Akụkọ Ifo: Nwagbọghọ Na Nkịta Eze

Aug 31, 2021 - 22:33
 0
Akụkọ Ifo: Nwagbọghọ Na Nkịta Eze

Chinwendu Uzoatu dere akụkọ ifo a

OTU eze na-achị obodo gwara onye ozi ya ka ọ kụọ ekwe, gwa ọha obodo na y a chọrọ ịlụ nwanyị ọhụrụ. Onye eze a bụ ezigbo onye ọchịchị nke nwere ihe akụ aku na ihe enwe enwe. Ihe  ụwa bụ atụrụ taba n’obi ya. Ndị obodo ọ na-achị hụkwara ya n’anya nke ukwu. Mgbe a kụrụ ekwe ma makwaa ọkwa na eze ga-alụ nwanyị ọhụrụ, ndị obodo a tụrụ ụzụ ma nwekwaa nnukwu ọnụ. Nke a mere na e wepụtara otu ụbọchị nke ụmụagbọghọ nile nọ n’obodo ahụ ga-abịa gbaa egwu n’obi eze ka eze wee họrọ onye masiri ya.

  Nne na nna bidoro kwadowe ụmụ ha ndị agbọghọbịa n’ike n’ike. E nyere ha otu onwa I ji mee nke a. E bidoro nyewe ụmụagbọghọbịa ezigbo nri nke juputara n’anụ na azụ, ka ahụ ha wee maa poko poko.

  E bidokwara tebe ha uhie na ihe ndị ọzọ dị iche iche e ji achọ anụ ahụ mma. Ụfọdụ nne na nna kwụsịrị ụmụagbọghọbịa ha ije ozi ọbụna.

  Ka a na-eme nke a, o nwere otu nwa enwe nne enwe nna, nke nọ n’otu ezinaụlọ. Sọ nwagbọghọ a ka nne nna ya mụtara tupu ha nwụọ. Umunne nna ya leghaara ya anya, o wee na-ata ahụhụ na-akpa ogbenye. Mgbe ọ chọpụtara ihe a nke na-akpọtụ n’obodo, ọ gụrụ ya agụụ isoro ụmụagbọghọ ibe ya gaa gbaa egwu n’obi eze ma onye ka ọ bụkwanụ? Onye ga-akwado ya? Nke a mere ka ọ kwaa akwa ma hichaa anya. Nwata nwagbọghọ a mara mma ma nwekwaa ezigbo agwa. O toro ogologo, kwụrụ ekeresu.

  Mgbe ụbọchị a kara aka ruru, ndị ọbụna kwadochara umuagbọghọ ha, dee ha uri, kpaa ha ọtanjele, kpaa ha isi ma chọọ ha mma dị iche iche kpọrọ ha gawa n’obi eze.

  N’ezinaụlọ nwa enwe nne enwe nna a, ndị ụlọ ha kwadochara ụmụagbọghọ ha ma kpọrọ ha gawa n’obi eze, o nweghị onye tụpụụrụ ya ọnụ; ihe ndị a nile wutere ya nke ukwu. Mgbe e ruru n’obi eze, eze na ndụ ọchịchị ya nọ, ọha obodo wee ju, nkwa wee na-ada n’elu na-ada n’ala, obodo wee dị egwu. Ụmụagbọghọ malitere pụtawa n’otu n’otu na-agba egwu.

  Mgbe nwagbọghọ a e nweghị nne na nna nọkatara n’ụlọ na-anụ ụzụ na-atụ n’obi eze ,o wee gawa ka o lere anya. Mgbe ọ na-aga, ọ pụtara n’otu mmiri ọ ga-esi gafee wee gawa  wee hụ otu nwanyị nọ n’akụkụ mmiri kelee ya. Nwanyị ahụ jụrụ ya ebe ọ na-aga, o wee kọwara ya na ọ na-aga ilere anya n’obi eze.

Ọ maghị na nwanyị ahụ bụ nne ya n’ihi na nne ya nwụrụ mgbe ọ dị na nwata. Nwanyị ahụ kpọrọ ya saa ya ahụ na mmiri ahụ, kpaa ya isi, chọọ ya mma dị egwu, yinye ya jigida ma duru ya gawa. Mgbe ha ruru,ọ gwara ya bawa n’obi wee laghachi azụ. Nwagbọghọ ahụ kwụrụ n’ọnụ ama eze n’ihi na egwu na-atụ ya.

Ọ fọdụrụ ụmụagbọghọ ole na ole ka egwu kwụsị n’obi eze, o nwebeghi onye eze họtara. Ka a na-eme, nkịta eze pụtara n’ọnụ ama eze wee hụ nwagbọghọ a wee ńụrịa, gbara gaa n’ihu eze na-efegharị ọdụ ya. Nkịta a bụ nkịta eze zụrụ nke ọma.Ozugbo eze matara na onwere ihe ọ chọrọ I gosi ya, o wee soro nkịta ya pụwa. Ka ha rutere n’ọnụ ụzọ ama, nkita a gara n’ebe nwagbọghọ a nọ wee na-ańụri na-efegharị ọdọ ya.

  Ozugbo eze hụrụ nwagbọghọ a, akpataoyi wụrụ ya, o wee gaa makụọ ya, kpọrọ ya bata n’obi. Ndị obodo hụrụ nwagbọghọ a wee tie mkpu. Onye eze ahụ nyere iwu ka egwu kwụsi; ọ gwara ha na ya ahụla onye ya ga-alụ. Nke a juru  ndị mmadụ anya n’ihi na ha amaghị onye nwagbọghọ ahụ bụ. Ọ bụladị ndị ezinaụlọ ya amataghị onye ọ bụ.

  Eze mechara jụọ ya onye ọ bụ, o wee kọwaa onwe ya site n’ịkpọ aha nne na nna ya. Ụzụ wee tụọ n’obi eze. Oriri na ọńụnụ wee biri ọkụ n’ihi na eze a lụọna nwanyị ọhụrụ. Otu a ka nwagbọghọ a bụ e nwe nne, e nwe nna si bụrụ nwunye eze.

  Ihe mmụta: Imegbu mmadụ adịghị mma.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484