Gọọmenti ala Naịjirịa ekwuola na Ọ na–agba mbọ niile O nwere ike maka ịdọta ndị oji ego achụ ego n’ala Naịjirịa.

Onye minisita ala Naịjirịa na–ahụ maka Naịjirịa ọrụ ugbo na mmepe ime ime obodo bụ Maazị Audu Ogbeh kwuputara nke a mgbe Ọ gwara ndị nta akụkọ okwu gbasara ọgbakọ ya na ndị oji ego achụ ego si mba Jamini nwere.

O kwuru na ndị oji ego achụ ego nwere mmasị ịbata ala Naịjirịa na-enwe obi ịlọ mmiri gbasara ọnọdụ nchekwa E nwere na Naịjirịa, kaosinadị onye minisita a kwere ha nkwa na gọọmenti dị njikere ịchekwa ndụ na akụnụba ndị niile bi na Naịjirịa

Maazị Ogbeh kwukwara na ụlọ ọrụ ya na-ehibe atụmatụ iwu nke ga–eme ka ya na ụlọ ọrụ na-ahụ maka ịhe na-eme n’ala Naịjirịa jikọọ aka ọnụ iji chekwawa ndị na-etinye ego na ngalaba azụmahịa.

Ọ kọwapụtakwara ịhe ndị ha kpatara na nzukọ ya na ụlọ ọrụ A kpọrọ Food and Agriculture Organisation n’olu bekee n’obodo Rome nke mba Italy.

O mere ka A mata na E hiwere yabụ ọgbakọ iji lebaa anya n’okwu metụtara ọnọdụ mbawanye n’ọnụ ọgụ ndị mmadụ nakwa nchekwa ihe oriri.

Onye minista a gwara ndị nta akụkọ ka ha sonye n’ịgbasara ọha na eze ozi iji kọwatara ha mkpa Ọ dị ịhụ na ndị mmadụ na-eri erimeri ndị ahụ nwere ịhe ahụ ha chọrọ.

Support Our Projects

If you shop online, if you go through our website and buy your products from the AMAZON STORE, we will get a little commission. When it adds up, we will be able to continue to fund our free programs like the IGBO RADIO and IGBO CARTOON.

Buy Igbo Books

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya....

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

SUBSCRIBE TO NEWSLETTER

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by