Onye isi ala mba Amerịka, Barack Obama, ekwuputego usoro ọhụru a ga-esi na-ahụ maka ibu egbe na mba ahụ. O teela aka ụfọdụ ndị mba ahụ na-akpọ oku ka gọọmenti ha mee ihe gbasa usoro inwe na ibu egbe.

Mana ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị Rịpọblikan na-adụ azụ mgbe ọ bụna e welitere okwu a. Nke a bụ maka na ha achọghị imegide ndị otu a kpọrọ NRA, ndị na-adị enye otu Rịpọblikan ezigbote ego mgbe ọ bụna a na-azụ okwe ndọrọndọrọ ọchịchị.

N’atụmatụ usoro ọchịchị ahụ Obama gụpụtara taa, ọ chọrọ ka ndị Amerịka mee ihe ndị a na-esote:

  1. Ka iwu mee ka a na-enyocha ndị mmadụ ọfụma tupu e reshi ha egbe.
  2. Ka iwu mee ka ndị mmadụ ghara ina-enwezi ụdị egbe ndị ahụ a rụrụ maka ịlụ agha.
  3. Ka iwu Amerịka mee ka ndị mmadụ ghara ina-enwezi egbe nwere ike ịgbakarị mkpụrụ mgbọ 10 tupu a sụgharịa ya.
  4. Ka iwu mee ka a na-ata ndị mmadụ afụfụ ma ọ bụrụ n’aka kpata onye na-atụ mgbere ahịa egbe n’uzo na-ezighị ezi.

Ihe ndị Obama gụpụtara taa ọ chọrọ ka e mee buru ibu. Ọtụtụ ndị otu Demokrat kwenyere n’ihe Obama chọrọ ka e mee. Mana ndị Rịpọblikan na ndị otu NRA amalitegori iti mkpu megide Obama na atụmatụ ya.

Ọtụtụ ndị Amerịka malitere kwenyewe na e kwesiri ime ihe gbara ọkpụrụkpụ kemgbe otu nwoke buru egbe jee gbagbuo mmadụ 25 gụnyere ma ndị nkụzi ma ụmụ akwụkwọ n’otu ụlọ-akwụkwọ na Newtown. Tupu o mee nke a,  o buru ụzọ gbagbuo mama ya n’ụlọ ebe ha bi.

Chidi Igwe, Canada
Wednesday, 16 January 2013 00:00
Ekele diri ndi MSNBC maka foto a.
 
 
 
 

Support Our Projects

If you shop online, if you go through our website and buy your products from the AMAZON STORE, we will get a little commission. When it adds up, we will be able to continue to fund our free programs like the IGBO RADIO and IGBO CARTOON.

Buy Igbo Books

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya....

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

SUBSCRIBE TO NEWSLETTER

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by