ANSAA Amalitela Ịkụtùsi Ihe Mgbasa Ozi Azụmahịa Iwu Akwadóghị Na Nnewi

Jun 10, 2020 - 15:58
Jan 26, 2021 - 15:58
 0
ANSAA Amalitela Ịkụtùsi Ihe Mgbasa Ozi Azụmahịa Iwu Akwadóghị Na Nnewi

By Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ịgbasa ozi azụmahịa na steeti Anambra, bụ ụlọọrụ 'Anambra State Signage and Advertisement Agency (ANSAA)' amalitela ịkụtùsì ihe mgbasa ozi azụmahịa (bụ 'Billboard') e tinyesiri n'ebe iwu akwadoghị, ndị tara nchara, na dị nke mebisiri emebi na Nnewi, dị n'okpuru ọchịchị Nnewi North.

Dịka onyeisi ụlọọrụ ANSAA, bụ Maazị Jude Emecheta siri kọwaa, ọrụ ịkụtusi ihe ndị ahụ bụ nke e megoro n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ na mgbe gara aga, ma bụrụkwa nke a ga-emekwa na mpaghara ebe ndị ọzọ dị iche iche na steeti ahụ, nke gụnyere Ekwulobịa, Ọnịtsha na ụfọdụ ebe ndị ọzọ.

N'okwu ya bànyere nke ahụ, onye duru ndị ahụ wee bagide n'ọrụ ahụ, bụ Maazị Chijioke Agbanyim kpọkùrù ma dụọ ndị Anambra ka ha gba mbọ na-enweta nkwàdo site n'aka ụlọọrụ ANSAA tupu ha amalite itinye maọbụ iguzobe ụdị ihe mgbasa ozi azụmahịa ọbụla nna mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ.

Ọ katọrọ etu ụfọdụ si etinye nke ha aghara aghara n'ebe ezighị ezi, ma n'okpuru ebe eriri ọkụ gara nakwa ebe ndị ọzọ adịghị mma n'anya, bụ nke nwere ihe egwu dị iche ọ na-eweta.

Ọ kwuru na ihe ahụ so n'otu ụzọ gọọmenti si enweta ego o jiri arụrụ ụmụafọ steeti ahụ ọrụ, ma gbarụọ ihu  banyere etu ụfọdụ ndị mmadụ si eme ya etu o siri masị ha. Ọ dọkwazịrị aka na ntị na onye ọbụla e jidere ka ọ na-eme ihe dị etu ahụ ọzọ ga-abụ onye a ga-anwụchikọ ma kpụpụ ya ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee taa ya ahụhụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.