A Kpọkuola Ndị Anambra Ka Ha Kwụsị Ịga Mposi Aghara Aghara

Nov 21, 2019 - 02:58
Jan 24, 2021 - 05:35
 0
A Kpọkuola Ndị Anambra Ka Ha Kwụsị Ịga Mposi Aghara Aghara

Izunna Okafor, Awka

Dịka mba ụwa merùbèrè mmemme ụbọchị ịga mposi nke ahọ 2019, a kpọkuola ma dụọ ụmụafọ steeti Anambra ka ha zèere ịga mposi aghara aghara, ọ kachasị n'ebe ezighị ezi na steeti ahụ.

Ya bụ òkù bụ nke a kpọrọ dịka isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka gburugburù na steeti ahụ, bagidèrè na amụmà inye nkuzi na ibu agha megide ịga mposi aghara aghara, bụ ozi nke ha bùru wee gagharịa n'ọtụtụ mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ. Ndị dị iche iche sonyere na ya bụ atụmatụ nkuzi gụnyèrè ndị sitere ụlọ ọrụ ihe bànyere mkpocha na nzàcha dị n'aka na steeti ahụ, bụ ndị a maara dịka 'Anambra State Waste Management Agency (ASWAMA)'; ndị sitere ụlọ ọrụ ọrụ 'Operation Clean and Healthy Anambra' a màara dịka Ọcha Brigade; ndị ji otu ahọ efe àlà nna ha, tinyere ọtụtụ òtù ọrụ ndị ọzọ.

N'okwu ya bànyere nke ahụ, nnukwu onye enyemaka pụrụ ichè nye Gọvanọ n'ihe gbasaara ijikwa àtịtị, bụ oriakụ Florence Ọraedum, kọwara na isi sekpụ ntị n'amụmà inye nkuzi ahụ bụ ime ka ndị Anambra mara bànyere ọtụtụ ihe egwù dị iche iche dị n'ịga mposi aghara aghara na ebe ekwesighị ekwesi, ọbụnadị dịka ọ kpọkùrù ha ka ha sonyesie ike n'ezi ebumnobi nke ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ ime Anambra ka ọ bụrụ eji ama àtụ nakwa steeti kachasị adị ọcha n'ala Nigeria.

Na ntụnye nke ha n'ótù n'ótù, nnukwu onye enyemaka pụrụ ichè nyere Gọvanọ n'ihe gbasaara gburugburu, ịchọ gburugburu mma nakwa ọnọdụ ihu eligwe, bụ Oriakụ Chinwe Anịemena, na onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasaara gburugburu, bụ Maazị Francis Ịgwah kọwara atụmatụ ahụ dịka nke magburu onwe ya, ma kpọkùo Ndị Anambra ka ha sonyesie ike n'atụmatụ 'Dobe Anambra Ọcha', dụọkwa ha ka ha kwụsị ịga mposi n'ebe ezighị ezi n'ihi ihe so ya.

Otu onye solitere n'ọkwa n'isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka gburugburu, bụ Oriakụ Ngọzị Anyaragbu kelere ndị dị iche iche sonyere na ya bụ amụmà nkuzi, ma kwezie nkwà na ụlọ ọrụ ahụ ga-aga n'ihu n'ịgbasawànye ya bụ ozi. Ọ màkwàzịrị ọkwà na onye ọbụla e jidere ebe ọ na-arụ arụrụ nsị ka a ga-akpụpụ ụlọ ikpe ma were usoro iwu nyụchaa ha anya.

Ụbọchị ịga mposi na mba ụwa, bụ ụbọchị pụrụ iche òtù mba ụwa weputàrà iji merùbe ịga mposi, ma lebakwaa anya n'ihe dị iche iche metụtara ịga mposi dịka ọ dị na mba ụwà, ya na otu a ga esi mee ka ọ kawanye mma.
Ọ dị nchèta na nnyocha ndị WHO mèrè n'ahọ a na-egosi na mmadụ karịrị ijeri anọ na mba ụwà bì na gburugburu ruru unyi, ebe mmadụ karịrị narị ndè isii na puku iri asaa na atọ ka na-arụ arụrụ nsị.

Isiokwu mmemme ụbọchị ebe aa na-aga mposi nke ahọ a bụ "Leaving No One Behind" nke pụtara, ma a tụgharị ya, "N'agbahàpụghị Onye Ọbụla."

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.