ANSPPB Akụtuola Ụlọ A Rụrụ Ebe Iwu Akwadoghị Na Nkpor

Mar 2, 2021 - 06:24
 0
ANSPPB Akụtuola Ụlọ A Rụrụ Ebe Iwu Akwadoghị Na Nkpor

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; maka na agadi nwaanyị kachie ntị wụfèé aja, e bute ozu ya n'ofete nke ọzọ.

O wee bụrụ etu ahụ ka ụlọọrụ 'Anambra State Physical Planning Board' (ANSPPB) siri wee kụtuo ụlọ a rụrụ n'ebe iwu akwdòghị na Nkpọr dị n'okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ANSPPB, bụ Maazị Chike Mmadueke kọwara ya bụ ọrụ ịkụtu ụlọ ahụ dịka nke dabara adaba n'usoro iwu n'ihi na ya bụ ụlọ bụ nke a rụchiri n'ebe okporoụzọ siri gaa n'akụkụ ụlọ abụọ ọzọ, ma bụrụkwa ebe e si abanye n'okporo ụzọ ọzọ dịkwa n'akụkụ ebe ahụ, bụzị nke mere ka ọ na-esiri ndị bi na mpaghara ahụ ike ịbanye n'ụlọ ha, ma ya fọdụzie ịgafè n'ebe ahụ.
 
Ọ kọwara na ebumnobi ụlọọrụ ahụ abụghị imegide maọbụ imekpà ụmụ mmadụ ahụ, kama na ọ bụrụ na ha akụtughị ụlọ dị etu ahụ ma leghàra ya anya, ị mara na ndị mmadụ ga na-arụzị ụlọ n'ebe ọbụla nà etu ọbụla ha chọrọ, bụ nke ọ kọwara dịka nke adabaghị adaba nà nke megidere ezi ebumnobi aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ bù n'obi n'ọrụ mmepe ọ na-abagide na seeti ahụ.

Ọ kpọkukwazịrị ndị na-arụ ụlọ ka ha gbaa mbọ na-enweta nkwàdo gọọmentị site n'aka ụlọọrụ gọọmentị dị iche iche e wepụtara maka ime nke ahụ, iji wee gbanahị ịkwa ngarammara n'oge ikpeazụ, maka na ajụghị ajụ wee rie na-ebute arịaghị arịa wee nwụọ.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị bi na mpaghara ahụ, bụ ndị achọghị ka a kpọọ aha ha, mèrè ka a mara na ha dọrọ onye nwe ụlọ ahụ (bụkwa onye bi na Lagos) aka na ntị megide ụdị ajọ ọrụ ahụ oge ọ na-arụ ya bụ ụlọ. Ha kwuru na ha nyekwàrà ụlọọrụ ANSPPB mkpesa banyere nke ahụ, bụkwazị nke mere ya bụ ụlọọrụ jiri zitere ya bụ nwa amadi ozi ịdọ aka na ntị ọtụtụ ugboro ka ọ kwụsị ya bụ ọrụ oge ha bịara hụchaa ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ. 

Ka o sila dị, ha kọwara na n'agbanyeghị ihe ndị a niile na ịdọ aka na ntị ahụ, na ya bụ nwoke gara n'ihu kachie ntị na-arụ ya bụ ụlọ ma na-arụsikwa ya ike, wee ruo ụbọchị ahụ a bịara kụtuo ya, o wee mee ya 'vam' n'anya. Ụfọdụ n'ime ha kwàrà arịrị na ha enwebeghị ike ịnyà ụgbọala ha wee pụọ kemgbe ihe dịka ọnwa ise ugbua, n'ihi na nwoke ahụ jiri ya bụ ụlọ wee rụchie ọnụụzọ ama ha ebe ha si apụta.

Ụlọọrụ ANSPPB nọkwara ụbọchị ahụ wee kụtuo ụfọdụ ihe ndị ọzọ iwu akwadoghị a rụrụ na mpaghara okporoụzọ ahụ, ebe ụfọdụ ndị na-arụkwa ọrụ n'ebe ahụ bụkwa ndị a nwụchikọrọ ụbọchị ahụ, ma bụrụkwa ndị a ga-akpụpụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee nye ha ọnọdụ, ma sikwazie n'ụzọ dị etu ahụ dọọ ndị ọzọ na-eme ihe dị etu ahụ aka na ntị maka adịghị ama ama 'O' gwara 'O'.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484