Nwaada Tsai Ing-wen, onye zọrọọkwa n’okpuru otu Democratic Progressive Party nwetere mmeri kpụọkụ n’ọnụ na ntụli aka e mere n’ọnwa JenuwarJanuarị.

Anyị na-anụ na ndị agha gọọmenti mba Irak amalitego ịlụsa ndị otu agha iyi egwu ahụ a na-akpọ ISIL n’aha achafụ ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ. N’ọnụ mmiri okwu onye Praịm Minista mba ahụ, “Taa, n’ike nke Chineke, anyị na-amalite ọgụ...

Ndị ọrụ nchekwa ekwuola na ha achọpụtago onye bụ nwoke onye otu ISIS ahụ a na-ahụ n’ihe onyonyo ndị otu agha iyi egwu ebe ọ na-afọnye ndị mmadụ mma n’olu. Nwoke ahụ a ma ama dịka Jihadi John, onye na-afụ onwe ya mmanwụ mgbe ọ bụna ọ pụtara n’ihe onyonyo maka igbu mmadụ, egbuona mmadụ ole n’ole ndị nta akụkọ.

Onye isi ọchịchị mba Maleshịa, Najib Razak, ekwuole na e nwere ịhe mere mmiri jiri baa n'opi ụgbọgụrụ. Ha achọpụtago na akpachapụrụ anya gbanyụọ akara ngwa mgba ama di n'ụgbo-elu Boeing 777 ndị mba Maleshia ahụ a na-achọ achọ kemgbe otu izu ụka.

Ọgụ ahụ na-aga n’ihu na mba Syria kemgbe ọnwa ole n’ole ebiri la ọkụ. Nke a malitere kemgbe abalị abụọ mba Amerịka malitere kwadowe ndị otu rebel ahụ na-ebuso gọọmenti Bashar Al-Assad agha.

Ozi anyị siri n’aka ndị MSNBC nwete n’akọwa na otu ụgbọelu bu ihe karịrị mmadụ 120 dara n’ihe mberede ụgbọelu na Pakistan.

A na-achọ puku kwuru puku ndị mmadụ achọ na Japan kemgbe mba ahụ nwere oke ala ọma jijiji nke ndị ọka mmụta tinyere na 8.9 n’ogo mgbakọ ala ọma jijiji n’ụbọchị Fraịdee.

Aka na-achị mba South Korịa, bụ Chung Hong-won e werena aka ya rituo n’ọchịchị. Nke a na-eme n’ihi otu ndị mmadụ siri na-akakpọ gọọmenti ya maka usoro ha siri kpa agwa gbasara ndị obodo ha ahụ nwụrụ n’ihe mberede ụgbọ mmiri. Mgbe ọ na-agwa ndị mba ahụ okwu, Chung Hong-won kwuru n’akwa ya na-ebere ezi n’ụlọ niile ndị ịhe mberede a metụtara anarago ya ụra n’anya.

Support Our Projects

If you shop online, if you go through our website and buy your products from the AMAZON STORE, we will get a little commission. When it adds up, we will be able to continue to fund our free programs like the IGBO RADIO and IGBO CARTOON.

Buy Igbo Books

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya....

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

SUBSCRIBE TO NEWSLETTER

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by