Ala Naijiria ga-ahazigharị ngalaba njem ụgbọelu

Mar 16, 2015 - 00:46
Jan 22, 2021 - 06:51
 0
Ala Naijiria ga-ahazigharị ngalaba njem ụgbọelu

Gọọmenti ala Naịjiriịa ekwuona na ya na-agba mbọ ịrụtọpụ ọrụ niile ya ji n’aka ugbu a maka ịhazigharị ngalaba njem ụgbọelu. Onye minista na-ahụ maka njem ụgbọelu, Osita Chidoka, gwara ndị nta akụkọ na ngalaba njem ụgbọelu na-ahọrọzi ọlụ ndị kachasị mkpa n’ime ọlụ niile dịịrị ya.

Gọọmenti ala Naịjiriịa ekwuona na ya na-agba mbọ ịrụtọpụ ọrụ niile ya ji n’aka ugbu a maka ịhazigharị ngalaba njem ụgbọelu. Onye minista na-ahụ maka njem ụgbọelu, Osita Chidoka, gwara ndị nta akụkọ na ngalaba njem ụgbọelu na-ahọrọzi ọlụ ndị kachasị mkpa n’ime ọlụ niile dịịrị ya. Nke a bụ maka n’ego mmawapụta na-abịa na ngalaba ahụ gbadara agbada kemgbe ọnụ ego mmanụ akụ chi nyere dara.

Chidoka kpọrọ ndị isi ọlụ, ndị ọ bụ ọlụ ha ịkenye ọlụ ngo, ka ha tinye anya n’ọlụ ndị kachasị mkpa, tụmadị ọlụ ndị ahụ a na-akwadozi ịrụtọpụ arụtọpụ.

Chidoka kwụrụ n’ọ bụ ịhe nwute na gọọmenti etinyeghị anya na ngalaba ahụ kemgbe afọ ole n’ole. O kwuru n’ọ ga-ewe ịhe ruru ijeri naịra 50 maka ịhazigharị ngalaba ahụ site ugbu a ruo afọ 28 na-abịa abịa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.