Agụụ: Ndị Ashawo Zimbabwe Amalitela Ịna Bọkeeti Ọkà na Àgwà Dịka Ụgwọọrụ

May 28, 2021 - 21:40
May 28, 2021 - 22:10
 0
Agụụ: Ndị Ashawo Zimbabwe Amalitela Ịna Bọkeeti Ọkà na Àgwà Dịka Ụgwọọrụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Igbo sị na ọ na-abụ egwu dagharịa, a tụgharịa ụkwụ egwu.

N'ịgbaso nke a, ụmụnwaanyị ji ahụ ha akpa ego (bụ ndị ashawo) na mpaghara 'Dema Growth Point' bụ obodo dị na Zimbabwe na-anabatazi ihe nri (foodstuff) dịka bokeeti ọka, na iko àgwà dịka ụgwọ ọrụ ha site n’aka ụmụnwoke na-atụnyere ha.

N’oge ugbua, ụkọ ego ji ndị mmadụ aka, ọtụtụ na-emezi ihe ọbụla iji dị ndụ. Ọ bụ n'ihi nke a ka ụfọdụ ndị ashawo ahụ jiri kwuwaa hoohaa na ha na-anabatazị ihe oriri dịka ụgwọọrụ ha, ma ọ bụrụ na nwoke pịachaa ha ọkụ.

N'okwu ha banyere ọnọdụ ahụ ha nọ na ya, ụfọdụ ndị ashawo ahụ kpọkuru gọọmenti mba ahụ na ndị nnọrọonwe ka ha gbazinye ha ego nke ọmụrụnwa ya agaghị ebu ibu ka ha were malite ihe (business) ha chọrọ ime, iji wee nyere ezinụlọ ha aka wee nwee ike hapụ ịgba ashawo.

Otu n’ime ha aha ya bụ Alice kwuru na oge agaala oge ha na-ana ọnụego US $5 maka abalị niile, ma kọwaa na ha na-anabata ọbụladị otu dọla iji nwee ike gote, ọbụladị akwụkwọ nri na tomato were siere ụmụ ha nri, maka na agụụ dị n'obodo.

Onye ashawo ahụ Alice gwara ndị ntaakụkọ na ọ na-agba ashawo n’ihi na ọ ga-elekọta ezinụlọ ya na ụmụ ya atọ anya. O kwuru na otu n’ime ụmụ ya nke nọ n’ogo nke anọ (form 4) ga-achọ ego iji debanye aha maka ile ule 'Zimbabwe Schools Examination Council' (ZIMSEC), ebe ụmụ ya ndị ọzọ nọ n’ogo Greedi 7 na Greedi 1.

Ọ gara n’ihu kwuo sị na ka ọ dị ugbua, na ọ na-anabatazị ọbụladị otu bọkeeti ọkà maọbụ iko àgwà dịka ụgwọọrụ ya ma nwoke richa ya ọkọmbọ, ka ụmụ ya wee rogidi nke bụ nri.

Agụụ: Ndị Ashawo Zimbabwe Amalitela Ịna Bọkeeti Ọkà na Àgwà Dịka Ụgwọọrụ

Izunna Okafor

Igbo sị na ọ na-abụ egwu dagharịa, a tụgharịa ụkwụ egwu.

N'ịgbaso nke a, ụmụnwaanyị ji ahụ ha akpa ego, bụ ndị a maara dịka ashawo na mpaghara 'Dema Growth Point' bụ obodo dị na Zimbabwe amalitela ịnabata ihe nri (nke gụnyere bokeeti ọka, na iko àgwà na ihe oriri ndị ọzọ) dịka ụgwọọrụ ha site n’aka ụmụnwoke na-atụnyere ha.

N’oge ugbua ụkọ ego ji ndị mmadụ aka, ọtụtụ na-emezi ihe ọbụla iji dị ndụ. Ọ bụ n'ihi nke a ka ụfọdụ ndị ashawo ahụ jiri kwuwaa hoohaa na ha na-anabatazị ihe oriri dịka ụgwọọrụ ha, ma ọ bụrụ na nwoke pịachaa ha ọkụ.

N'okwu ha banyere ọnọdụ ahụ ha nọ na ya, ụfọdụ ndị ashawo ahụ kpọkuru gọọmenti mba ahụ na ndị nnọrọonwe ka ha gbazinye ha ego nke ọmụrụnwa ya agaghị adị elu, ka ha were malite ihe ọzọ dị iche iche ha chọrọ ime, iji wee si ebe ahụ na-enweta ego wee na-enyere ezinụlọ ha aka, ma hapụzie ọrụ ịgba ashawo ahụ ha na-arụ.

Otu n’ime ha aha ya bụ, onye nyere aha ya dịka Alice kwuru na oge agaala oge ha na-ana $5 maka abalị niile, ma kọwaa na ha na-anabatazị ọbụladị $1 ugbua maọbụ ihe oriri n'ọnọdụ ego, iji nwee ike kpatara ụmụ ha nri, maka na agụụ dịzị n'obodo ugbua.

Onye ashawo ahụ gwara ndị ntaakụkọ na ọ na-agba ashawo n’ihi na ọ ga-elekọta ezinụlọ ya na ụmụ ya atọ anya. O kwuru na otu n’ime ụmụ ya nke nọ n’ogoogo nke anọ (Form 4) ugbua chọrọ ego iji debanye aha ya maka ile ule 'Zimbabwe Schools Examination Council' (ZIMSEC), ebe ụmụ ya ndị ọzọ nọ n’ogoogo Greedi 7 na Greedi 1 ugbua n'otu n'otu.

Ọ gara n’ihu kwuo na ka ọ dị ugbua, na ọ na-anabatazị ọbụladị otu bọkeeti ọkà maọbụ iko àgwà olenaole dịka ụgwọọrụ ya ma ọ bụrụ na nwoke richa ya ọkọmbọ, ka ụmụ ya na ezinulọ ya wee hụgodi nke bụ nri rie.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484