Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka ọnwụ Ibrahim Dasuki, onye jibu ọkwa dịka Sultan nke Sokoto nke iri n’asatọ.

N’okwu ọnụ na-ekwuchitere onye isi ala, Garba Shehu, kwuru, Prezidenti Buhari gakwara n’ihu kasie ndị otu Jama’atul Nasril Islam (JNI) na ndị Supreme Council nke Islamic Affairs obi maka ọnwụ ya.

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya.

N’okwu ya n’oge emume a nke ndị bịara ya gụnyere,gọvanọ Steeti Kwara, Maazị Abdulfatah Ahmed, ụfọdụ ndị ụlọ nzukọ omeiwu nke gọọmenti etiti, na ọnụ na-ekwuru ụlọ nzukọ Steeti Kwara, Dr Ali Ahmad. 

Osote onye isi ala bụ Yemi Osinbajo, ekuola n’Ọ ka mma ịkwado ọrụ ubi n’ime obodo karịa ịtụbata ngwa ahịa nke agaghị enye aka na mgbanwe ego.

Osinbajo mere ka A mata nke a mgbe Ọ nabatara ndị mba Rọshịa dunyere, nke onye ndu ha bụ onye minista ọrụ ugbo mba Rọshịa, Maazị Alexander Tkachev, bụkwa onye isi oche nke otu kọmishọn jikọrọ Naịjirịa na Rọshịa.

A rịọla gọọmenti ala Naịjirịa ka O leba anya na nsogbu enweghị ndị ọrụ ahụ ike na-eji nnwa n’ụlọ ọgwụ ndị ahụ gọọmenti nwe, iji si etu ahụ kwalite ọnọdụ ahụ ike.

Otu jikọrọ ndị ọrụ ahụ ike na-eji nnwa n’ala Naịjirịa kpọrọ oku a n’ụbọchị Tuzdee n’ọgbakọ ha nwere n’Oshogbo, isi obodo Steeti Osun.

Ndị agha ụgbọelu ala Naịjirịa ekwuola na ha ga-ewube isi ụlọ ọrụ ha na Steeti Katsina, iji buo agha megide ịhe ịche aka mgba nke ọrụ nchekwa na mpaghara North East nke mgbago ugwu ala Naịjirịa.

Onye isi ndị agha ụgbọelu ala Naịjirịa, bụ  Air Marshall Sadiq Abubakar, mere ka nke a pụta ịhe oge ọ gbapere egwuregwu ndị agha ụgbọelu agba nke asatọ ya na Steeti Katsina.

A ga-ewube isi ụlọ ọrụ ndị agha ahụ na Katsina nakwa Daura, ebe ha nwetagoro obosara ala maka ya bụ ọrụ n’obodo abụọ ahụ.

Onye chịburu ala Naijiria n’oge gara aga, bụ Olusegun Obasanjo, ekwuputego mkpa Ọ dị na njikọta aka ọnụ n’ịtụ mgbere ahịa ha na mba Afrịka ndị ọzọ. Nke a ga-eme ka A chụpụ ọnọdu afụfụ na ụbịam.

Ụdịrị mmekọ a ga-adi ire site n’ihibe okporo ụgbọ mmiri ga na-akwado azụmahịa kwa mgbe kwa mgbe.

Obasanjo kwụpụtara nke a n’ọgbakọ nkwalite mmepụta akara ngwa ọrụ na azụmahịa agba nke asatọ, n’isi steeti Ogun bụ Abekokuta.

Onye isi ụlọ-ọrụ n’ahụ maka ibu agha megide mpụ na aghụghọ bụ EFCC n’aha ịchafụ, ekwuola sin a, n’enweghị ịsọ anya ọbụna, ụlọ ọru ya na-agba mbọ ibu agha megide nrụrụ aka. O kwuru nke a mbe O jere n’isi ụlọ ọrụ na-ahu maka mmepụta akwa na ngwa E ji akwa ya nke A kpọrọ [NUTGTWN] n’aha nkpirisi na Kaduna.

Magu gara n’ihu kwuo na onye isi ala bụ Muhammadu Buhari nyere ha ikikere inyocha nwafọ ọbụla n’agbanyeghị otu ndọrọ ndọrọ, iji hụ na E meriri mpụ na arụrụala.

Gọọmenti ala Naịjirịa ekwuola na Ọ na–agba mbọ niile O nwere ike maka ịdọta ndị oji ego achụ ego n’ala Naịjirịa.

Onye minisita ala Naịjirịa na–ahụ maka Naịjirịa ọrụ ugbo na mmepe ime ime obodo bụ Maazị Audu Ogbeh kwuputara nke a mgbe Ọ gwara ndị nta akụkọ okwu gbasara ọgbakọ ya na ndị oji ego achụ ego si mba Jamini nwere.

O pekata mpe, mmadụ 48 anwụọla na Gandu, nke dị n’okpuru ọchịchị Sokoto North na Steeti Sokoto.

Ozi anyị nwetere site n’aka ndị Punch na-akọwa na ndị EFCC akpachiela Fani Kayode, onye rụburu ala Naịjirịa ọrụ dịka onye Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu.

Ndị agha ala Naịjirịaazọpụtago nwata nwanyị Chibok ọzọ n’ime ụmụnwanyị karịrịnarị abụọ ndị Boko Haram tọọrọ n’obodo Chibok dị na Steeti Bọrọnu n’ọnwa Eprel afọ puku abụọ na iri na anọ.

Onye ala Naịjirịa ụwa jiri egwu bọọlụ ụkwụ mara, bụ Daniel Amokachi, enwetego ọrụ dịka onye ọzụzụ otu egwuregwu bọọlụ a kpọrọ JS Hercules nke mba Finland. Amokachi kwesịrị ịmalite ọrụ dịka onye isi otu bọọlụ ahụ na-atụfughị oge.

N’ụbọchị sọnde, abalị 4 nke ọnwa ọkụtoba, onye isi ala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari mere njem ilete ndị ahụ merụrụ ahụ mgbe ahụ ndị Boko Haram tụrụ ogbuniigwe na Nyanya yana Kuje. Buhari jere na ngalaba ụlọ ọgwụ ala Naịjirịa ebe a na-agwọ ndị ịhe ike mere, bụ nke a kpọrọ Trauma Centre of the National Hospital na bekee maka ilete ndị ahụ ịhe mberede metụtara na Nyanya yana Kuje.

Ka o mechara izu ụka atọ Goodluck Jonathan nyefere ọchịchị n’aka Muhammadu Buhari, onye isi ala ọhụrụ nke ala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari akwabatago n’obi ọchịchị ala Naịjiria dị n’Abuja.

Ndị agha nke ala Naịjirịa enyefeela ụmụ ntakịrị na ụmụ nwanyị dị mmadụ 275 n’ọnụ ọgụ n’aka ndị ụlọ ọrụ NEMA. NEMA pụtara National Emergency Management Agency na bekee. A na-akpọ ha ngalaba n’ahụ maka mgbata ọsọ enyem aka n’olu Igbo. Ndị ahụ ndị amị nyefere n’aka ndị NEMA bụ ụmụ aka na ụmụ nwanyị ndị ahụ ndị agha ala Naịjirịa zọpụtara n’ọhịa Sambisa site n’aka ndị otu agha iyi egwu, Boko Haram.

Ndị Igbo,

Lee nụ okwu onye isi ala ọhụrụ bụ Mụhammadu Bụharị gwara ndị Naịjirịa n’oge mmemme Goodluck Jonathan jiri nyefe ọchịchị ala Naịjiria n’aka Bụhari n’abalị 29 nke ọnwa Mee afọ 2015. 

Akuko ndi Voice of Nigeria nke abali 18 nke onwa Eprel afo 2015.

Otu jikọtara mba ụwa akpọkuona Muhammadu Buhari, onye ga-ewere oche dịka onye isi ala Naịjirịa na nwa mgbe nta, ka ọ ghara ịda mba, kama ka ọ gbadosie ụkwụ ike na mmeri ahụ ndị agha ala Naịjirịa na-enwete ugbu a megide ndị Boko Haram n’ugwu awụsa.

Ọtụtụ ndị Naịjirịa ndị tozuru etozu maka isonye na ntụli aka nke afọ a, amalitego ibinye aka n’akwụkwọ n’ebe dị ịche ịche. Taata bụ Satọdee, abalị 28 nke ọnwa Maachị afọ 2015 ka a na-eme ntụli aka ozuru ọha maka ịhọpụta onye isi ala, yana ndị omebe iwu.

Ndị agha nke ala Naịjirịa ekwuputego na ha ewegharago obodo Gwoza site n’aka ndị otu agha iyi egwu, Boko Haram. N’ozi ha siri na Twitter wepute n’ụtụtụ taata bụ Fraịdee, ndị agha Naịjirịa anagharago ndị Boko Haram obodo Gwoza, ebe ndị otu a jiburu mere isi ọchịchị ha n’ugwu awụsa.

Support Our Projects

If you shop online, if you go through our website and buy your products from the AMAZON STORE, we will get a little commission. When it adds up, we will be able to continue to fund our free programs like the IGBO RADIO and IGBO CARTOON.

Buy Igbo Books

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya....

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

SUBSCRIBE TO NEWSLETTER

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by