A Kpọkuo Ndị Igbo Ka Ha Na-Akwàlite Asụsụ Na Omenala Ha

Feb 7, 2020 - 00:40
Jan 24, 2021 - 01:27
 0
A Kpọkuo Ndị Igbo Ka Ha Na-Akwàlite Asụsụ Na Omenala Ha

Izunna Okafor, Awka

A kpọkuola ndị Igbo ka ha na-echekwaba ma na-akwàlite asụsụ na omenala ha, ka o wee ghara ịnwụ maọbụ fùó dịka ndị òtù mba ụwa bụ 'United Nations Educational, Scientific and Cultural Organization (UNESCO)' bùrù n'amụma n'ahọ 2012.

Òkù a bụ nke a kpọrọ nso-nso a na mmemme ''Nkwalite Asusu na Omenala Igbo” a chịkọbàrà n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, bụ mmemme dọtara ụmụakwụkwọ sitere ụlọakwụkwọ dị iche iche na steeti ahụ na ụfọdụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izù na ngalaba mmụta.

N'okwu ya na mmemme ahụ, odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ na mịnịstịrị steeti Anambra na-maka ihe na-eme na mba òfèsi, ihe e ji aka emepụta, omenala na njem nlegharị anya, bụ Maazị Tony Ezenwaka kọwàrà asụsụ na omenala dịka ihe kachara sie ike e ji ama ebe onye sì, bụrụkwa nke kwesiri ka a kwàlite ma kwàdosie ya ike.

O mere ka a mara na site na nkwàdo ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ, na ụlọ ọrụ ahụ agbaala ọtụtụ mbọ dị iche iche, ma ka na-agbakwa ọtụtụ mbọ ịkwàlitè asụsụ, omenala na njirimara ndị Igbo n'izùgbe, ọbụnadị dịka o chètààrà ndị bịara mmemme ahụ na ọchịchị steeti ahụ emeela ka ọ bụrụ iwu na a ga na-asụ asụsụ Igbo ma na-eji ejiji ndị Igbo n'ụlọakwụkwọ na ụlọọrụ dị iche iche dịgasị na steeti ahụ ahụ.

Na mbụ na nkuzi ya, Dọkịta Arịnze Agbanụsị, sitere mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka mèrè ka a mara na iwu nchekwa mmụta ala anyị kwùrù ka a na-akụziri nwata ọbụla ihe n'asụsụ ọdịnala ya, ma kwazie arịrị na ọtụtụ ndị nne na nna anaghị asụrụ ụmụ ha asụsụ Igbo, ma ya fọdụzie ikwe ka e were ya kụziere ha ihe.

Ọ kpọkùzịrị ndị nne na nna ka ha gbaa mbọ na-akụziri ụmụ ha asụsụ na omenala Igbo, ọ kachasị bido n'oge ha dị na nwata, ọbụnadị dịka ọ gbarụrụ ihu nye ndị nkuzi na-enye ụmụakwụkwọ ntaramahụhụ maka na ha sụrụ asụsụ Igbo; ma dụọ ndị na-eme ihe dị otu ahụ ka ha sepụ aka na ya.

Ụmụakwụkwọ sitere ụlọakwụkwọ dị iche iche wee bịa mmemme ahụ jìzịrị otù olu wee kpọkuo gọọmenti steeti Anambra ka o welitekwuo aka na mbọ ọ na-agba ịkwàlite asụsụ na omenala Igbo n'ime steeti ahụ, ya na ime ka ịma asụ na ịma ede Igbo bụrụ nke na-amị akpịrị.

Mmemme ahụ dọtara eze ọdịnala Awka, bụ Igwe Gibson Nwosu, ma bụrụkwa nke a nọrọ na ya wee mee ejije, gbaa egwu ọdịnala, ma mekwa ihe ngosi ndị ọzọ mere ka ọ zaa aha a kpọrọ ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.