Anyị Ga-Eji Usoro Ọchịchị Ụmụnna Wee Kwàlite Ọchịchị Onyekwuoucheya n'Anambra —ADC

Oct 28, 2021 - 23:47
 0
Anyị Ga-Eji Usoro Ọchịchị Ụmụnna Wee Kwàlite Ọchịchị Onyekwuoucheya n'Anambra —ADC


Izunna Okafor dere akụkọ a

Nwa amadi ahụ ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'African Democratic Congress (ADC)' were azọ ọkwa Gọvanọ steeti Anambra na nhọpụta ọchịchị ahụ a ga-eme n'abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a, bụ Dọkịta Akachukwu Nwankpọ ekwuola na ọ ga-eji usoro ọchịchị Ụmụnna wee kwàlite ọchịchị onyekwuoucheya n'ime steeti ahụ ma ọ bụrụ gọvanọ.

Onyeisi ngalaba mgbasaozi n'òtù achụmta nkwàdo Dọkịta Nwankpọ, bụ Dọkịta Harris Chuma-Odili, bụ ya kwupụtara nke n'aha Nwankpọ, oge ya na ndị nta akụkọ na-akparịta ụka n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra na nsonso a.

Dịka o siri kọwaa, atụmatụ ahụ, nke ọ kpọrọ “Umunna Revolution" (n'asụsụ bekee) ga-agbaso usoro ọchịchị ụmụnna e jiri mara Ndị Igbo wee mee ka gọọmentị dị ụmụ mmadụ nso, ma mekwa ka onye ọbụla, ma ndị bi n'ime-ime obodo nwee ike irite uru na iketà òkè site n'aka gọọmenti.

Ọ kpọpụtasịrị ọtụtụ úrù dị icheiche usoro ahụ ga-ewèta ma ọ bụrụ na e tinye ya n'ọrụ, nke gụnyere ime ka ọnụ ruo ndị mmadụ n'okwu na gọọmenti, ịkwalite ọnọdụ obibindụ ụmụafọ steeti ahụ na ezinụlọ dị icheiche, igbochi ajọ ọnọdụ nchekwa na ibèlàtà mpụ na arụrụala n'obodo site n'itinye ndị ntorobịa n'ihe a na-eme.

O kwupụtara ezi olileanya o nwere na atụmatụ ahụ ga-amịta mkpụrụ a tụrụ anya n'ịkwàlite ezi ọnọdọ mmepe obodo, ma sịkwa na steeti ndị ọzọ ga-amàlitekwa iñòmì na itinye atụmatụ ahụ n'ọrụ, ọkachasị na mpaghara ala Igbo, maka na ọ bụ usoro dịbara gboo n'ala Igbo, ma na-achọzịkwa ịnwụ anwụ ugbua n'ihi óké nñòmi usoro ọchịchị ndị ọcha.

Na ntụnye nke ya, onyeisioche òtù ADC n'ala Nigeria, bụ Maazị Ralph Nwosu kọwara usoro ahụ dịka nke magburu onwe ya, ma kwukwa na ọ ga-enye aka ịkwalite usoro ezinụlọ; ọbụladị dịka ọ katọrọ ma gbarụọ ihu banyere ajọ ọnọdụ nchekwa dịzị n'ala Nigeria ugbua.

Ọ kpọkuru gọọmenti etiti ka o mee ngwa tọhàpụ onyeisi ndị òtù 'Indigenous People of Biafra (IPoB)', bụ Maazị Nnamdị Kanu, ma gbasoo usoro mkparịtaụka, iji wèta udo tọrọ àtọ ma belata ịkpọ gànị-ganị na nsogbu ndị ọzọ a na-enwegasị n'ala Nigeria, ọkachasị na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, n'ihi ojiji ahụ e ji Maazị Kanụ.

O jikwazịrị ohere ahụ wee dụọ ndị ntorobịa òkù ka ha sepụ aka n'isunye ọgbaaghara, ma kpọkuo Ndị Anambra ka ha pụta n'ìgwè tụọ akwụkwọ n'abalị isii nke ọnwa ọzọ; iji hụ na onye ha achọghị ka ọ chịa ha achịghị ha maọbụ bụrụ onye e guzobere ka ọ chịa ha n'ike.

Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu n'ebe ahụ gụnyèrè odeakwụkwọ izugbe òtù ndọrọndọrọ ADC n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Gabriel Anthony, bụkwá onye tinyere ọnụ kpọkuo ụmụafọ steeti ahụ ka ha kwàdo ADC na ọmarịcha atụmatụ ahụ ma pụtakwa n'uju tụọ akwụkwọ ụbọchị satọdee abụọ na-abịa abịa ..

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484