Anambra Ga-Enwe Ọba Akwụkwọ Dijitalụ Ebe A Ga Na-Enweta Akwụkwọ n'Efu n'Ịntanetị —Adinuba

Dec 1, 2021 - 22:45
 0
Anambra Ga-Enwe Ọba Akwụkwọ Dijitalụ Ebe A Ga Na-Enweta Akwụkwọ n'Efu n'Ịntanetị —Adinuba


Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọọmenti Anambra steeti ekwupụtala atụmatụ ya inwe ọbá akwụkwọ dijitalụ ebe a ga na-enweta akwụkwọ, akwụkwọ akụkọ, na akwụkwọ ọgụgụ ndị ọzọ n'efu n'usoro dijitalụ site na mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ.

Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na na ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma na steeti Anambra bụ Maazị C-Don Adinuba bụ ya kwupụtara nke a ụbọchị Wenezdee oge ọ na-ekwu okwu n'emume ịgbape ọgbakọ òtù jikọtara ndị ọrụ ọba akwụkwọ n'ala Nigeria, bụ 'National Library Association (NLA)', ngalaba steeti Anambra, bụ nke e mere n'ọba akwụkwọ Ọkammụta Kenneth Dike dị n'Awka, bụ isi obodo steeti ahụ.

O tòrò ọrụ na nnukwu ihe dị icheiche ọbá akwụkwọ steeti Anambra na-eme na ọrụ dị icheiche ọ rụgoro n'okpuru ndu Dọkịta Nkechi Udeze; kpọpụtasịa ụfọdụ ihe dị icheiche dara ụda megoro na ngalaba agụmakwụkwọ steeti n'okpuru ndu Gọvanọ Willie Obianọ, ma kwupụtanwòó ezi njikere na mkpebi ṅ gọọmentị steeti ahụ n'ịkwalite agụmakwụkwọ na mmụta na steeti ahụ. Ọ kwuputèkwara na gọọmenti steeti ahụ ga-enye onyeisi ọba akwụkwọ Anambra, bụ Dọkịnta Udeze onyinye nkwanyeùgwù, tinyere mmadụ ndị ọzọ ruru narị anọ na iri ise (450) n'ọnụọgụgụ a ga-enyekwa onyinye nkwanyeugwu n'ọnwa Febụwarị ahọ 2022 maka inye aka n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ n'ịkwàlite aha steeti, bụkwa nke Dọkịta Udeze sòkwà n'otu onye n'ime ha.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, onyeisioche òtù 'Nigerian Library Association' ma bụrụkwa onyeisi ọba akwụkwọ Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze, kọwara ọgbakọ omenahọ a dịka nnukwu ohere maka ndị ọrụ ọba akwụkwọ iji zukọọ ihu na ihu ma kparịta ụka n'ihe metụtara ha na arụmọrụ ha na ọba akwụkwọ ha, iji mee ka ọ kawanye mma.

Mgbe ọ na-akọwa na isiokwu nke mmemme ahụ bụ "Ịrụ Ọrụ n'Usoro Dijitalụ: Inwògharị Ọba Akwụkwọ Maka Ezi Ọrụ Ga-Adịgide" bụ nke a chepụtara nke ọma, o kwuru na ọ dị mkpa ka ọba akwụkwọ ọbụla na-arụsi ọrụ ike, na-adị njikere maka ọdịnihu, ma na-etinyekwa ihe ọhụrụ n'arụmọrụ ha, iji kwalite mmepụta ezi ihe na iji sorokwa n'egwu, ọbụladị ugbua ihe niile na-agbanwèzị kwà ụbọchị ma na-abanyezị n'usoro dijitalụ, n'ihi ọtụtụ uru dị icheiche nke ahụ ga-ewèta.

Onyeisioche na mmemme ahụ, onye bụbụ onyeisi ọba akwụkwọ Anambra, bụ Ọkaiwu Chris Onebunne kọwara ndị ọrụ ọba akwụkwọ dịka ndị bụ isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe ọmụma, na mmụta na mgbasa ozi, ma dụọ ha ọdụ ka ha na-enyekwa aka n'ịkwalite ozi, mmụta na ihe ọmụma oge niile.

N'okwu nke ya, onye ọbịa nyere nkụzi na mmemme ahụ, bụ Ọkammụta Ebele Anyaoku, onye ọ bụ Dọkịta Ada Orakpor gụpụtara nkụzi ya tọsara isiokwu nke mmemme ahụ, kpọpụtasịa ihe a na-atụ anya ya n'aka ọba akwụkwọ n'ụwa dijitalụ, ma kwubie na mgbanwe nke ọba akwụkwọ na mba ụwa n'usoro dijitalụ bụ ọkpụkpọ òkù nyegara ọba akwụkwọ dịgasị n'ala Nigeria inwògharị usoro arụmọrụ ha ka o sorokwa n'ihe a na-eme n'ogoogo mba ụwa.

Na ntụnye ha n'otu n'otu, onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Signage and Advertisment Agency', bụ Maazị Jude Emecheta toro ọba akwụkwọ steeti ahụ maka ọganihu ha nwere n'ime afọ itoolu gara aga o jiri mara ha, ma dụọ ọha na eze ume ka ha na-aga n'ọba akwụkwọ na-agụ akwụkwọ oge niile ma na-esonyesikwa ike n'ihe dị icheiche ọba akwụkwọ ahụ na-eme; ebe onye nnukwu enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe metụtara agụmakwụkwọ n'ogoogo sekọndịrị, bụ Dọkịta Paul Ifeanyi kọwara ọbá akwụkwọ dịka ebe kacha mma mmadụ ịnọ, ma kpọ òkù ka e mee mgbanwe nà nlebàgharị anya n'etu gọọmenti ala Nigeria esighị etinye uchu na ego nke ọma n'ihe gbasaara agụmakwụkwọ.

A nọkwara na mmemme ahụ wee nye onyinye nkwanyeugwu pụrụ iche site n'aka òtù NLA nye onyeisi ụlọọrụ Seahorse, bụ Dọkịta Ebuka Onunkwo, bụ nwa afọ Ihembọsị, onye ọrụ obiebere, nà onye na-atụnye ụtụ nke ukwuu n'ịkwalite agụmakwụkwọ na mmụta.

Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere onye jigodi ọkwa dịka odeakwụkwọ n'ụlọọrụ mgbasaozi steeti ahụ, bụ Maazị Tony Nwaeke;  ndị otu NLA, ngalaba Anambra, bụ Maazị Ralph Nwamefor na Dọkịta Victoria Obianuju Ezejiofor.

Ụmụakwụkwọ 'Kings and Queens Comprehensive Secondary School, Ifite, Awka' nọkwara na mmemme ahụ wee gụọ ma gbaa egwu pụrụ iche.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484