Akuko ifo: "Egbe na mbe"

Jan 18, 2013 - 06:00
Jan 22, 2021 - 06:48
 0
Akuko ifo: "Egbe na mbe"

Abraham Madu, USA

Egbe lechasịrị mbe buru ya. Ka egbe na-aga n’ụlọ ya dị n’elu ọjị, mbe were jụa egbe, ọ bụ gịnị ka ya mere o ji enye ya ụdị onyinye ọma ife efe? Egbe zara ya sị na ya anaghị enye ya onyinye ọbụla, kama na ya na-eburu ya ka ya na ụmụ ya were anụ ya gba azị.

Mbediogụ agwa ya sị n’ọ bụrụ na ọ bụ ihe o bu n’obi, ka o bughachi ya azụ ka ya ga weta mkpụrụ obi ya na umeji ya maka na ọ bụ ha na atọkarịcha ụtọ. Egbe atụgharịa, buru mbekwu laghachi n’ụlọ ya.

Mgbe ha rutara, mbadiọgụ, abọkasịba ala n’obi ya. Egbe jụrụ ya sị, ọ bụ gịnị ka ị na-eme ịbọkasị ala? Mbediọgụ zara ya sị na ọ bụrụ na ụmụ nna ya nụrụ na egbe bịara buru ya. Na emeghị ihe ọzọ, ha ga ahụ ka mụ bọkasịchara ala. Nke a ga-eme ka ha mata na a nwụghị dimkpa ka ọkụkọ pụa.

Ha ga-ahụ na mụ gbakarịkwara ala ịzọ onwe mụ tupu egbe eburu mụ.

O yoyoyoyo Egbe eburula Mba o yoyo!

O yoyoyoyo Egbe eburula Mba O yoyo!

Igbo kwenu!

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.