98
views
....

Si n'aka Izunna Okafor



NDỊ Igbo sị na ọ na-abụ e kwe ekele, ihu asaa, ma sịkwa na ekele e kweghị ekwe dapụụrụ mmụọ onye kelere ya.

Onye chọrọ ịma ga-ajụzị, sị ‘Ọ bụ gịnị bụ ekele?’

  Ekele bụ bụ ime óbì e gosipụtàrà n’elu ọnụ, ma bụrụkwa echiche óbì e mepụtàrà n’omume. Nke a pụtara na ekele bụ ụzọ mmadụ si ekwupụta maọbụ egosipụta ka obi dị ya nyegara mmadụ ibe ya, mmụọ maọbụ Chi kere ya. Ọ bụ ime obi e gosipụtara n’elu ọnụ, ma bụrụkwa echiche e mepụtara n’omume.

  Ekele pụtara ọtụtụ ihe n’ebe ọtụtụ ndị nọ n’ihi na ọ bụ ezie na uche bụ uche, mana nghọta dị iche iche. Ndị ọbụla nwèrè ụzọ dị iche iche ha si ekele ekele maka na nkụ dị na mba na-eghere mba nri. Ọ bụkwa ihe ndị na-aghọta ka ha na-asụ. Ekele ndị ọbụla na-agbakwasịkwa ụkwụ n’asụsụ ha n’ihi na ekele niile nwere ụsà. Onye aghọtaghịkwa ihe e kelere ya apụghị ikwe ekele ahụ, maka na mmadụ abụghị oke ngwere na-ekwe n’isi nye ihe ọbụla ọ nụrụ; ma nke a gwara ya ma nke a gwaghị ya, maọbụ ma nke ọ ghọtara ma nke ọ ghọtaghị.

  Nke a pụtara na ndị Igbo, ndị Hausa, ndị Yoruba, ndị ọcha na ndị àgbụrụ dị iche iche na mba ụwa nwere ekele nke ha, n’asụsụ ha dị iche iche.

  N’ala Igbo, e nwere ụdị ekele dị iche iche, nwee oge e ji ekele ha, ma nwekwa ihe nke ọbụla na-egosipụta. Iji maa atụ, e nwere ekele ọrụ bụ nke a na-ekele ndị na-arụ ọrụ (dịka: daalụ, ndeewo, jisie ike, i meela, ike agwụla gị), ma bụrụkwa nke na-egosipụta otuto na agbamume nye ndị na-arụ ọrụ.

  E nwere ekele onye ihe mere bụ nke e ji akasí mmadụ obi banyere ihe dakwasịrị ya, dịka ndo, dibe, kara obi/kàá obì. E nwekwara ekele oge ụbọchị, bụ ndị a na-ekele n’oge dị iche iche n’ụbọchị, dịka ụtụtụ ọma, ehihie ọma, mgbede ọma, uhuruchi ọma, ka chi fo. Ndị Igbo nwekwara ekele a na-ekele onye na-eme njem, dịka: ije ọma, ladị mma/ laa mma o, jee lọta, ka ọ dị, ije awele, ka e mesịa. A na-ekelekwa onye lọtara alọta ‘nnọọ’. Ikwe n’aka, ịna aka, ịkụkọ mkpọ, ibi ọmà/ịdà bụkwa ekele. Ụfọdụ jikwa ịtabì anya, ife aka, ịkpọ isi ala na ikwe n’isi ekele ibe ha.

  E wezuga ekele ndị a, ndị Igbo nwegasịzịkwara ụfọdụ ekele ndị ọzọ dị iche iche ha na-ekele na mgbe na mgbe, ọkachasị n’oge gboo. Mana ihe ndị kacha apụta ihe n’ekele ndị a niile bụ nghọta, nsọpụrụ, na obi e ji ekele ha.

  Na mgbe ochie ahụ, bụ oge elu bụ ala ọsa na oge mmadụ ji uche

eme ihe; ụmụaka nwere nsọpụrụ ma nwekwa egwu; ndị okenye na-ejikọlo ma na-akwanyere onwe ha ugwu iji wee dị mma ikele ekele, ndị mmadụ ghọtakwara ihe ekele pụtara. Nke a mezịrị na ekele na-atọ ụtọ n’ọnụ oge ahụ ma na-edozikwa ahụ. Ihe ndị a bụcha ihe a na-ahụta n’oge gboo.

  Ka ọ dị ugbua, ihe ndị a aghasàála. Ụmụaka amaghịzịkwa onye bụ okenye ma ya fọdụzie inwe nsọpụrụ. Ndị okenye n’onwe ha anaghịzịkwa ejikọlo onwe ha, ma ya fọdụzie ime ka okenye. Onye ọbụla na-erezị ùgwù ya, na-egoro ihere. Ndị okenye na-alụtazị ekele n’ọgụ, ebe ụmụaka na-akwàzị ekele dịka iyi. Ekele wee na-akọzị ọkọ n’ahụ onye na-ekwe ya, ma na-amazịkwa ogwu n’ọnụ onye na-ekele ya.

Ọ bụzị onye were ọnụ rịọta ekele, o were gịnị kwe ya?

  N’oge mbụ, nwaagbọghọ hụ okenye (ọkachasị nwoke) ka ọ na-aga n’ụzọ, ọ ga ehulata àlà kèléé ya tupuu ọ gafee. Ọ bụkwa site n’ụzọ dị otu ahụ ka ụfọdụ siri wee họta ụmụagbọghọ nwere nsọpụrụ ha maọbụ ụmụ ha lụrụ, maka na omume onye na-edu ya, ma na-akwàra ya ụzọ.

  Mana ugbua, nwata nwaagbọghọ ahụ okenye n’ụzọ, kama ọ ga-ekele ya ekele ya ekele nkịtị ma ya fọdụzie nke ihulata ala; o letọba onye ahụ anya na mkpụrụ anya ka ehi hụrụ mmanwụ, maọbụ sèé ihu ka nwa enwe Imo Ọka gafere, dịka a gà-asị na ọ chọrọ ịgba ya enyi, maọbụ na ya na ndị ka ya jide ego emekọọla ihe. Ugbua, ọ na-abụ mmadụ na ibe ya baa obere mba, ọ kwụsị ikele ya, n’ụdị iji megide onye ahụ maọbụ iji gosipụta na obi adịghị ya mma n’ebe onye ahụ nọ.

  Ihe ndị a wee bụrụ nnọọ nzuzu dị oke ọnụ ahịa n’ebe ọtụtụ ndị mmadụ nọ, ọkachasị ndị ntorobịa na ụmụ na-eto eto. Ụfọdụ n’ime ha hụkwuzie mmadụ, ha atụfuo ihu, maọbụ malite ịza oku ekwentị ndị mmụọ. Ekele n’ala Igbo n’oge ugbua bụzịkwa nchi tàá arụ, o wee tàá, maka na onye echetereghị ka o kèlee, ọ gaghị ekele.

  N’aka nke ọzọ, ikele ụfọdụ ndị okenye ekele ugbua bụzị iticha aka n’akpụkpụ ehi na ịgbasa mmiri n’elu okwute, n’ihi na obi ọjọọ na ọnụma na-ekojuzịkwa obi ụfọdụ oge niile. E kelee ha ekelee, ha araa

ntị mmanụ ka ngwere aghọ, ọ bụrụ na e keleghị ha, ha achọba onye ga-ebo ibu ọnụma. Ụfọdụ anaghịzịkwa ekweputa ekele ekweputa, ma ya fọdụzie iji obi ha kwe ekele. E kelee ha, ihe ha ga-ekwe bụ ‘mmn’, ma ọ bụrụrị na ha chọrọ ikwe ya bụ ekele ekwe.

  Ngọzị anaghịzịkwa esokarịzị ekele dịka n’oge gboo maka na onye na-ekele ya ejighị obi ya ekele, ebe onye na-ekwe ekwe ejighịkwa obi ya ekwe. Ihe niile na-adazịkwa nghata-nghata; nkọcha wee na-esozị ekele karịa ngọzị dịka ọ dị n’oge gboo.

  Ugbua bụ oge a ga-ekelechaa onye na-eme njem ”ije ọma”, ọ pụọ n’ụzọ o nwee ihe mberede okporo ụzọ, nwụọrọ onwe ya, maọbụ oge a ga-ekelechaa mmadụ “ka chi fo” ma ọ bụ “rahụọ nke ọma”; onye ahụ lakpuo ụra, o kwogide ọnwụ, nwụọrọ onwe ya. Ihe ndị ahụ wee bụrụ n’ihi na ekele esighịzị n’obi apụta.

  Ekele bụ ụtọ nwanne. Eke bụ isi udo. Ekele bụ onye nye, ọ nara. Ekele bụ nsọpụrụ. Ekele bụ nghọta. Ekele bụkwazị omenala.

  Ya mere ndị Igbo, ka anyị werenụ ekele kpọrọ ihe ma chukwaa ya dịka otu n’ime omenala na njirimara anyị.

  Ọ dịkwa mma ime ka a mara na ekele, oge ụfọdụ abụghị site n’onye tọrọ maọbụ onye bụ ibe ya okenye; ọ bụ ihe mmadụ na-echere mmadụ ibe ya. Ya bụ na ikele ekele na ikwe ekele dịịrị onye ọbụla —ma okenye ma ụmụaka, dàbere n’ụdị ekele a na-ekele, maọbụ onye buru ụzọ hụ ibe ya.

  Ekele dịịrị gị, ekele dịịrị ma; ekele dị mma, ekele bụkwa ihe kwesiri ekwesi. Mana ihe kacha dị mkpa bụ obi e jiri kelee na obi e jiri kwe ya.

  Ndị Igbo, kelebenụ ekele, kwebenụ ekele.

  Onye a gwara kwe, a hụ ọzọ, a gwakwa ya.

  Ekelee m…

Igbo mmamma nụ!

YOUR REACTION?