Anambra N'Ọ̀gbụ̀gbà Ahọ Iri Atọ Ya: Lee Ihe I Kwesiri Ị́ma

Anambra N'Ọ̀gbụ̀gbà Ahọ Iri Atọ Ya: Lee Ihe I Kwesiri Ị́ma

Izunna Okafor dere edemede a


Igbo sị na ọha mmụọ na ọha mmadụ na-ama ụbọchị a mụrụ dike, ma sịkwa na ọ na-abụ oke ọkụkọ kwaa akwa, ndị mbụ na ndị ègèdè anụ olu ya.

Ka ọ dị taa, steeti Anambra àgbàala  ahọ iri atọ e jiri kèé ya. Dịka ya bụ steeti na-emerùbe mmemme ncheta ụbọchị e kepụtara ya, ọ dị mkpà ịrụtụ aka n'akụkọ ntọala steeti ahụ nà ụfọdụ ihe pụtakarịchara ìhè banyere steeti.

Anambra, dịka ótù n'ime steeti ise mejuputara mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria, bụ nke e kèrè n'ụbọchị dịkà taa, abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Ọgọstụ n'ahọ otu puku, narị iteghete, iri iteghete na otu (1991). Ọ bụ site n'Anambra Ochie (e kèrè n'ahọ 1976) ka e si wee kewapụta ya bụ steeti na nwanne ya bụ steeti Enugu, site n'aka 'General' Ibrahim Badamasi Babangida, n'oge ọchịchị ndi agha.

Aha a bụ 'Anambra' sitere na mmiri a na-akpọ Ọmambala, bụ nke dịkwa na steeti ahụ ma bụrụkwa nke nwere àkwàmmiri kachasị too ogologo na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala Nigeria niile (ma e wezuga àkwàmmiri Naịjà). Njirimara Anambra n'oge mbụ bụ 'Home For All'; ma ugbua, njirimara ya bụzị 'Light of the Nation', (Ìhè Nke Ala Anyị); ebe Ọka (Awka) bụkwa isi obodo ya.
Anambra nwere ọgbọ nta nkwado Sineetị atọ, ọgbọ nta nkwado ụlọ ọgbakọ nnọchianya etiti dị iri na otu, na ọgbọ nta nkwado ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti dị iri ato n'ọnụọgọgụ. 

Anambra bụ steeti na-ada ụda na mba ụwa, ma bụrụkwa nke nwere okpuru ọchịchị dị iri abụọ na otu na obodo ruru otu narị, iri asaa na asaa n'ọnụọgụgụ, nke gụnyere:

Abagana , Abba, Abacha, Abatete , Achalla, Achịna, Adazi-Anị, Adazi-Enu, Adazi-Nnukwu, Agụkwu, Agụleri, Agụlụ Agụlụezechukwu, Agụlụzigbo, Ajallị, Akpo, Akpụ, Akwaeze, Akwaukwu, Alọr, Amaetiti, Amansea, Amanuke, Amaọkpala, Amawbịa, Amesi, Amichi, Amọrka, Anakụ, Atanị, Awa, Awba-Ofemili, Awgbụ Awka-Etiti, Awkụzụ, Azịa, Azigbo, Ebenator, Ebenebe, Ekwulọbịa, Ekwulumili, Enugwu-Agịdị, Enugwu Agụleri, Enugwu-Ukwu, Ezinifite, Ezinihite, Eziowelle, Ezira, Ichi, Ichida, Ideanị, Ifitedunu, Ifite-Ọgwarị, Ịgbakwụ, Ịgbarịam, Igbedor, Igbo-Ukwu, Ihembọsị, Ihiala, Ikenga, Ịnọma, Iseke, Isuanịọcha, Isulọ, Isuofia, Lilu, Mbọsị, Mgbakwụ, Mmịata Anam, Nando, Nanka, Nawfịa, Nawfịja, Nawgụ, Neni, Ndikeliọnwụ, Ndi-ọkpaleke, Ndiukwuenu, Nibo, Nimo, Nise, Nkpologwu, Nkpọr, Nkwelle-Ezunaka, Nnewi, Nnobi, Nnọkwa, Nsugbe, Nteje, Nzam, Ọba, Obeledu, Obosi, Ogbunike, Ogbunka, Ogidi, Ojoto, Ọkịja, Oko, Okpeze, Ọmasị, Omogho, Ọmọr, Ọra-Eri, Ọraifite, Ọraukwu, Ọrsumoghu, Ọsụmenyi, Owellezukala, Owelle-Olumbanasa, Ọzubụlụ, Ụbụlụisiụzọr, Ufuma, Ụga, Ugbenne, Ugbenu, Uke, Ukpo, Ụkpọr, Ukwalla-Olumbanasa, Ukwulu, Uli , Ụmụanaga, Ụmụawụlụ, Ụmuchu, Ụmụdiọka, Ụmụeje, Ụmụerum, Ụmụeze Anam, Ụmụọba Anam, Ụmụleri, Ụmụmbo, Ụmụnachi, Ụmụnya, Ụmụnze, Ụmụoji , Ụmụọmaku, Ụmụọna, Unubi, Ụtụh, tinyere ndi ọzọ. Obodo ndị a nwegasịkwara ọrụ aka na ihe omume dị iche iche e jiri mara ha.

Obodo ndi kacha wee mepee emepee na steeti ahụ ma bụrụkwa ndi a ka anụ aha ha n'ogogo mba ụwa, gụnyere: Ọka (Awka) bụ isi obodo steeti ahụ, Nnewi na Ọnịtsha, ebe Ọnịtsha nwere ahịa kacha wee buo ibu na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka.

Anambra azụpụtala ọtụtụ nnukwu mmadụ, ndị a maara aha ha na ndi aha ha na-ada ụda nke ukwu na mba ụwa. Ụfọdụ n'ime ndị a gụnyere: Dọkịnta Nnamdị Azikiwe, Ọkammụta Chinụa Achebe, Dọkịnta Alex Ekwueme, Dim Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu, Dọkịnta Chuba Ọkadịgbo, Nwafor Orizu, Emeka Anyaọkụ, Cyprian Ekwensi, Philips Emeagwalị, Ọkammụta Dọra Akụnyili, Ọkammụta Chike Obi, Ọkammụta Humphrey Nwosu, Ọkammụta Kenneth Dike, Ọkammụta Charles Soludo, Ọkammụta Ben Enwọnwụ, Ọkammụta Samuel Okoye, Jerome Udọjị, Chimamanda Ngọzị Adịchie, 'Cardinal' Francis Arịnze, Louis Ọdụmegwu Ojukwu, Osita Ọsadebe, Oliver De Coque, Chuka Ụmụnna, Mikel Obi na ọtụtụ ndi ọzọ.

Steeti Anambra enweela ndi ọchịchị dị iche iche malite na mgbe e kere ya wee ruo ụbọchị taa. Malite n'ahọ 1991 e kèrè ya, ndi chigoro Anambra, nà mgbe ha bànyèrè n'ọkwa gụnyèrè: Joseph Abulu (Ọgọstụ 27, 1991); Gọvanọ Chukwuemeka Ezeife (Jenụwarị 2, 1992); Dabo Aliyu  (Nọvemba 1993); Mike Attah (Disemba 9, 1993); Rufai Garba  (Ọgọstụ 21, 1996); Emmanuel Ụkaegbu (Ọgọstụ 6, 1998); Gọvanọ Chinwoke Mbadịnuju (Mee 29, 1999); Gọvanọ Chris Ngige (Mee 29, 2003); Gọvanọ Peter Obi (Maachị 17, 2006); Gọvanọ Virginia Etiaba (Nọvemba 3, 2006); Gọvanọ Peter Obi Governor (Febụwarị 9, 2007)

Gọvanọ Willie Obiano bụzịkwa aka na-achị steeti ahụ ugbua, ma bụrụkwa onye banyere n'ọkwa ọchịchị àgbà nke mbụ ya n'abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị (17th March) ahọ puku abụọ na iri na anọ (2014); chịchaa, ma banye n'ọkwa ọchịchị àgbà nke abụọ ya n'abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị (17th March) ahọ puku abụọ na iri na asatọ (2018), dịka o tùùrù ugo n'okpuru ọchịchị iri abụọ na otu dị na steeti ahụ na ntụliaka e mere. Ọ bụkwa nwoke na-eti ịgba dara ụda ma na-ewetakwa nnwògharị pụrụ iche na ngalaba niile nke steeti ahụ kemgbe ọ banyere n'ọkwa.

Steeti Anambra bụ steeti a kachara nwee ezi ọnọdụ obibindụ n'ala Nigeria ma bụrụkwa ebe ọnọdụ ụbịam dịkarichara ala, dịka mpụtara e wepụtara na nsonso a site n'aka ụlọọrụ Nigerian Bureau of Statistics (NBS)' siri kọwaa. Ọ bụzị steeti kacha eme nke ọma n'ala Nigeria n'ebe agụmakwụkwọ na ule dị iche iche dị. 

Anambra bụ steeti kacha nwee ezi ọnọdụ nchekwa nà udo n'ala Nigeria, ma bụrụkwa ebe a na-emepụta ihe mmepụta na ihe oriri dị iche iche a na-ebusa n'ala Naịjiria nà ná mba ofesi.

Ụmụafọ steeti ahụ nọgasị n'ebe dị iche iche ka a na-emezịkwa ka ha mara na mmepe dị ukwu abatálá na steeti ahụ, ma na-adụzịkwa ha ka ha zaa òkù Akụ Ruo Ụlọ ahụ Gọvanọ Obianọ na-akpọ, bàtá, mà wunye akụnụba ha na steeti Anambra, maka na ọ na-abụ akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya. Ọ na-dịkwa mma isi n'ụlọ dịrị mma wee pụba ama. Steeti Anambra bụ ìhè nke ala anyị n'ezie.

Dịka Anambra na-eme ọgbụgbà ahọ iri atọ ya taa, ka ọ̀gànihu, udo nà ezi ọnọdụ mmepe tọrọ àtọ̀ gaa n'ihu ịbụrụ ihe nketa ya.

Ogologo ndụ Ndị Anambra !
Ogologo ndụ ụmụ Igbo !!
Ogologo ndụ ala Naịjiria !!!

Obi añụrị, ná ncheta ọgbụgba ahọ iri atọ gị, steeti Anambra.