A Gbaala Ndị Ohi Abụọ Ọkụ n'Onitsha

Jan 20, 2022 - 13:31
 0
A Gbaala Ndị Ohi Abụọ Ọkụ n'Onitsha


Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ na-abụ onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

Ka ọ dị taa, mmadụ abụọ a na-enyo ènyò na ha bụ ndị ohi ezutela ọnwụ mberede ha n'Ọnịtsha, dị na steeti Anambra, oge ndị iwe juru obi jidere ha ma suo ha ọkụ, maka ohi ha zuru.

Nke a bụ nke mere n'akụkụ ọdụ mmanụ ụgbọala Conoil dị n'Ọnịtsha, na mpaghara okporoụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha. 

Dịka ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere siri kọwaa, ndị ahụ a na-enyo na ha bụ ndị ohi jìrì ọgbaatumtum wee bịa zuo ohi ego, ekwentị na ụfọdụ ihe ndị ọzọ n'aka ndị mmadụ bi na mpaghara Awada, gbalisie egbè elu iji chụsasịa ndị mmadụ, wee chọọ ka ha ga-esi larie. 

Kaosiladị, ndị mmadụ nọ nso ebe ahụ chụsòrò ha ọsọ ka nkịta na-achụ nchì n'ọdọ ata, wee nwụchikọọ ha na mpaghara njikọụzọ MCC. Ka ha jidechara ha, ha kere ndị ohi ahụ agbụ ozigbo, tọgbọ ha n'ala n'akụkụ okporoụzọ, dokwàsá ọgbaatumtum ha n'elu ha, ma mụnye ha niile ọkụ ozigbo, ha wee gbaa ọkụ pịàtàà, ghọ̀ọ́ ntụ.

N'aka nke ọzọ, ụfọdụ n'ime ndị ọnọmgbeomere kọwàrà na ndị ohi ahụ dị mmadụ atọ wee bịa, mana otu onye n'ime ha gbanahịrị ndị ahụ na-achụ ha, e wee jide mmadụ abụọ ndị ọzọ, kpọọ ha ọkụ ka ewu ekeresimeesi.

Ha kwukwàrà na ndị ohi ahụ bịara n'ụdị na ha na-etinye ntụziaka 'onye apụtakwala iro' (sit-at-home order) n'ọrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484