ABS Achịkọbala Emume Ịbụ Abụ Na Ihe Ọgụgụ Iteghete Ekeresimeesi

Dec 18, 2019 - 23:16
Jan 24, 2021 - 03:09
 0
ABS Achịkọbala Emume Ịbụ Abụ Na Ihe Ọgụgụ Iteghete Ekeresimeesi

Izunna Okafor, Awka

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ n'ụlọ ọrụ 'Anambara Broadcasting Service' dịka ụlọ ọrụ ahụ chịkọbàrà oke mmemme ịbụ abụ na ịgụ ihe ọgụgụ iteghete Ekeresimeesi, bụ nke nwa bekee kpọrọ 'Festival of Carol and Nine Lessons' nke ahọ 2019.

Oke mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'ogige isi ụlọ ọrụ ahụ dị n'Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị ukwu ndị ukwu dị iche iche, nke gụnyere ndị isi ụka, ndị ọrụ gọọmenti, ndị na-ewu èwù n'ime ejije, iti egwu nà mgbasa ozi, ndị eze ọdịnala, nakwa ọhaneze sitere ebe dị iche iche wee bịa iji anya na ntị ha gbara ekeresimeesi.

N'okwuchukwu ya na mmemme ahụ, Bishọọpụ ụka Katọliiki na Dayọsiisi Awka, bụ Bishọọpụ Paulinus Ezeokafọr, onye kwuru okwu site n'ọnụ otu ụkọchukwu sitere dayọsiisi ahụ, bụ Ụkọchukwu Patrick Umezi kpọkùrù ndị bịara mmemme ahụ ka ha na-akwado onwe ha n'ime mmụọ na eziokwu oge ọbụla maka ọbịbịa nke onye nwe anyị, karịa ime naanị nkwado nke elu ahụ maọbụ ihe a na-ahụ anya.

O chetààrà ha ihe ekeresimeesi pụtara, mà dụọ onye ọbụla n'ime ha ka ọ nabata Jesus dịka onye nwe ya na onye nzọpụta ya, n'ihi na ọ bụ ihe ezighị ezi ma bụrụkwa ihe ekweghị omume mmadụ ịsị na ọ na-emerùbe mmemme ọmụmụ onye ọ maghị onye ọ bụ.

A nọrọ na mmemme omenahọ ahụ, nke Maazị Sunday Ezeobiọra nọ n'isi ya wee bụọ abụ dị iche iche, gụọ ihe ọgụgụ iteghete, mee ihe mmemme ife nzà maka ihe nrita, bụ 'raffle draw' maka ndị ọrụ ụlọ mgbasa ozi ahụ, tinyere ihe ndị ọzọ dị iche iche mere ka ya bụ mmemme zaa ahà a kpọrọ ya.

N'okwu ọ gwàrà Ka Ọ Dị Taa, onyeisi ụlọ ọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation, bụ Maazị Chuka Nnabụife kọwàra emume ịbụ abụ na ihe ọgụgụ ekeresimeesi dịka ihe ndubànye na mmemme ekeresimeesi, ma mekwa ka a mara na ebumnobi nke ahụ bụ iji mee ka ndị mmadụ mara banyere ihe omimì dị iche iche gbasaara ọmụmụ Jesus Christ.

N'ozi ekele ya, onyeisi ụlọ mgbasa ozi ABS, bụ Maazị Uche Nwọrah tòrò Gọvanọ Willie Obianọ maka agbambọ ya dị iche iche n'inwògharị ụlọ ọrụ ahụ ka ọ nọrọ n'ogoogo mba ụwa, ma kelekwazie ndị dị iche iche bịara mmemme ahụ na kwa ndị tụnyere ụtụ n'ụzọ dị iche iche iji hụ na ya bụ ihe mmemme gara siriri-wèrèrè.

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ, nke gụnyere nwa amadi ahụ na-ewu èwu n'ime ejije, bụ Maazị Pete Edochie, eze ọdịnala Awka, bụ Igwe Gibson Nwosu, Igwe obodo Ụmụeri, bụ Igwe Ben Emeka, onye na-anọchite anya Njikọka nke abụọ n'ụlọ omebe iwu steeti ahụ, bụ Maazị Pete Ibida, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ, kèlèrè ndị bịara mmemme ahụ, ma kpee ka Chineke chekwaba onye ọbụla n'oge mmemme ekeresimeesi a, ma duokwa ndị ga-eme njèm ka ha jee ma chighata n'udo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.