Anambra 2021: APGA Ahọpụta Soludo Dịka Onye Ga-Eji Aha Ya Zọọ Ọkwa Gọvanọ

Jun 24, 2021 - 12:16
Jun 24, 2021 - 12:17
 0
Anambra 2021: APGA Ahọpụta Soludo Dịka Onye Ga-Eji Aha Ya Zọọ Ọkwa Gọvanọ

.

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Grand Alliance (APGA) na steeti Anambra nọrọ ụbọchị Wenezdee wee họpụta nwa amadi ahụ jibụrụ ọkwa dịka onyeisi ụlọakụ ala Nigeria (Central Bank of Nigeria, CBN), bụ Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo dịka onye ga-eji aha ya bụ otu ndọrọndọrọ wee zọọ ọkwa gọvanọ steeti Anambra na nhọpụta ahụ a ga-eme na steeti ahụ.

Nhọpụta ahụ a họpụtara Ọkammụta Soludo bụ nke e mere na nhọpụta ime ụlọ otu ndọrọ ndọrọ APGA, bụ nke weere ọnọdụ n'ogige 'Dora Akunyili Women Development Centre' dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ sonyèrè na ya, tinyere aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ; Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Uche Okafor, na ọtụtụ ndị ọzọ.

Dịka mpụtàrà ya bụ ịtụ akwụkwọ siri kọwaa, ndị ọzọ dị iche iche soro wee zọọ nkwàdo na ikike ahụ nwètàkwàrà ụfọdụ nkwàdo olenaole, mana nke Ọkammụta Soludo kacha n'ọnụọgụgụ, bụzị nke nyere ya mmeri ahụ.

N'im ndị ahụ soro wee zọọ ya bụ nkwàdo, ThankGod Ibeh nwètàrà nkwàdo dị anọ (4) n'ọnụọgụgụ, wee gbaa onye nke anọ; Maazị Damian Okolo nwètara nkwàdo dị asaa (7) n'ọnụọgụgụ, wee gbaa onye nke atọ; Maazị Okwudili Ezenwankwo nwètàrà nkwàdo dị iri anọ na ótù (41) n'ọnụọgụgụ, wee gbaa onye nke abụọ; ebe Ọkammụta Soludo nwètàrà nkwàdo dị narị asaa na iri anọ (740) n'ọnụọgụgụ, wee gbaa onye nke mbụ.

N'okwu ya oge ọ na-akpọpụta mpụtàrà nhọpụta ime ụlọ ahụ ahụ, onye ji ọkwa 'Chief Returning Officer of the APGA governorship Electoral Committee Panel', bụ Deacon Samson Olalere mèrè ka a mara na ọnụọgụgụ mmadụ ndị a tụrụ anya na ha ga-eso wee tụọ akwụkwọ na nhọpụta ime ụlọ ahụ dị narị asatọ na iri na abụọ (812), bụ ndị nnọchianya òtù ndọrọ ndọrọ ahụ sitere wọọdụ narị atọ na iri abụọ na isii (326) e nwere na steeti Anambra.

Kaosiladị, o mere ka a mara na ọ bụ mmadụ narị asaa na iri iteghete na ise (795) ndị bịara soro debànye aha maka iso wee tụọ ya bụ akwụkwọ, ma kọwakwa na mkpokọta ọnụọgụgụ akwụkwọ a tụtara ebe ahụ ụbọchị ahụ dị narị asaa na iri iteghete na abụọ (792).

Maazị Olalere gara n'ihu kọwaara ndị sonyere n'ịtụ akwụkwọ ahụ na onye ọbụla n'ime ndị ahụ a tụụrụ akwụkwọ pụrụ ịzọ ọkwa gọvanọ ahụ, mana ọ dị mkpa na ha wepụtara otu onye ga-eji aha ya bụ otu ndọrọndọrọ wee zọọ ọkwa ahụ, dịka ọ dị n'akwụkwọ iwu na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị n'ala Nigeria, na usoro e si eme ya bụ nhọpụta.

O kèlèkwàzịrị ndị niile sonyere na ya bụ nhọpụta ime ụlọ maka inwe ndidi ha na ịhụ na e mere ya bụ ihe n'udo na ọñụ; ọbụladị dịka o jizịkwara ikike ya wee kwuwaa ma nye Ọkammụta Soludo asambodo dịka onye ga-eji aha otu ndọrọndọ ahụ wee zọọ ya bụ ọkwa Gọvanọ a ga-azọ na steeti ahụ n'abalị isi nke ọnwa iri na otu ahọ a.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kèlèrè ndị niile sonyere na ya bụ nhọpụta ime ụlọ, ọkachasị n'ihi ndidi na obi umeala ha nwere na etu e siri mee ya bụ nhọpụta n'udo, n'enweghị nsogbu ọbụla.

O kwupụtara olileanya o nwere na otu ndọrọndọrọ APGA ga-enwetekwa mmeri n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu niile e nwere na steeti ahụ na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ na-abịa n'ihu, dịka o mere n'ahọ 2017 oge a họpụtaghàrịrị ya nke ugboro abụọ.

Oge ọ na-ekwepụtànwò mkpebi ya inyefe ọchịchị n'aka onye maara nke ekwe na-akụ, Gọvanọ gara n'ihu kpọkuo ndị otu ndọrọndọrọ APGA na ụmụafọ steeti ahụ n'izugbe, ka ha kwàdo ma tụnyere otu ndọrọndọrọ ahụ na nhọpụta ahụ na-akpụdobe nso n'ike n'ike ugbua, ka APGA wee chịrị gaba.

N'okwu nke ya oge ọ na-anabata asambodo nturuugo ahụ, Ọkammụta Soludo, onye ihu ọchị wara n'ụdị pụrụ iche kèlèrè mmadụ niile sonyere nà ndị chịkọbàrà nhọpụta ahụ maka etu ya bụ ihe siri gaa nà mmeri ahụ o nwetere, ma kọwaa na ọ bụ n'aka Chukwu ka mmeri si abịa.

O kpupuuru ndị gọvanọ chịbụrụ steeti Anambra n'oge mbụ okpu maka ihe dị iche iche ha mepụtara, ma kelee aka na-achị steeti ahụ ugbua, bụ Gọvanọ Obianọ maka ezi ọrụ ya, ọbụladị dịka o kwere nkwà na ọ ga-amalite n'ebe Gọvanọ Obianọ kwụsịrị ma mekwa ihe dara ụda, ma ọ bụrụ gọvanọ.

Ọ kpọpụtasịrị ebe dị iche iche ọ rụgoro ọrụ ma jie ọkwa dị iche iche ma n'oge mbụ ma ugbua, ma mezie ka a mara na ya ekpebiela ịbataru ụlọ bịa jeere steeti ya bụ Anambra ozi ugbua, bụzị nke mere o jiri nabata ma kwete oge ndị mmadụ kpọlitere ya ka ọ bịa zọọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ.

Ọkammụta Soludo kpọkuzịrị ụfọdụ ndị chọbụrụ iji aha otu ndọrọndọrọ APGA wee zọọ ọkwa gọvanọ na steeti ahụ, ma rịọ ha ka ha bịakọta ọnụ, jikọọ aka, ma kwàdo ya ugbua e wepụtagoro ya, iji hụ na APGA nwètèkwàrà mmeri ọzọ dara ụda, na wọọdọ niile dị na steeti ahụ, na nhọpụta ahụ na-abịa n'ihu.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị sonyere na nhọpụta ime ụlọ ahụ, nke gụnyere Sinetọ Victor Umeh nọchibụrụ anya mpaghara ọgbọ nta nkwàdo 'Anambra Central' n'oge mbụ; onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Signage and Advertisement Agency, ANSAA, Maazị Jude Emecheta; onyeisi òtù nkwàdo Soludo a maara dịka 'Youths Earnestly Seek Soludo, YESS', bụ Dọkịta Nelson Omenugha, na ndị ọzọ, kwupụtara obi añụrị ha maka mmeri ahụ Ọkammụta Soludo nwetara, ma kpọkuo Ndị Anambra ka ha kwàdó ya nke ọma ka o wee nweta nturuugo dara ụda na nhọpụta ọkwa ọchịchị gọvanọ ahụ a ga-eme n'ọnwa Nọvemba 6 ahọ a.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484