Arụ! E Jidela Ụmụnwaanyị Abụọ Kechiri Ụmụaka Ọhụrụ Ha Zuru Ezu n'Ime Àkpà, Wee Na-Aga Lagos

Nov 22, 2021 - 21:59
 0

Izunna Okafor dere akụkọ a


Ọ bụ ihe doro anya na ọ na-abụ chi na-efo, ihe ọjọọ ana-abawayezị.

Ka ọ dị taa, e jidela ụmụnwaanyị abụọ zuru ụmụaka a mụrụ ọhụrụ, kechie ha n'ime àkpà, ma buru ha na-aga Lagos, ebe ha ga-ere ha.

Ndị arụrụala abụọ ahụ obi tara mmiri bụ ndị a nwụchikọrọ site n'aka ndị ọrụ nchekwa na mpaghara njikọ ụzọ Abomege, dị na steeti Ebonyi, oge ha nọ n'ụzọ wee na-aga Lagos ka ha ga ree ụmụaka ahụ.

Ka a gbara ha ajụjụọnụ, ha jikwazịrị ọnụ ha wee sàá asịsà na ọ bụ n'ime obodo ka ha siri zute ụmụaka abụọ ahụ, bụ ụmụejima, ma fọnye ha n'ime àkpà, ka ha ga resi ha otu nwaanyị.

Leelee/kirie onyoonyo abụọ a dị n'edemede a ka i jiri anya gị hụ ma jiri ntị gị nụ ka o siri mee:

Files

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484