Anyị Agaghị Ekwe Ka Onye Ọbụla Gwou Ojoro -- APGA

Sep 11, 2017 - 11:03
Jan 23, 2021 - 18:00
 0
Anyị Agaghị Ekwe Ka Onye Ọbụla Gwou Ojoro -- APGA

Izunna Okafor, Awka, Nigeria

Ndi otu pati APGA ekwuona na ha agaghị ekwelata ka onye ọbụla ma ọ bụ otu pati ọbụla gwuo ojoro na nhọpụta ahụ na-abịa n'ihu na steeti Anambra, bụ nke a ga-ewere ọnọdụ n'abalị iri na asatọ nke ọnwa Nọvemba.

Onye isi otu pati ahụ n'ala anyị n'oge mbụ, ma bụrụkwa onye isi otu ịchụ nta nkwado maka ịhọpụtagharị gọvanọ Willie Obianọ nke ugboro abụọ, bụ Maazị Victor Umeh mere ka a mara nke a na nzukọ ha na ndị isi otu pati ahụ mere n'Awka.

O kwuru na ha ga-etinyesi atụmatụ  na amụma pụrụ iche n'ọrụ iji hụ na izuzu ọtụtụ ndị na pati ụfọdụ na-ezu iji wee gwuo ojoro na ya bụ nhọoụta, agaghị amịta mkpụrụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Chidi Igwe I was born in Nigeria and trained in Canada. With a Master of Arts in linguistics from the University of Regina, and PhD from Dalhousie University, I am currently an Assistant Professor at the University of Regina. I have taught French language and linguistics in various institutions, including the French Language Centre, Awka and Dalhousie University, Halifax. I am the author of Taking Back Nigeria from 419, published in 2007, and many scholarly articles in reputable academic journals. I am a passionate servant of the people.