A Ga-Agbape Ogige Ama Egwuregwu Awka Echi —Obianọ

Dec 27, 2021 - 21:23
 0
A Ga-Agbape Ogige Ama Egwuregwu Awka Echi —Obianọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwuola na a ga-agbape ama egwuregwu ahụ ọ rụrụ ọhụrụ n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ  echi, bụ abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Disemba a.

Gọvanọ Obianọ kwupụtara nke a oge ọ gara njem nleta n'ebe ahụ a rụrụ ogige ama egwuregwu ahụ, bụ nke a maara dịka 'Awka City Stadium', ama egwuregwu 'Awka City Stadium', bụ ama egwuregwu ahụ ọchịchị ya rụrụ ọhụrụ n'Awka, maka ụdị mmemme na ụdị egwuregwu dị icheiche.

N'okwu ya oge ọ gaghàrịchara n'ogige ahụ wee hụ ka ọrụ si aga n'ebe ahụ, ya bụ Gọvanọ nọrọ ebe ahụ wee kwupụtanwòó na ọ bụ n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Disemba ahọ a ka a ga-anọkwa wee nwee asọmpi bọọlụ nke mbụ n'ogige ama egwuregwu, one of the legacy projects of Governor Willie Obiano will be officially opened for use on December 28, 2021.

O kwupụtara obiụtọ na afọojuju ya banyere ihe ọ hụtara n'ebe ahụ na ogoogo ọrụ ahụ nọ na ya ugbua, nàkwà etu e si arụ ya n'usoro kwesiri ekwesi.

Ọ kọwara ka ogige amaegwuregwu ahụ siri bụrụ ọkachamma, ma bụrụkwa nke dị n'ogoogo òtù egwu bọọlụ mba ụwa, bụ FIFA, kwàdòrò.

O jikwazịrị ohere ahụ wee kpọkuo ọhaneze ka ha bịa sonye kirie asọmpi ahụ a ga-eme n'abalị iri na asatọ nke ọnwa n'ama egwuregwu ahụ, n'ihi na ohere dịịrị onye ọbụla nwere mmasị isò wee kirie ya bụ asọmpi, ma bụrụkwa n'efù.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka egwuregwu n'ime steeti Anambra, bụ ụlọọrụ 'Anambra State Sports Commission', bụ Maazị Tony Oli kelere Gọvanọ Obianọ maka ime ka ya bụ nrọ ịrụ ogige ama egwuregwu ahụ pụta ihe, nke pụtara na Anambra enweela ama egwuregwu zuru òkè ma bụrụkwa ọkaibe.

Dịka ọ na-agba akaebe na ámá egwuregwu ahụ ga-enye aka n'ịkwalite egwuregwu n'ime steeti ahụ, tinyere uru ndị ọzọ ọ ga-ewèta, Maazị Oli tinyekwara olu nke ya wee kwuo na ọ bụ n'ama egwuregwu ahụ ka ndị òtù a maara dịka 'Anambra Academicals' ga-enwe àgbà egbe buru ọlaa nke asọmpi ha. 

O kwuru na ọ bụ n'abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa a ka a gara eme ya bụ asọmpi egwuregwu n'ebe ahụ, mana e bughàrịzịrị ya ka ọ dị n'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa a.

N'akụkụ nke ya, onye ji ọrụ ngo ahụ, bụ Maazị Ebi Egbe nyere nkọwa banyere ogige ama egwuregwu ahụ, akụrụngwa dị icheiche na ogoogo e ji arụ ya, ma mekwazie ka a mara na Obianọ họọrọ ọkachamma, ọbụladị dịka o kwupụtara olileanya o nwere na a ga-arụcha ma gbapee ya n'oge a kara àkà.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484