Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka ọnwụ Ibrahim Dasuki, onye jibu ọkwa dịka Sultan nke Sokoto nke iri n’asatọ.

N’okwu ọnụ na-ekwuchitere onye isi ala, Garba Shehu, kwuru, Prezidenti Buhari gakwara n’ihu kasie ndị otu Jama’atul Nasril Islam (JNI) na ndị Supreme Council nke Islamic Affairs obi maka ọnwụ ya.

O kwuru na Sultan nyere ndụ ya n’oge o kwesiri inọ n’oche ọchịchị iji kwalite udo na ịdị n’otu nke mpaghara dị ịche ịche n’ala Naịjirịa.

O kwukwara na:

Prezidenti esonyerela ndị na-eru uju maka ọnwụ otu onye n’ime ọnụ na-ekwuru ala Naịjirịa maka udo na ịdị n’otu.

Onye isi ala bụ Buhari kwenyere na Ibrahim Dasuki, onye nwụrụ n’ụbọchị  Mọnde, na-agbata afọ iri itoolu n’atọ, bụ onye A ga na-echeta maka mbọ ọ gbara ịhụ na E kewapụtara ọtụtụ okpuru ọchịchị  local gọọmenti n’ala Naịjirịa.”

Prezidenti Buhari kpere ekpere ka Chineke kasie ezi n’ụlọ a obi ma nye mkpụrụ obi nwa amadị a nwụrụ anwụ ezum ike maka ezi ọrụ ya.

Support Our Projects

If you shop online, if you go through our website and buy your products from the AMAZON STORE, we will get a little commission. When it adds up, we will be able to continue to fund our free programs like the IGBO RADIO and IGBO CARTOON.

Buy Igbo Books

Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ n...

Onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, ekwupụtala ka ọdị ya n’obi n’ọzi mgbaru nye ezin’ụlọ Dasuki,gọọmenti nandịSteeti  Sokoto niile maka...

Onye isi ụlọ nzụkọ sinet, Bukola Saraki, ewubego amụma O ji enyere ndị ntorobịa aka, ma kwe nkwa ịnye mmadụ puku iri anọ ọrụ na nke onwe ya....

More From: Afrika Nigeria

GERE EKWE NTI

GERE AKUKO UWA

SUBSCRIBE TO NEWSLETTER

UNESCO SAYS THAT IGBO WILL GO EXTINCT. WE SAY NO.



News in Igbo Language. All Rights Reserved. Designed & Powered by