A tuola Umar Farouk Abdulmutallab nga mkpuru oka

A tuola Umar Farouk Abdulmutallab nga mkpuru oka

Jul 1, 2014 - 05:00
Jan 20, 2021 - 05:01
 0
A tuola Umar Farouk Abdulmutallab nga mkpuru oka

Otu onye ọkaikpe na mba Amerịka atụọla nwa afọ ala Nigeria nga mkpụrụ. Dịka a na-ewere otu ogbe ọka na-atụpụ nanị otu mkpụrụ ọka nay a kwa afọ, nga mkpụrụ ọka bụ nga ebighi ebi, nke onye a tụrụ ya ga-anọgide n’ime ya were ruo n’ụbọchị ọnwụ ya.

Gịnị kpatara e jiri tụọ ya ụdị nga a? Umar kwetere na ikpe mara ya n’ebubo ahụ eboro ya na ọ kpara nkata ma nwakwaa ike ya ịtụ ogbunigwe n’ụgbọelu bu ndị njem aga Amerịka.

N’ụbọchị ekeresimesi, abalị 25 nke ọnwa disemba, afọ 2009, Umar kwara mgbọ ogbunigwe yiri ya n’iba ya, were banye n’ụgbọelu na-aga Amerika. A na-akọwa na ndị otu Al-Kaịda koro Umar. O kwenyere ha were nyiri ogbunigwe n’iba ya were banye n’ugboelu bu ihe ruru mmadụ 300 si Amsterdam aga Detroit. Mgbe ha ruteweziri n’ebe ụgbọelu ha ga-ada n’Amerịka. Umar nwara ike ya ime ka obugbigwe ya gbawaa, ma gbuo ma ya ma ndị ọzọ so eme njem n’ụgbọelu ahụ. Mana aka apụghị ya.

Ndị njem ibe ya jisiri ike jikpaa Umar ahụ, were meghụọ ogbunigwe ahụ nke Umar munyegoro ọkụ.

E mechara kpee Umar ikpe n’Amerika. Umar jiri ọnụ yak were na ikpe mara ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.