A Ga-Agbape Àkwà Mmiri Niger Nke Abụọ n'Ọnwa Febụwarị —Moghalu

Jun 14, 2021 - 20:36
Jun 14, 2021 - 20:42
 0
A Ga-Agbape Àkwà Mmiri Niger Nke Abụọ n'Ọnwa Febụwarị —Moghalu

Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọọmenti etiti ala Nigeria emeela ka a mara na a ga-arụcha ma gbapee àkwà mmiri Niger nke abụọ (bụ "Second Niger Bridge") a na-arụ na steeti Anambra n'ime ọnwa Febụwarị ahọ na-abịa abịa.

Nke a bụ nke e kwupụtara site n'ọnụ onyeisi ụlọọrụ 'National Inland Waterways Agency (NIWA) bụ Maazị George Moghalu, n'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ na nsonso a banyere nke ahụ, bụ nke o sitekwara na ya wee kọwaa na ọrụ na-aga n'ihu n'ebe ahụ kemgbe a malitere ya.

Ọ kpọpụtàsịrị uru dị iche iche àkwà mmiri ahụ gà-eweta na mpaghara ahụ nà etu ọ ga-esi wèta mmepe mà kwalitekwa ọnọdụ akụnụba ala mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria ma a rụchaa ya; ọbụladị dịka o gosipụtàkwàrà afọ ojuju ya banyere etu ya bụ ọrụ si aga nà ogoogo e ji arụ ya.

Dịka ọ na-ekele onyeisiala bụ Muhammadu Buhari maka ọmarịcha ọrụ mmepe dị iche iche ọ na-arụ na mpaghara ala Igbo na mpaghara ebe ndị ọzọ dị iche iche n'ala Nigeria kemgbe ọ batara n'ọkwa ọchịchị, Moghalu kwèrè ya nkwà na Ndị Igbo ga-aga n'ihu inye ọchịchị ya nkwàdo zuru òkè.

Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ọrụ dị iche iche Buharị rụgoro na ihe o megooro Ndị Igbo kemgbe ọ bàtàrà n'ọkwa ọchịchị, ma kwukwa na ya bụ onyeisiala agbapeela atụmatụ ọrụ ịrụ okporoigwe maka ụgbọoloko na Port Harcourt nke steeti Rivers, bụ nke o mere na nsonso a, ma bụrụkwa nke ga-esi na mpaghara steeti niile dị n'ala Igbo wee gaa ma a rụchaa ya.

O jikwàzịrị ohere ahụ wee kpọkuo ndị obodo dị iche iche ka ha na-echekwa ma na-elekọta ihe dị iche iche gọọmenti rụrụ na mpaghara aha, ọbụladị dịka ọ katọrọ etu ndị omekoome sizị awakpògasị ụlọọrụ gọọmentị aghara-aghara na mpaghara ebe dị iche iche, ma kọwaa ya dịka ihe jọgburu onwe ya, kpọkukwa ndị na-eme ihe dị etu ahụ ka ha sepu aka na ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484