ndị na-arụrụ ya ọrụ, Bill Baroni na David Weinstein, kwetere na ha mara ebe mmiri siri banye n’opi ụgbọgụrụ.

Ọ bụrụ na E mecha chọpụta n’aka Gọvanọ Christie adịghị ọcha, E nwere ike ịgba ya onwe ya akwụkwọ n’ụlọ ịkpe.

Support Our Projects

If you shop online, if you go through our website and buy your products from the AMAZON STORE, we will get a little commission. When it adds up, we will be able to continue to fund our free programs like the IGBO RADIO and IGBO CARTOON.

Buy Igbo Books

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya....

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

SUBSCRIBE TO NEWSLETTER

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by