Anambra: Ụlọ Etigbuola Nwaanyị Mụrụ Nwa Ọhụụ n'Obosi

Sep 24, 2020 - 22:06
Jan 24, 2021 - 22:07
 0
Anambra: Ụlọ Etigbuola Nwaanyị Mụrụ Nwa Ọhụụ n'Obosi

Gọọmenti Anambra Ekpebie Ịkụtù Ụlọ Ahụ

Si n'aka Izunna Okafor

Anyammiri gbàrà ka ijummiri na nsonso a, dịka akụkụ otu nnukwu ụlọelu dàrà wee tigbuo otu nwaanyị mụrụ nwa ọhụụ n'Obosi, dị n'okpuru ọchịchị ime obodo 'Idemili North' nke steeti Anambra. Ya bụ ụlọ merụkwara ụfọdụ ndị mmadụ ahụ n'otu oge ahụ ọ dara. Mana, dịka amara Chineke siri dị, o nweghị ihe ọbụla mere ụmụaka ha, nke otu n'ime ha bụ nwa a mụrụ ọhụụ, dị naanị ọnwa isii.

Nwaanyị ahụ ụlọ ahụ tigburu ka e kwuru na ọ gbàrà ahọ iri anọ, ma bụrụkwa onye na na-echebe nwa ara. E bukwara ya wee gaa ụlọ ahụike dị nso ebe ahụ ozigbo ozigbo a dọpụtachara ya, mana dọkịta lelechaara ya ahụ, wee kwuo na ụkwà a na-apị, nà mkpụrụ adịghị ya —nke pụtara na ya bụ nwaanyị alaala mmụọ.

Ka ọ dị taa, gọọmenti steeti Anambra ekpebiela ma kwuwaa na ọ ga-akụtù ụlọ ahụ tigburu ya bụ nwaanyị, maka na o teela aka o jiri maba ọkwà ma na-adọ aka na ntị megide ụlọ ọdịda (n'ụdị ọbụla) n'ime steeti ahụ.

Mkpebi ịkụtù ụlọ ahụ bụ nke e kwupụtàrà site n'ọnụ Maazị Chike Maduekwe, bụ onyeisi ụlọọrụ 'Anambra State Physical Planning Board (ANSPPB)', n'okwu ya banyere ya bụ ụlọ.

O mere ka a mara na nke ahụ bụ ụlọ a rụchaghị arụcha, bụkwa nke nọọrọla ihe karịrị ahọ iri anọ. Ọ dọrọ ọhaneze aka na ntị ka ha na-elekọta ma na-eleru ụlọ ha anya nke ọma na mgbe nà etu kwesiri ekwesi. Ọ gwakwara ndị na-arụ ihe ka ha buru ụzọ na-enweta nkwàdo gọọmenti tupuu ha amalite ịrụ ihe ọbụla, ma gwakwa onye ọbụla ka ọ kwụsị ileghàrà ụlọ ya anya (ọkachasị ụlọ a rụghachị arụcha) ruo ogologo oge, n'ihi na ọ bụ nke ahụ na-ebute ụdị ihe ọdachi dị etu ahụ.

O mere ka a mara na e belatala ọnụọgụgụ ụlọ ọdịda na steeti ahụ, nke na o tètụla a nụdobere akụkọ ya, ma kwekwazie nkwà na ụlọọrụ ahụ agaghị ada mbà n'ibu agha megide nke ahụ, wee ruo mgbe a nụdobèrè ya kpamkpam.

Ọ gara n'ihu kwuo na ha ekechiela ụlọ ahụ eriri, ma kàá ya akàrà nkụtù; nke pụtara na a ga-akụtu ya oge adịghị anya, dịka ọ dị na mkpebi ha mèrè banyere ụlọ ọbụla dara àdà na steeti ahụ. Ọ sịkwa na onye nwe ụlọ ahụ bi na Lagos, mana ha eziela ozi kpọọ ya ka ọ bịa zaa ụfọdụ ajụjụ, nke mgbe e mechààrà ya, a kụọ ya bụ ụlọ jàà-jàà.

Maazị Maduekwe kasìzịrị ezinụlọ nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ obi, ma kpee ka Chineke nye mkpụrụobi ya ezumike udo.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.