Ndị omebe iwu nke ala Nigeria eweputego akwụkwọ iwu ọhụrụ, nke megidere itụ mgbere mmadụ. Ndị otu Nigerian Federal Executive Council enyego nnakwe ha, sị na onye ọ bụna e jidoro ebe ọ na-ada iwu ọhụrụ a megidere ire ma ọ bụ ịzụ mmadụ n’ụdị ọ bụna, ga-aga mkpọrọ afọ asaa.

Ka ndị otu a nwechara nzụkọ ha n’Abuja, n’ụbọchị Nwenezdee, onye minista na-ahụ maka mgbasa ozi, Mazị Labaran Maku, kwuru nke a na bekee:

the Attorney-General of the Federation and Minister of Justice, Mohammed Bello Adoke, tabled a memorandum before the Council to seek approval for the Trafficking in Persons (Prohibition), Enforcement and Administration Bill, 2012.”

Mazị Maku kwuru n’ala Nigeria nweburu iwu megidere ịtụ mgbere mmadụ, mana iwu a nwere ebe ole n’ole o riri mperi. Ihe a na-ame ugbu a bụ ime ka iwu a kwụdosie ike. Ha anabatago mkpọrọ afọ asaa maka onye ọ bụna dara iwu a.

Mazị Maku gbakwụnyere na a ga-enyefe akwụkwọ iwu a n’aka ndị ụlọ omebe iwu na nso a, maka ime ka ọ diwazie ire dịka iwu na-achị ala Nigeria.

Chidi Igwe, Canada
Thursday, 17 January 2013 00:00
Ekele diri ndi Voice of Nigeria maka foto a.

 

PROMO

learn 2001848 640

 

FREE PROFESSIONAL WEB DESIGN FOR 30 PEOPLE

Website Plaza is a Regina-based website designer serving in Saskatchewan since 2009.

We are here to provide real help to people, new (starting small) businesses, community associations, churches, small not-for-profit organizations to strengthen their presence and take advantage of the cyberspace and social media for their own growth.

If you need a professionally done website for FREE, contact us today (info@websiteplaza.net or 306-581-4493)!

SUPPORT THIS PROJECT

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



Ala Naịjirịa eweputego taa bụ Mọnde, abalị 29 nke ọnwa Mee, dịka ụbọchị ezum-ike ndị ọrụ maka mmemme ọchịchị onye kwuo uche ya. Ozi anyị nwe...

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by