A Kpọkuola Gọọmenti Etiti Ka Ọ Gbata Ọsọ Enyemaka nỤzọ Enugu—Onitsha

Aug 15, 2021 - 20:44
 0
A Kpọkuola Gọọmenti Etiti Ka Ọ Gbata Ọsọ Enyemaka nỤzọ Enugu—Onitsha

Izunna Okafor dere akụkọ a


A kpọkuola ma rịọ gọọmenti etiti ala Nigeria ka o mee ngwa gbata ọsọ enyemaka aka-ọkụ aka-ọkụ na mpaghara Amansea nke ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Onitsha n'ime steeti Anambra

Oku a bụ nke a kpọrọ na nsonso a site n'ọnụ ndị òtù 'Nigeria Society Of Engineers (NSE)', ngalaba ha nke Awka, n'okwu ha oge ha na-elegara anya n'etu ọrụ gọọmenti etiti siri gbata kwụrụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, ọkachasị dịka o siri metụta ịrụ na idozisi okporoụzọ jikọtasịrị steeti dịgasị na mpaghara ahụ.

N'okwu ya n'aha ndị òtù ahụ, onyeisioche ha n'Awka, bụ Injinia Odinaka Okonkwo gbarụrụ ihu banyere ọnọdụ okporoụzọ ahụ nọ na ya ugbua, ọkachasị na mpaghara Amansea na mpaghara ebe ndị ọzọ dịkwa njọ, bụkwa nke na-ebì ndị na-eme njem ebe ahụ aka ọjọọ.

Ọ kpọrọ òtù ka e guzobe ụlọọrụ na steeti ọbụla maka ilekọta na ịkwàlite ọnọdụ okporoụzụ gọọmenti etiti dịgasị n'ime steeti dị na mpaghara ahụ, ọbụladị dịka ọ rịọkwara gọọmenti etiti ka jiri usoro ọgbaraọhụrụ na akụrụngwa ọgbaraọhụrụ were gbata ọsọ enyemaka aka-ọkụ aka-ọkụ na mpaghara Amansea ahụ, iji belatara ndị na-agba n'okporoụzọ ahụ ihe nhịaahụ ha na-agabiga n'ebe ahụ.

Injini Okonkwọ kpọkwàrà òkù ka a na-eji ụlọọrụ ngo na ndị ọrụ bụ ụmụafọ ala Nigeria were na-arụ ọrụ okporoụzọ n'ala Nigeria, n'ihi ọtụtụ uru dị iche iche ọ kpọpụtasịrị nke ahụ ga-eweta.

Dịka o kelere gọọmenti etiti maka etu ọrụ si agawanye nke ọma bido na mpaghara Amawbia wee ruo na mpaghara Ụmụnya nke okporoụzọ Enugu—Onitsha ahụ, ọ kpọkuru ma dụọ ndị ji ọrụ ngo ahụ ọdụ ka ha wetukwuo ihe ahụ a rụnyere n'ebe e si agbachà n'okporoụzọ ahụ, nke a na-akpọ 'island diversions', n'ihi na nke ahụ a rụnyesiri ebe ahụ bugasịrị ibu karịa etuno kwesiri ịdị, ma-ewetekwa ihe iche aka mgba na ihe izèndụ nyegara ndị na-agba n'ụzọ ahụ.

Na ntụnye nke ha n'ótù n'ótù, ụfọdụ ndị ọzọ bụkwa ndị òtù ahụ, nke gụnyere Injinia Cyril Anaeto na Injinia Paul Okoye kọwara njem nleta ahụ ha gara n'ebe ahụ dịka nke dabara adaba, ma kpọkuo gọọmenti ka o welitekwuo aka n'etu o si arụ ma na-elekọta ọrụ okporoụzọ ahụ.

N'okwu nke ha oge a gbara ha ajụjụọnụ, ụfọdụ ndị na-anyà ụgbọala n'okporoụzọ, nke gụnyere Emeka Obiorah na Esther Nwachukwu kọpụtasịrị ihe dị iche iche ha na-agabiga n'okporoụzọ ahụ nà etu ajọ ọnọdụ okporoụzọ ahụ si emetụta ụgbọala ha, ma kpọkuo gọọmenti etiti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka ngwangwa n'okporoụzọ ahụ site n'ịrụchapụ ya ọsọọsọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484