A Dụọla Ndị Nne na Nna Ka Ha Na-Elekọta Ụmụ Ha Anya Nke Ọma

Oct 9, 2021 - 21:38
 0
A Dụọla Ndị Nne na Nna Ka Ha Na-Elekọta Ụmụ Ha Anya Nke Ọma

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kọwaala mkpa ọ dị ka ndị nne na nna na-eleru ụmụ ha anya, ọkachasị ndị nọ n'ụlọakwụkwọ dị elu, iji mara mgbe ha jehièbèrè, ma gbaziere ha ụzọ.

Ashbishọọpụ Ụka Angịlịkan Na Mpaghara Niger ma bụrụkwa Bishọọpụ Ụka Angịlịkan na Dayọsiisi Awka, bụ Ashbishọọpụ  Alexander Ibezim bụ ya kpọrọ òkù a n'okwu ya na mmemme ngụcha akwụkwọ nke ụfọdụ ụmụakwụkwọ 'Saint Paul’s University Secondary School, Nibo-Nise' nke ahọ 2021, bụkwa nke a nọrọ na ya wee kàárá ndị ahụ gụchara akwụkwọ ụka ịsị ha gaa nke ọma, tụọ mmamma ma nyekwa onyinye nkwanyeùgwù nyegara ụmụakwụkwọ ndị kwesiri ekwesi.

Mmemme ahụ dọtara ndị nne na nna, ndị ụka, ndị nne na nna, ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ ahụ, na ndị sitere ebe ndị ọzọ dị icheiche, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya waa achịcha bekee, mekwa ọtụtụ ihe ngosi dị icheiche site n'aka ụmụakwụkwọ ahụ gụchara akwụkwọ.

N'okwu ọ gwara ụmụakwụkwọ ahụ, Ashbishọọpụ Ibezim gwara ha ka ha bụrụ ezi ndị nnọchianya Kraịst nà ụlọakwụkwọ ahụ n'ebe ọbụla ha hụtara onwe ha; ma dụkwa ha ọdụ ka ha ghara ịgharịpụ ndị nne na nna ha, ụlọakwụkwọ ha, obodo ha, ụlọụka, na ndị nkụzi ha.

O gwakwara ha ka ha kewàpụ onwe ha pụọ n'ihe ọbụla bụ njọ, ọkachasị akwamiko na njọ nke anụ ahụ ndị ọzọ, ya na ihe ndị ọzọ nwere ike ibibì mmekọrịta ha na Chineke, n'ihi ọtụtụ ihe ọjọọ dị icheiche si na nke ahụ apụta.

Onyendu ụka Angịlịkan ahụ jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo ma dụọ ndị nne na nna ka ha na-etinye anya n'ebe ụmụ ha nọ, ya na ndị ha na ha na-emekọ ihe.

Na mbụ n'okwu nke ya, odeakwụkwọ Sinọọdụ na Dayọsiisi ahụ, bụ Venerebụụl Clement Mgbemena gwara ụmụakwụkwọ ahụ ka ha bụrụ ihè na nnú nke n'ụwa, tinye ihe dị icheiche ha mụtàrà n'ụlọakwụkwọ ahụ n'ọrụ, iji baara onwe ha uru. Ọ gwakwara ụmụakwụkwọ ahụ ka ha bụrụ ndị na-agbasi mbọ ike, ma gharakwa ịgbaso maọbụ tinye aka n'ụzọ ọ chaa achaa gbute, ọ chaghị acha gbute, bụkwa ụzọ ịba ọgaranya ego mbute n'agbaghị mbọ.

N'ozi ọ gụpụtara n'ebe ahụ, onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, bụ Ụkọchukwu Joseph Onyibo kpọpụtasịrị ihe dị icheiche dara ụda ụlọakwụkwọ ahụ na ụmụakwụkwọ ha mepọtagoro na nsonso a, ma kelee Ashbishọọpụ Ibezim, ndị nlekọta ụlọakwụkwọ ahụ, otu jikọtara ndị gụchara akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ahụ, ndị nne na nna, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị nyegoro aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, iji hụ na ụlọakwụkwọ ahụ na-agawanye n'ihu.

Ụfọdụ n'ime ụmụakwụkwọ ahụ gụchara akwụkwọ n'ebe ahụ, nke gụnyere Chikamso Nwachukwu na Chidinma Odoh kelere ndị nkụzi ha, ndị nne na nna ha, ụlọakwụkwọ ha maka ezi nkwàdo ha na ezi mkpụrụ ha kụnyere n'ime ha, ma kwe nkwà ịbụ ezi ndị nnọchianya ụlọakwụkwọ ha. 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484