A Ga-Agbape Ọdụ Ụgbọelu Anambra Echi

Oct 29, 2021 - 20:50
 0
A Ga-Agbape Ọdụ Ụgbọelu Anambra Echi

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọchịchị steeti Anambra ekwupùtela na ọ bụ ụbọchị Satọdee, bụ abalị iri atọ nke ọnwa Ọktooba ahọ a ka a ga-agbape ọdụ ụgbọelu mba ụwa Anambra ahụ a rụrụ n'Ụmụeri, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Anambra East, ka o wee malite ọrụ ibu ndị mmadụ na ngwaahịa n'uju.

Ya bụ ọdụ ụgbọelu bụ nkè a rụrụ n'ime ọnwa iri na ise site n'aka gọọmenti nọ ugbua na steeti Anambra, ka ọ gachaara ọtụtụ ahọ steeti ahụ jiri rọba nrọ inwe ọdụ ụgbọelu, bụkwazị nke mechaara wee pụta ìhè.

N'okwu ya banyere nke ahụ, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Obianọ kèlèrè isi ọchịchị ụlọọrụ 'Nigerian Civil Aviation Authority (NCAA)', ụlọọrụ 'Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN)' na ụfọdụ ụlọọrụ ndị ọzọ maka nkwàdo ha iji hụ na nrọ ahụ pụtàrà ihe
O kèlèkwàrà Ndị Anambra maka ezi ntụkwasịobi ha nwere n'ọchịchị ya nà nkwàdo pụrụ iche ha na-enye ya kemgbe o jiri bata n'ọkwa ọchịchị.

O kwupụtara obi ụtọ ya ma nyekwa Chineke ekele banyere etu o siri malite ma rụchaa ya bụ ọdụ ụgbọelu n'ime ọnwa olenaole, ma kọwaa na nke ahụ egosipụtakwala ọzọ na ọchịchị ya bụ ekwueme, n'ihi na o mezuputela nkwà ahụ o kwere ha ịrụrụ ha ọdụ ụgbọelu.

Dịka ọ na-akpọku ọhaneze ka ha bịa sonye na mmemme mgbape ọdụ ụgbọelu ahụ a ga-eme ụbọchị Satọdee; o kwukwara na a ga-arụchapụ ma gbapee ogige ụlọ ezumeezu mba ụwa ahụ, bụ 'International Conference Centre' a  na-arụkwa n'ime steeti ahụ ugbua ma bụrụkwa nke ọrụ na-akụrụzị ọnụ na ya ugbua. Ya bụ ogige ka e kwuru na ọ pụrụ ịbàtà mmadụ ruru puku iri n'ọnụọgụgụ otu oge.

Gọvanọ Obianọ kọwakwazịrị na mgbape ahụ a ga-agbape ọdụ ụgbọelu ahụ, nà mmepe a ga-emepe ogige ụlọ ezumeezu ahụ ga-enye aka nke ukwuu n'ịkwàlite ọnụọego, ọnọdụ akụnụba, ọnọdụ azụmahịa na ọnọdụ mmepe steeti ahụ ka ọ nọrọ n'ogoogo dị elu.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484