A Dụọla Ndị Ji Otu Ahọ Efe Ala Nna Ha Ka Ha Mụọ Ọrụ Aka Dị Iche Iche

Dec 5, 2019 - 20:15
Jan 24, 2021 - 03:47
 0
A Dụọla Ndị Ji Otu Ahọ Efe Ala Nna Ha Ka Ha Mụọ Ọrụ Aka Dị Iche Iche

Izunna Okafor, Awka

A kpọkuola ma dụọ ndị ji otu ahọ efe ala nna ha ka ha were òhèrè ahụ mụọ ka e si arụ ụfọdụ ọrụ aka dị iche iche, iji nwee ike ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha na ndị na-ekewàpụta ọrụ, ma mgbe ha na efe àla nna ha, ma mgbe ha fèchàrà.

Oku a bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, n'okwu ya oge ọ gara ịnabata na idu n'iyi ọrụ, ndị àgbà Ch nke abụọ (Batch C, stream 2) nke ndị ahụ e zitere ịnọ n'ime steeti ahụ wee fèé àlà nna ha, bụkwa ndị nọ ugbu a anara ọzụzụ n'ogige ụlọikwuu ọkpụtọrọkpụ ọhụụ ahụ a rụrụ maka nke ahụ, n'Ụmụawụlụ/ Mbaukwu dị n'okpuru ọchịchị Awka South.

Gọvanọ Obianọ, nke ọ bụ onyeisi ọrụ oyibo na steeti ahụ, bụ Ọkaiwu Harry Uduh nọchitere anya ya chètààra ndị ahụ mkpa ọ dị na onye ọbụla n'ime ha mụtàra ọrụ aka dị iche iche n'ihi na oge agaala mgbe mmadụ na-echekwube maọbụ tụkwàsị uche ya n'ọrụ oyibo. Ọ dụrụ ha ka ha bụrụ ezi ndị ntorobịa, ma kwekwazie ha nkwà na ọchịchị steeti ahụ ga-aga n'ihu ịhụ na e nwère ezi ọnọdụ dị larịị maka ọmụmụ ọrụ aka ha na ije ozi ha, ogologo oge niile ha ga-anọ na steeti ahụ.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisi NYSC na steeti ahụ, bụ Maazị Kehinde Aremu kọwara na oge inye ọzụzụ ahụ gà-ewè mkpụrụ izuụka atọ, bụ oge a na-eji kọwaara ndị ahụ bịara ife ala nna ha ihe dị iche iche ha kwesiri ịma banyere amụmà NYSC, otu ha ga-esi gaa ozi ha nakwa otu ha na ndị obodo e zigara ha ga-esi na-emekọrịta.

O mere ka a mara na ọ bụ mmadụ dị otu puku, na iri ise na otu (1051) ka e zitere na steeti ahụ n'agba nke a, ma kelekwazie gọọmenti steeti Anambra maka ezi nkwàdo ya nye amụma NYSC na steeti Anambra, ọbụnadị dịka ọ kpọkùkwàra ndị ahụ e zitere ọhụụ ka ha dị uchu n'ihe dị iche iche a ga-akụziri ha n'oge ọzụzụ izuụka atọ ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.