A Kpọkuola Ndị Anambra Ka Ha Wèlataruo Akụ Ha Ụlọ

Jun 1, 2021 - 22:39
 0
A Kpọkuola Ndị Anambra Ka Ha Wèlataruo Akụ Ha Ụlọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ na-abụ akụ ruo ụlọ a mara onye kpara ya.
Ka ọ dị taa, a kpọkuola ma dụọ ụmụafọ steeti Anambra nwere azụmahịa, ụlọọrụ, na ihe mwunye ndị ọzọ dị iche iche na mpaghara ụwa gbaa gburugburu ka ha na-ewelataru akụnụba ha ụlọ, iji kwalite ọnọdụ mmepe steeti ahụ.

Oku a bụ nke a kpọrọ site n'aka ndị òtù 'Anambra Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture (ACCIMA)' n'okwu ha oge ha gara ileta ka ọnọdụ ọrụ siri gbata kwụrụ n'ogige ebe ahụ gọọmentị steeti ahụ na-arụ ọdụ ụgbọelu mba ụwa na steeti ahụ.

N'okwu ha n'ọdụ ụgbọelu ahụ, dị n'Ụmụeri, n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Anambra East', ndị òtù a, nke ndị gụnyere ndị òtù 'Awka Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture', 'Onitsha Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture' na 'Nnewi Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture' gosipụtara obi ụtọ ha banyere agadaga ọrụ ọchịchị steeti ahụ rụrụ n'ebe ahụ.

Onye kwuru okwu n'aha ndị òtù ahụ, ma bụrụkwa onyeisi òtù 'Onitsha Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture', bụ Maazị Chris Ukachukwu nyèrè nkọwa banyere etu ọnọdụ ụgbọelu ahụ siri magbuo onwe ya, ma kọwaa ya dịka nke ga-ewèta mmalite ọhụrụ ma dọta mmepe pụrụ iche na steeti ahụ, ọkachasị n'ihi etu o siri nwee ngalaba maka ịtụlata ngwaahịa, bụ nke ọ kọwara dịka nke ga-abàrá ndị Anambra na ndị ọzọ na-atụbata ngwaahịa na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria úrù n'ọtụtụ ụzọ.

Dịka ọ na-ekèlé aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ maka ịrụ agadaga ọrụ ahụ na ọrụ ndị ọzọ ọ rụgoro na steeti ahụ kemgbe o jiri bata n'ọkwa ọchịchị, Maazị Ụkachukwu mèrè ka a mara na ọtụtụ ndị Anambra bụ ndị e ji azụmahịa wee mara, ma gbaa akaebe na ọdụ ụgbọelu ahụ ga-enye aka ịkwàlìtè azụmahịa ha, ego na-abàta na steeti ahụ, na ọnọdụ akụnụba steeti ahụ n'ozuzuokè.

O kwukwàrà na a na-arụ ọdụ ụgbọelu n'ogoogo mba ụwa, kwupụta olileanya o nwere na a ga-arụchàpụ ya bụ ọdụ ụgbọelu ma gbapee ya n'oge adịghị anya; ọbụladị dịka ọ kpọkùkwàzịrị ụmụafọ steeti ahụ ka ha wèlataruo akụ ha ụlọ site n'ịbịa wunye ihe mwunye, dịka ụlọọrụ, ụlọ mmepụta ngwaahịa azụmahịa, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ e ji achụ ego na steeti ahụ, karịa ịrụ ihe ndị ahụ naanị na mba ọzọ.

N'okwu ha n'ótù n'ótù, onyeisi òtù 'Awka Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture', bụ Maazị Prince Jude Osumuoh; na ògbò ya nke 'Nnewi Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture', bụ Maazị Stephen Nduaguba kpọpụtasịrị ọtụtụ ụzọ dị iche iche ọdụ ụgbọelu ahụ ga-esi bàrá Ndị Igbo uru, ma gosipụta olileanya ha nwere na Ndị Anambra ga-akpara ya bụ ọjị nkụ etu o kwesiri.

Na mbụ n'okwu ya oge ndị òtù ahụ kpọtụụrụ ya, Gọvanọ Obianọ kọwàrà mkpà 'Akụ Ruo Ụlọ' dị na mmepe obodo, nà mkpà ọ dị ịtụnyere ụlọọrụ Ndị Anambra site n'igo ngwaahịa ha, ma kwuo na ọchịchị ya nà-atụnyere ụlọọrụ Innoson site n'igo ụgbọala n'aka ya, tinyere ọtụtụ ụlọọrụ na ụlọ mmepụta ngwaahịa ndị ọzọ dịgasị na steeti ahụ.

Ọ gụpụtasịrị òhèrè ọma dị iche iche ga-esi n'ọdụ ụgbọelu ahụ pụta, ma kpọkuo ndị Anambra ka ha wèlataruo àkụ ha ụlọ, ọkachasị site n'iso wunye àkụ ha ma rite úrù n'ohere ọma ahụ jupụtàrà n'ọdụ ụgbọelu ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484