Akụkọ Ifo: Ihe Mere Na Ezi Enweghị Mpi

Nov 28, 2021 - 22:39
 0
Akụkọ Ifo: Ihe Mere Na Ezi Enweghị Mpi

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ifo shàkpii...

Wọ́ọ̀...

Ifo shàkpii...

Wọ́ọ̀...

Nkịta nyàrá àkpà...

Nsị agwụ n'ọhịa...

Obuisi nyara àkpà...

Akara agwụ n'ahịa...

Ọ nwere akụkọ m ga-akọrọ ụnụ

Kọọrọ anyị ka obi dị anyị mma...

***********************************
ISIOKWU:

Isiokwu akụkọ m taa bụ Ihe Mere Na Ezi Anaghị Epu Mpì.

Malite n'okike ụwa, anụmanụ a na-akpọ ezi nwere mpì.

Kaosiladị, o ji mpì ya ahụ wee na-alụso ụmụanụmanụ ibe ya (ndị enweghị mpì) ọgụ oge niile ma werekwa ya na-akpa ike dị egwu.

Ịchọ okwu a na akpramagwa mmegide ahụ ezi na-akpa bidoro webe ụmụanụmanụ ndị ọzọ iwe; mana o nweghị ihe ha pụrụ ime. Ha gaa nzukọ, ezi agaghị ekwe ka anụmanụ ọzọ tinye ọnụ n'okwu, onye mee pịm maọbu gbaghaa okwu ya, o bido ọgụ ozigbo, ma jiri mpì ghasàsịa ihe niile a na-eme ebe ahụ.

Ihe ndị a niile na-eme; mana ọ ruru otu ụbọchị, nke ka nke wee mee. Ụbọchị ahụ, nkịta nọ na mmiri na-ańụ mmiri, ezi gbadata na mmiri wee sị nkịta pụọ ebe ahụ ka ya onwe ya ńụọ mmiri. 

Nkịta gwara ezi na ya ańụchàbèghị̀ mmiri, n'ihi na afọ ejubèghị̀ ya. Ya mere, ọ jụrụ na ọ gaghị apụta na mmiri ahụ ruo mgbe ọ nụ̀juru afọ.

Oge nkịta kwuchara nke a, ọ malitekwara ńụba mmiri; ezi wee jiri oké iwe makwasa ya n’ike dị egwu, ma were mpi ya merụchaa ya ahụ. Ọ fọrọ obere ka nkịta nwụọ ụbọchị ahụ n'ihi ihe ezi mere ya.

Oge ha nụrụ ya, ihe ahụ ezi mere nkịta enyeghị ụmụanụmanụ ndị ọzọ ọnụ okwu. N'ihi nke a, ha nọrọ nzukọ na nzuzo, n'emeghị ka ezi mara. Ha nọrọ na nzukọ ahụ wee kpebie ma kwekọrịta na ézè ha bụ mbe ga-aga na be chi okike kere ha gwa ya ka ọ napụ ezi mpi o nyere ya, n’ihi na a hapụ ya ka o jiri aka ahụ na-aga, ị mara na ọ ga-egbucha ụmụmanụ niile otu ụbọchị. Mbe nabatara okwu ha, wee debe aghụghọ e jiri mara ya n'otu akụkụ, n'ihi na nke ahụ soro metụta ya.

N'ọnụ ụtụtụ echi ya, mbe zọpụrụ ụkwụ ije, wee gaa na nke chi okike. Mgbe ọ garuru, ọ kọwaara ya ihe niile ezi na-eme na ihe ụmụanụmanụ chọrọ ka o mee. 

Ka ọ nụchara mkpesa ahụ, chi okike kwetere ime ihe ụmụanụmanụ rịọrọ ya; o wee napụ ezi mpi ya ozigbo, ma mee ka ntị ya nọrọzie n'ọnọdụ̀ ebe ahụ mpi ya dịbụ n'isi ya, ka owee jiri ya na-anụ ihe ngwangwa. Ọ bụ etu ahụ ka ezi si wee bụrụ anụ enweghị mpi, wee ruo taa. Ọ bụkwa ya mere na ị hụzie ezi taa, ntị ya akpalisie elu, dịka a ga-asị na ọ bụ mpi.

IHE MMỤTA: Onye ejila ihe o nwere wee megide maọbu mekpàá mmadụ ibe ya ahụ, maka na chi nyere ya ihe ndị ahụ pụkwàrà ịnakọrọsị e n'otu ntabianya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484