Anambra 2021: O Nweghị Mgbe M Jiri Koropu Maọbụ Dàá n'Ọnịcha —Ejidike, Onyeisi APC

Nov 9, 2021 - 18:38
Nov 9, 2021 - 18:55
 0
Anambra 2021: O Nweghị Mgbe M Jiri Koropu Maọbụ Dàá n'Ọnịcha —Ejidike, Onyeisi APC

Izunna Okafor dere akụkọ a

.

Igbo sị na ọ na-abụ ịkpọ ngwere emeghị ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ejiri ya mere anụ n'udummiri na n'ọkọchị.

Ka ọ dị taa, onyeisi òtù ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressive Congress (APC) n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Basil Ejidike ekwuola hoohaa na ọ nweghị mgbe ọ jiri koropu maọbu dàá n'Ọnịcha, n'ihi mpụtara nhọpụta ọchịchị ahụ e mere na steeti Anambra ụbọchị Satọdee.

Maazị Ejidike kwupụtara nke a oge ya na ndị ntaakụkọ na-enwe mkparịtaụka n'Awka, bụ isi obodo steeti Anambra, bụkwa ebe ọ nọrọ katọ̀ọ́ọ onyoonyoo ahụ na-efegharị n'ikuku sị na o koropuru oge e meriri otu ndọrọndọrọ ya hụ APC n'ebe ahụ ya onwe ya na-atụ akwụkwọ kpọnkwem, bụ 'PU 002 Bridge Head Market Onitsha'; tinyere akụkọ ndị ọzọ ndị 'ọnọ n'ụlọ mara njọ ahịa' jì aha ya na aha otu ndọrọndọrọ APC were akọ. Ọ kọwara na APC nwètàrà ihe ruru pasentị iri iteghete na ise (95%) nke vootu niile a tụrụ ebe ahụ ọ na-atụ akwụkwọ ụbọchị ahụ; ma jụkwazie ajụjụ ihe ga-eme ya ọ ga-eji koropu mgbe ọ nụrụ mpụtara vootu a tụrụ n'ebe ahụ.

Maazị Ejidike mekwara ka a mara na e nwegasịrị ọtụtụ ozi ndị ọzọ abụghị eziokwu, nke ndị mmadụ kụpụrụ n'aha otu ndọrọndọrọ APC, nke gụnyere ozi na-ekwu na APC na-akpọ òkù ka a kàgbuo mpụtàrà nhọpụ̀ta ọchịchị ahụ, ozi nke na-ekwu na APC na-achọ ịga ụlọikpe maka mpụtàrà nhọpụ̀ta ọchịchị ahụ, ya na ozi nke ahụ ná-ékwú na ya onwe ya koropuru n'Onitsha ụbọchị ahụ a tụrụ akwụkwọ, tinyere ọtụtụ ozi ndị ọzọ na-efegharị n'ikuku.

O kwuru na nwoke ahụ e gosiri na onyonyoo ahụ abụghịdị ya, n'ihi na nwoke ahụ buru ibu, ma nwekwa isi nkwọcha, mana ya onwe ya enweghị isi nkwọcha ma ya fọdụzie ibu ibu, nke na-egosi na ọ bụghị ya dị ihe ahụ maọbụkwànụ nwee ka ya na onye ahụ siri yie.

Ọ gara n'ihu kọwaa na o nweghị mgbe otu ndọrọndọrọ ya bụ APC jiri kwuo ihe ọbụla gbasaara ịga ụlọikpe maọbụ ịgba isi akwara banyere mpụtàrà nhọpụ̀ta ahụ e mere ụbọchị Satọdee, n'ihi na a chịkọ̀tàbèghị̀ ya bụ nhọpụta ọchịchị, tinyekwuoro na ụlọọrụ INEC ekwupụtàbèghị onye ọ bụ ya tuuru ugo na nhọpụta ọchịchị ahụ.

Dịka ọ na-akpọku ọhaneze ka ha leghàrá ozi ndị ahụ anya ma gbakụtakwa ha azụ; ọ dụkwazịrị ndị na-akụpụ ụdị ozi dị etu ahụ iji kpụtọọ aha ya na aha otu ndọrọndọrọ ahụ ka ha sepụ aka n'imē ihe dị etu ahụ ma kwụsịkwa iduhie ndị mmadụ, n'ihi na onye ọbụla aka kpààrà maka nke ahụ ga-abụ onye a ga-eji usoro iwu wee kụziere ihe ọkụ ji ntị oke eme.

Maazị Ejidike gàkwàzịrị n'ihu kwupụta na e nwègàsịrị ụfọdụ ebe mpụtàrà e dere n'akwụkwọ ndị ọrụ ha binyèrè aka dị̀ iche na nke ụlọọrụ INEC mechaara weputa, ya na ụfọdụ ebe ndị ọzọ APC nwetara mmeri dara ụda, mana INEC kàgbùrù mpụtàrà vootu a tụrụ n'ebe ahụ, ma mechaa gaa n'ihu wepụta mpụtara ọzọ dị iche na nke e nwetere n'ebe ahụ.

Iji maa atụ, o kwuru na onye 'Returning Officer' rụrụ ọrụ n'okpuruọchịchị ime obodo 'Orumba North' kwùrù na a tụghị akwụkwọ n'ebe ahụ, mana onye 'Electoral Officer' n'okpuruọchịchị na-ekwu na a tụrụ akwụkwọ n'ebe ahụ. O kwukwara na a kagburu vootu ndị APC ruru puku iri (10,000) n'ọnụọgụgụ n'Abatete, ma gaa n'ihu kpọpụta mpụtara akwụkwọ a tụrụ n'ebe ahụ; ma sịkwa na a tụrụ akwụkwọ naanị na 'polling unit' isii n'ime polling unit iri na asaa e nwere n'Uke, mana INEC gàkwara n'ihu kpọpụta mpụtara vootu a tụrụ ebe ahụ.

Dịka ọ na-akọwa na o wèrè ya ihe ruru nkeji iri na ise tupu ọ tụọ akwụkwọ nke ya ụbọchị ahụ, n'ihi nsogbu akụrụngwa BIVAS e jiri wee mee nhọpụta ahụ, Maazị Ejidike katọ̀kwàrà etu ya bụ akụrụngwa BIVAS siri wee bie nhọpụta ọchịchị ahụ aka ọjọọ ụbọchị ahụ, nke na o mere na ọtụtụ ndị mmadụ atụghị akwụkwọ ụbọchị ahụ, ma mekwa na nhọpụta ahụ agachaghị nke ọma etu o siri kwesi n'ebe dị icheiche.

Ọ kpọkuzịrị ụlọọrụ INEC ka ha lebàrá ihe ndị a niile anya, ma mee ihe kwesiri ekwesi, maka na ọ na-abụ e mee nwata ka e mere ibe ya, obi adị ya mma. 

Igbo sị̀ na ọ na-adịkwa mma oke amala ụma taa àkpà dibịa; ma dibịà amakwala ụma bụọ oke ọnụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484