Arụ n'Ala Igbo (1)

Arụ n'Ala Igbo (1)

Izunna Okafor dere edemede a

Ọ bụ ezie na Igbo na-sị na ọ na-abụ arụ gbàá ahọ, ọ bụrụ omenala; mana ọtụtụ aghọtaghị ihe nke ahụ pụtara.

Tupu mmadụ ọbụla aghọta ihe okwu a pụtara, ọ ga-ebu ụzọ ghọta ihe bụ arụ na ihe bụ omenala, nà ihe dị iche na ha abụọ, maka na onye amaghị ọfọ nna ya na-akpọ ya mkpìrìsì osisi. Onye amaghị azụ mmà anaghị ihu ya.

Na nkọwa m ebe a, aga m asị na omenala na arụ bụ akanri na akaekpe ndị Igbo. Ihe nke ahụ pụtara bụ na, a bịa n'ala Igbo, Omenala bụ akparamagwa, omume na ụfọdụ ihe ndị ọzọ ndị Igbo nabàtàrà nke ọma, na-emesi ya ike oge niile maọbụ na mgbe na mgbe, ma werekwazie ya dịka usoro obibindụ ha. Dịka aha ya siri dị, Omenala (Òmé n'ala) pụtara na ala na-anabata ihe ndị ahụ ma e mee ha, nke gosiri na ha bụ ezi ihe, maka na ala Igbo anaghị akwàdo maọbụ kwụdóró ihe ọjọọ. Ugbua ị ma nke a, ị ma nke ọzọ?

Gịnị bụ arụ? 

Arụ na nwanne ya Nsọala bụ ndịiche Omenala. Ihe nke a pụtara bụ na, dịka Omenala bụ ihe ala nabatàrà, Arụ na Nsọala bụ ihe rụrụ arụ na ihe ala na-asọ nsọ. Ya bụ na Arụ bụ akparamagwa na omume dị iche iche na-arụ ala afọ (na-akpasu àlà iwe maọbụ na-emerụ ya). Cheta na agwara m gị na ala Igbo anaghị akwàdo maọbụ kwụdoro ihe ọjọọ. A na-eme arụ na nzuzo; a naghị emekwa arụ oge niile, n'ihi na ọ bụ ihe a nabataghị anabata n'obodo. 

Ọ bụ nke a mere ndị Igbo jiri kwuo na ọ na-abụ arụ gbaa ahọ ọ bụrụ omenala; nke pụtara na ọ na-abụ arụ dịtòó aka maọbụ e mekarịa ya n'obodo, ọ dịzie ka ọ bụ ihe a nabatara anabata maọbụ ihe e jizịrị mere usoro obibindụ, maka na omenala bụ ihe ndị obodo nabatara ma jiri ya mere usoro obibindụ.

Ugbua ị ghọtagoro ihe ndị Igbo ji ekwu okwu a, ma ghọtakwa ihe dị iche n'etiti Arụ na Omenala, ọ dịkwa mkpa ka ị ghọta ihe dị iche n'etiti Arụ na Nsọala, tupu anyị akọzie n'ubi onye anyị bịara.

Arụ na Nsọala bụ ụmụnne abụọ yiri onwe ha, mana ha abụghị otu ihe, n'agbanyeghị na e nwere ụfọdụ ihe ha nwekọrọ ọnụ —ha abụọ bụ ihe ala na asọ nsọ, na ihe a nabataghị anabata n'obodo. Ha abụọ bụ ihe ọjọọ megide mmadụ na ala. 

Ndịiche dị n'etiti ụmụnne abụọ dàbèèrè n'ihe e mere kpọmkwem, onye mere ya na etu e siri mee ya, maka na arụsị niile bụ arụsị n'ezie, mana e nwere arụsị ka ibè ya njọ. Arụ niile bụ njọ, mana njọ niile abụghị arụ; etu ahụ ka ọ dịkwa na nsọala.

Ị ma na onye ji àkwá abụọ n'aka amaghị nke bụ óké na nwunyè. Ọzọkwa, ọ na-adị mma a na-egosi nwatàkịrị awọ n'ikpo okwute, a na-ebìbe ya aka, ka o wee mara nke bụ awọ na nke bụ okwute. Onye na-akọ ọrụ kwèsìkwàrà ịdị na-akpa ókè ala nke ọma, maka echi na ụmụnnadi. N'ihi ihe ndị a, ọ ga-adị mkpa iji ọmụmaatụ wee kọwaa ndịiche n'etiti Arụ na Nsọala.

N'ala Igbo gbaa gburugburu, Nsọala gụnyere ihe ndị a: mmadụ ịkpacha anya gbuo anụ ụlọ mmadụ,  nwaanyị ịrị elu nkwụ/akwụ, nwanyị ịwa ọjị maọbụ ịtụtụ ọjị dara ada, izu ohi, nwanyị ịnara nwanyị ọzọ di ya, nwoke ịkpọrọ nwunye mmadụ, ịkpacha anya suo ụlọ mmadụ ọkụ, idobere maọbụ ilìrì mmadụ ọgwụ, ịzọrọ/ịkpara ala mmadụ n’ike, mmadụ ịgbà/idinà anụmanụ (mmadụ na anụmanụ inwe mmekọ nwoke na nwaanyị), nwaanyị ịta eko ọkụkọ.

Ndị ọzọ gụnyere: izu nwa mmadụ n’ohi, nwata iji ụkwụ wee pụta n'afọ nne ya oge a na-amụpụta ya, nwata ibu ụzọ puo eze elu, ịkutu ụlọ mmadụ rụrụ, mmadụ ikpo ibè ya ntụ n'ahụ, nwaanyị iwepù nkụ nwaanyị ibe ya sonyere n'ọkụ oge ha na-enwe nsogbu, nwata ịkparị maọbụ iti okènyè ihe, mmadụ ịtụ nna ya/nne ya n'ala, nwaanyị ịtụ di ya n'ala, igbu anụnsọ/anụ obodo na-asọ nsọ igbu, mmadụ ihogharị osisi dị n'ókè àlà, nwaanyị ịbọrọ mmadụ ikè, ewu ịnọ n'ọgbụ/eriri wee mụọ nwa.

Ọ ga-aka mma ịgbado ya ebe a n'ihe gbasaara Nsọala, ka ọ dịbazie ụbọchị anyị m ga-eji Nsọala mere isiokwu, ka anyị wee labàá ya anya, maka na ngwùgwù a ga-atọghe atọghe, ọ dịghị mma ka a tụọ ya mbọ.

Dịka anyị hụgoro ọmụmaatụ Nsọala, ọ ga-adịkwa mkpà ka anyị hụkwa ọmụmaatụ Arụ. Ụfọdụ Arụ zuru igbo ọnụ gụnyèrè: izu ohi ji n'ọba/n'ubi mmadụ, igbu ọchụ, ụmụnne nwoke na nwanyị inwe mmekọ nwoke na nwanyị, nwanne ịlụ nwanne ya, nwoke idinà nwunye nwanne ya, nwoke na nwoke ibe ya maọbụ nwaanyị na nwaanyị ibe ya inwe mmekọ, mmadụ ịkwụ ụdọ/igbu onwe ya, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

Igbo sị na ọ na-abụ ebe ọkụ nyụọrọ a wụsa ọwa. N'ihi nke a, anyị ga-agbadokwa ya ebe a ugbua n'ihe gbasaara Arụ, ma laghachikwa azụ na ya oge ọzọ, maka na ofe tọrọ ụtọ anaghị adị mma ka a gọọ ya àgwọọ.

Ya bụ, chebirikwa anyị ọzọ n'isiokwu a n'oge adịghị anya, ka anyị wee malitekwa ebe anyị kwụsịrị ugba. Mana, tupu mgbe ahụ, a rịọ m gị, emekwala arụ...
 

*************************************************

Izunna Okafor bụ nwaafọ Ebenator dị n'okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ nke steeti Anambra. Ọ bụ onye edemede iduazị na abụ, onye nta akụkọ na onye nkwàlite asụsụ Igbo. Ọ gụrụ na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ ebe o mere maka ihe ọmụmụ nhazi ọhanaeze bụ 'Public Administration' n'olu bekee.

Dịka onye edemede, o nwetala ntúrú ùgò na nkwanye ùgwù karịrị iri abụọ na ise n'ihe gbasaara edemede, site n'ala anyị na n'ogoogo mba òfèsi. Nturu ùgò na nkwanye ùgwù ndị ahụ gụnyere: Nigerian Writers Award/Indigenous Writer of The Year 2015/2016; Pita Nwanna Award for Igbo Literature 2015; Nigerian Heritage Icon Award/Young Writer of the Year Federal Republic of Nigeria 2016; Anambra Exclusive Youth Choice Award/Youth Writer of The Year 2016; Future Award Africa 2016/African Prize For Education; SLAM Hero Youth International Award/Innovative Youth of the Year 2016;  Inspire Award/Outstanding Youth in Academics 2017; Ezenwa Ohaeto Prize for Young Nigerian Novelists 2015; Campus Best Writer/Journalist of The Year 2018, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Dịka onye nta akụkọ, ọ rụọla n'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ dị iche iche, ma bụrụkwa onye edemede na onye ntaakụkọ n'Igbo Radio.

Izunna na-ede akwụkwọ n'asụsụ Igbo na n'asụsụ bekee, ma bụrụkwa onye e jìrì ịkwàlìtè asụsụ na omenala Igbo wee mara.
O deela akwụkwọ asatọ, ma nwekwa edemede karịrị narị asatọ n'ọnụ ọgụgụ o bipùtagòrò n'ìkùkù. Ọ bụ onye isi òtù jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra.

What's Your Reaction?

like
0
dislike
0
love
0
funny
0
angry
0
sad
0
wow
0
Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484

We and selected partners use cookies or similar technologies as specified in the Privacy Policy. You can consent to the use of such technologies by closing this notice, by interacting with any link or button outside of this notice, or by continuing to browse otherwise.