A Ga-Emerịrị Nhọpụta Ọchịchị Anambra, Ndị Anambra Gaanụ Tụọ Akwụkwọ — Yakubu

Nov 5, 2021 - 18:12
 0
A Ga-Emerịrị Nhọpụta Ọchịchị Anambra, Ndị Anambra Gaanụ Tụọ Akwụkwọ — Yakubu

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ 'Independent National Electoral Commission (INEC)' ekwuola hoohaa na e nweghị nlaghachiazụ ọbụla gbasaara ụbọchị a ga-eme nhọpụta ọchịchị steeti Anambra, n'ihi na a ga-emerịrị ya bụ nhọpụta dịka e siri kàá ya, n'ụbọchị ahụ e tinyere ya, bụ ụbọchị Satọdee, abalị isii nke ọnwa a bụ Nọvamba ahọ a.

Onyeisioche ụlọọrụ INEC, bụ Ọkammụta Mahmood Yakubu bụ ya kwupụtara nke a n'ọgbakọ pụrụ iche ya na ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na ndịisi ụlọọrụ nchekwa dị icheiche nwere na nsonso a banyere nhọpụta ọchịchị ahụ a na-akwadobe.

Ọgbakọ ahụ dọtara ndị sitere ụlọọrụ INEC, ndị uweojii, ndị ọrụ agha ala Nigeria, ndị ụlọọrụ 'Department of State Service (DSS)', ndị ụlọọrụ 'Nigerian Security and Civil Defence Corps (NSCDC)', ndị ọrụ na-ahụ maka njem awele n'okporoụzọ, bụ ụlọọrụ 'Federal Road Safety Corps (FRSC)' tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

Onyeisioche INEC, bụ Ọkammụta Yakubu kwere nkwà na a ga-enye otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla na ndị nkwàdo ha ezi ọnọdụ dị larịị ụbọchị ahụ iji tụọ akwụkwọ; ma kpọkuzie ndị Anambra ka ha pụta bịa tụọ akwụkwọ ụbọchị ahụ, maka na e tinyechaala ezi atụmatụ n'ọrụ, iji ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ nchekwa ụbọchị ahụ. 

O nyekwazịrị owuweanya na égwù ọbụla adịghị, ma kpọkuzie onye ọbụla bụ onye Anambra so atụ akwụkwọ ka ọ pụta soro ibe ya tụọ akwụkwọ ụbọchị ahụ, karịa iji ụjọ dàárá ènwè n'elu.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọọrụ INEC n'ime steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkwachukwu Orji kwupụtanwòrò ezi njikere ụlọọrụ ahụ dị ịchịkọba nhọpụta ga-aga siriri-werere ma bụrụkwa nke ghe anya oghe n'enweghị nsogbu ọbụla.

N'okwu ya, onyeisi ndị uweojii n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Echeng Eworo nyekwàzịrị owuweanya na ndị ọrụ ya na ụlọọrụ ya dị njikere ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ nchekwa ụbọchị ahụ, site na njikọaka ha na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ; ma gwazie Ndị Anambra atụla egwu ịpụta iro ụbọchị ahụ n'ihi na o nweghị ihe na-eme.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484