Alaomajijiji egbuole otutu mmadu na Japan

Alaomajijiji egbuole otutu mmadu na Japan

Alaomajijiji egbuole otutu mmadu na Japan

A na-achọ puku kwuru puku ndị mmadụ achọ na Japan kemgbe mba ahụ nwere oke ala ọma jijiji nke ndị ọka mmụta tinyere na 8.9 n’ogo mgbakọ ala ọma jijiji n’ụbọchị Fraịdee.

A na-achọ puku kwuru puku ndị mmadụ achọ na Japan kemgbe mba ahụ nwere oke ala ọma jijiji nke ndị ọka mmụta tinyere na 8.9 n’ogo mgbakọ ala ọma jijiji n’ụbọchị Fraịdee.

Ala ọma jijiji ahụ kpalitere ide mmiri sụnami, bu nke nyekwuru aka n’imebi ụlọ, akụ n’ụba, yana igbu ndị mmadụ. Ozi anyị nwetere na-akọwa na narị mmadụ asaa anwụọla. Ọnụ ọgụ ndị tufuru ndụ ha n’ihe mberede a ka ga-agbago.

Ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ ahụ na-mpaghara Japan ebe ala ọma jijiji a metụtara. N’ọ dị n’ihu, anyị ga-nwete ọnụ ọgụ ndị nwụrụ anwụ, ndị merụrụ ahụ, yana ọnụ ego akụ n’ụba ala ọma jijiji a mebiri.