Akụkọ Ifo: Nwata Ghọrọ Eke

Nov 25, 2021 - 22:43
 0
Akụkọ Ifo: Nwata Ghọrọ Eke

Izunna Okafor dere akụkọ a

Na mgbe gboo, o nwere otu di na nwunye biri ọtụtụ afọ, mana ha atụghị atụ ma ya fọdụzie ịmụ amụ. Ka nke a bịara nyekarịa ha nsogbu, ha mere ka ha gaa na nke dibịa ukwu na nke nta ebe ha na-achọ mkpụrụ nke afọ.

Ọtụtụ afọ gara, ma ekwe akụtaghị onye ala ji. Mana n’ikpe azụ, nwa bere n’ụlọ ha.

Nke a wetere oke ọńụ maka na nwa bụ ihe a na-achọ achọ ma bụrụ ihe ikele Chineke.

Ha bidoro zụba nwa nwoke a n’ike n’ike. Nwata a malitekwara na-ebu ma na-eto. Mgbe oge ruru na nwata a ga-anọ ọdụ, ọ nọghị, mgbe o rukwara ịga ije, ọ gaghị, nke pụtara na ọ na edina ala n’ute mgbe ọbụla.

Ọnọdụ dị otu a bidoro tụba di na nwunye a egwu. Ha malitekwara gaba na nke ndị dibịa, mana okwu enweghị isi.

Oge ọbụla ha gaa ọrụ, ha na-esi nri nye nwata ahụ, ha richaa nke ha, ha eburu nke ha ga-eri ma ha lọta ọrụ dobe n’elu uko wee pụọ. Ha na-ahapụkwa nwa ha nwoke n’ute ebe o dina ala wee gaba ọrụ.

Mgbe ha rụchaa ọrụ lọta, ha butuo nri ha dobere n’uko, ha ahụ na e richaala nri ahụ. Nke a na-agbagwoju ha anya maka na ovnweghị onye batara n’ụlọ ha ebe ha kpochiri ya nke ọma.

Ihe a bidoro na-eme ụbọchị niile nke mere na ha amaghị ihe ha ga-eme.

Ka ha nọ n’ọnọdu mgbagwojuanya a, otu anụ a na-akpọ Nwaraghamgbama gwara nwaanyị ahụ nwe ụlọ na ya ma ihe na-esogbu ya ma marakwa mgbe ihe niile ahụ na-eme n’ụlọ ahụ na etu o si eme.

Nwaanyị ahu rịọrọ ya ka ọ kọọrọ ya, mama Aragha gwara ya ka o siere ya ji mmanụ, na ọ buru na ya richaa ya, na ya ga-akọrọ ya. Nwaanyị ahụ siiri Aragha ji mmanụ ozigbo. Mgbe o richara ya, ọ gwara nwanyị ahụ na ọ bụ nwa ya ahụ na-eri nri ha dobere n’elu ụkọ ma ha pụọ.

Nke a gbagwojuru nwanyị a anya, o wee jụọ ya uzo o si eme nke a, maka na ọ mà na nwata ahụ anaghị akwụ ọtọ, ka ya fọdụzie ịga ije. Aragha gwara ya na nwata ahụ na-aghọrọ eke rigoro n’elu uko, richapụ nri niile ahụ ma ridatakwa ghọrọkwa nwata, dinara ala.

Nke a juru nwanyị a anya, o wee kọọrọ di ya. Aragha gwakwara ha na ha chọọ ịma ma ihe ọ na-ekwu ọ bụ eziokwu, ha pụọ ọrụ otu ụbọchị, ha laghachi azụ ma si na mgbawara aja nyòó ka ha hụ odum na ihe o dudu.

Nke a mere na di na nwunye a kwadochara ọrụ otu ụbọchị pụọ, ma laghachikwa azụ ozigbo, ga zoo n’azụ ụlọ ha, ma si na mgbawara aja na-enyo ka ha mara ihe ga-eme. Mgbe a nọkatara, nwata ahụ ghọrọ nnukwu eke rigoro elu uko, richapụ nri ahụ ma rịdatakwa ghọrọ nwata, dinarakwa ala n’ute.

Nnukwu egwu tụrụ di na nwunye a, nke mere na nke nwaanyị chọrọ iti mkpu na ịgba ọso, mana di ya jidesiri ya ike. Mgbe nke a mechara, ha gbapụrụ ọsọ gawa na nke dibịa afa. Dibịa afa gwara ha na nwata ahụ abụghị mmadụ, na ọ bụ eke. Ọ gwara ha ka ha kuru ya gaa n’akụkụ ekwe mkpu hapụ ya. Di na nwunye a lọtara kuru nwa ahu gaa n’ọma agụ kusa ya n’akụkụ ekwe mkpu dịka e si gwa ha.

Ha gara n’ebe tere aka na-ele anya ka ha mara ihe ga-emenụ. Ozigbo, nwata ahụ ghọrọ nnukwu eke rịba na mkpu.

Ihe mmụta: mmadụ kwesịrị ịkpachapụ anya n'ụdị ebe ọ na-aga achọ ihe, ọkachasị mgbe ọ nọ na mkpa, iji gbochie ịkwa ngarammara n'oge ikpeazụ.

Onye a gwara kwe, a hụ ọzọ, a gwakwa ya; mana onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484