A Dụọla Ndị Anambra Ka Ha Na-Ewelataru Akụnụba Ha Ụlọ

Sep 13, 2021 - 23:21
 0
A Dụọla Ndị Anambra Ka Ha Na-Ewelataru Akụnụba Ha Ụlọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ na-abụ akụ ruo ụlọ a mara onye kpara ya; maka na ọ na-adị mma mbazụ gwute ọgwụ, ọ laa azụ.

Ka ọ dị taa, a kọwaala mkpa ọ dị na onye ọbụla bụ nwaafo steeti Anambra bi na mpaghara ebe dị iche iche n'ala Nigeria nakwa mba ofesi ga na-erube isi nye ọkpụkpọ oku Akụ Ruo Ụlọ ahụ gọọmenti steeti ahụ na-akpọ, site n'ịdị na-ewelataru àkụ ya ụlọ.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ bụ ya kpọnwòrò òkù a ọzọ n'okwu ya na mmemme ịgbape ụlọ nkwariakụ 'CM Comfort Hotel And Suites' dị n'Awkụzụ, n'okpuruọchịchị ime obodo Oyi, na steeti ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ oge ọ na-agbape ụlọ nkwariakụ, nke ọ bụ Komishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, bụ Maazị Michael Okonkwo nọ̀chìrì anya ya, mere ka a mara na ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ ewetela ezi nchekwa bụ ịgbà, ma mekwa ka ọnọdụ dị larịị maka ndị ji ego achụ ego, ya na iji mee ka azụmahịa na ọrụ na-agawanye n'ihu n'ime steeti ahụ. O kèlèkwàrà onye rụrụ ụlọ nkwariakụ ahụ, bụ Maazị Chinedu Egbunna maka iwèlàtàrù àkụnụba ya ụlọ wee rụọ ya bụ agadaga ụlọ nkwariakụ, ma gbaa akaebe na nke ahụ ga-adọnyere ọchịchị ya ukwu n'ọrụ mmepe ahụ ọ na-arụ na steeti ahụ ma nyekwa aka n'ikewàpụtara ndị ntorobịa steeti ahụ ohere ọrụ.

Ya bụ Gọvanọ jizịrị ohere ahụ wee kpọkuo ma dụọ ndị Anambra ka ha ñòmie ya bụ ihe Maazị Egbuna mere, site n'iwèlàtàru akụnụba ha ụlọ, iji nye aka kwàlite ọnụego na-abàta n'àkpà gọọmenti steeti ahụ, bụkwa nke ga-enyere gọọmenti aka n'ọrụ mmepe ya n'ime steeti ahụ.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka azụmahịa, ụlọ mmepụta ngwaahịa na nkewàpụta akụnụba na steeti ahụ, bụ Maazị Uchenna Okafor kèlèrè Gọvanọ Obianọ maka inwòghàrị ngalaba dị icheiche na steeti ahụ na ịkwàlite ọnọdụ obibindụ ụmụafọ steeti ahụ, ma gbazie akaebe na ụlọ nkwariakụ ọhụrụ ahụ ga-enye aka n'ime ka ọtụtụ ndị ntorobịa nwee ọrụ.

Ọ gwakwa Ndị Anambra ka ha ñomie nke ahụ ma sikwa n'ụzọ dị etu ahụ, nyere gọọmenti aka n'ọrụ, ma tụnyekwa ụtụ nke ha na mmepe obodo, n'ihi na nke ahụ abụghị ihe e kwesiri ịhapụrụ naanị gọọmenti ka o mee, ọkachasị dịka o siri metụta ikewàpụta ohere ọrụ.

Na mbụ n'okwu ya, onye nwe ya bụ ụlọ nkwariakụ, bụ Maazị Chinedu Egbuna kwuru na ebumnobi o jiri bịa rụọ ihe ahụ n'ime steeti ahụ bụ iji gbaso ma zakwa ọkpụkpọoku Akụ Ruo Ụlọ ahụ Gọvanọ Obianọ na-akpọ Ndị Anambra ka ha welataruo akụnụba ha ụlọ.

Ọ kpọpụtasịrị uru dị icheiche nke ahụ ga-ewèta, ma kpọkuzie ọhaneze ka ha bịa na-atụnyere ụlọ nkwariakụ ahụ, na-agbakwa ya aka ahịa, ọbụladị dịka o mere ka a mara na ya bụ ụlọ nkwariakụ nwèrè akụrụngwa ihe dị icheiche a na-ahụta n'ụlọ nkwariakụ ọgbaraọhụrụ nà ndị ọrụ ma nke ekwe na-akụ n'ọrụ ahụ.

Ụfọdụ ndị ukwu ndị ukwu sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè onyeisi ọrụ oyibo na steeti Anambra, bụ Ọkammụta Harry Uduh; Kọmishọna na-ahụ maka ihe na-eme na mba ofesi, omenala na njem nlegharịanya, bụ Dọkịta Kenneth Anierobi, onyeisi ụlọọrụ Chinmark Groups, bụ Injinia Marksman Ijiomah, tinyere ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484