Kedu ihe ị ma bụ eziokwu? Omenala Igbo bụ ofu n’ime ihe ndị bụ eziokwu. Ihe ndị ụfọdụ na-eme n’Ala Igbo ugbu a, abụghị omenala Igbo,cha cha! A jụa gị ebee ka ị sị na ihe a ị na-akọ na-eme? Ị sị na ọ na-eme n’Ala Igbo, kpọm kwem!

A mara na ọ bụ omenala Igbo! Ọtụtụ ihe ka omenala Igbo na-asọ ka ọ ghara ime n’ala Igbo. Omenala Igbo bụ ihe ụmụ Igbo kwere na ya. I lee ilu ụmụ Igbo, ị ga-ahụ na ọ dịghị ihe ha tụrụ n’ilu na-abụghị eziokwu ha hụrụ tupu ha kwe ya bụ eziokwu.

Dịka ihe ịma atụ:

Ikuku anaghị ama n’ọnya.

Akwụ anaghị acha n’ọdụ igu.

Ụkwa rue n’oge ya, ọda.

Onye nwụrụ anwụ anaghị eku ume.

Okirikiri ka a na-agba ukwu ose, a naghị arị ya elu.

Isi kota ebu ya ka ọ ga-agba.

Iyi anaghị eri ọba.

E lelịa nwa ite, ọ gbọnyụọ ọkụ.

Nwata anaghị ebu nna ya ụzọ amụta diọkpara.

Ilu Igbo nile bụ ka o si me. Omenala Igbo gbagidere mgbọrọgwụ n’eziokwu. Onye nwere ntị ya nụ!

Abraham Madu, USA
Wednesday, 16 January 2013 00:00
Ekele diri ndi MSNBC maka foto a.
 
 
 
 

PROMO

learn 2001848 640

 

FREE PROFESSIONAL WEB DESIGN FOR 30 PEOPLE

Website Plaza is a Regina-based website designer serving in Saskatchewan since 2009.

We are here to provide real help to people, new (starting small) businesses, community associations, churches, small not-for-profit organizations to strengthen their presence and take advantage of the cyberspace and social media for their own growth.

If you need a professionally done website for FREE, contact us today (info@websiteplaza.net or 306-581-4493)!

SUPPORT THIS PROJECT

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



Ala Naịjirịa eweputego taa bụ Mọnde, abalị 29 nke ọnwa Mee, dịka ụbọchị ezum-ike ndị ọrụ maka mmemme ọchịchị onye kwuo uche ya. Ozi anyị nwe...

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by