Arụ n'Ala Igbo (II)

May 27, 2021 - 18:51
 0
Arụ n'Ala Igbo (II)

Izunna Okafor dere edemede a

N'izuụka gara aga ka anyị malitere ileba anya n'isiokwu a, ma bụrụkwa nke m sitegoro na ya wee nye nkọwa ihe gbasaara arụ, ihe dị iche n'etiti ya na nsọala, ma nyekwa ọmụmaatụ arụ na nsọala.

Ka ọ dị taa, ihe anyị ga-elebà anya n'ihe olenaole fọrọ banyere isiokwu ahụ, wee mazie ya ákpụ. Ọkụ anyị nyụrụ n'izuụka gara aga oge anyị kpọpụtachara ụfọdụ ọmụmaatụ arụ na nsọala; anyị wee wụsa ọwa n'ebe ahụ.

N'ibidokwa n'ebe anyị kwụsịrị, ọ dị mkpà ịkọwapụta na e nwere etu e si emeso onye mere nsọala n'ala Igbo, ma nwekwa etu e si emeso onye mere arụ. N'ala Igbo, ọ bụrụ na mmadụ mee nsọala n'obodo, (ya bụ, ọ bụrụ na mmadụ mee ótù n'ime ihe ndị ahụ anyị kpọptasịrị n'izuụka gara aga dịka ọmụmaatụ nsọala), obodo nwèrè usoro dị iche iche ha ga-esi mesò onye ahụ, dịka o siri metụta ntaramahụhụ a ga-enye onye ahụ, bụkwa nke dabeere n'ihe onye ahụ mere kpọmkem.

Iji maa atụ, ụfọdụ nsọala nwèrè ike ịdọtara onye mere ya ntaramahụhụ dị iche iche ndị obodo maọbụ onye o mere ihe ahụ ga-enye ya, nwéé ike wètara onye ahụ ịdà nha (n'ụdị ego maọbụ n'ụdị ihe onwunwe ndị ọzọ a ga-asị ya kwụọ maọbụ wètá), nwekwazie ike wètara onye ahụ ọsụsụ (ịsụ onye ahụ àsụ). Ịsụ mmadụ pụtàrà ndị obodo ịkpachapụ onye ahụ n'akụkụ, lechàrá ya na ihe ọbụla metụtara ya anya, màchie onye ahụ isonye n'ihe ọbụla obodo na-eme, ma màchikwa onye ọbụla ịga be onye ahụ maọbụ sonye n'ihe ọbụla onye ahụ na-eme na-ezinụlọ ya, dịka ịkwa ozu, ịlụ nwaanyị, tinyere mmemme ndị ọzọ na ihe ọbụla onye ahụ na-eme be ya, ruo oge ndị obodo kwekọrịtara maọbụ mgbe onye ahụ mere ihe ndị obodo gwara ya mèé. Ihe ndị niile bụcha ntaramahụhụ e ji eso onye mere nsọala n'ala Igbo, dàbere n'ụdị nsọala onye ahụ mere kpọmkwem, onye mere ya, maọbụ ebe o mere ya.

Ka o sila dị, ihe dị iche dị n'ebe onye mere arụ nọ, maka na arụ bụ nnukwu ajọ ihe megide mmadụ, àlà, na ndị mbụ na ndị ègèdè. Ọ bụrụ na mmadụ mee arụ n'ala Igbo, dàbere n'ụdị arụ onye ahụ mere, a na-akpụgharị onye ahụ n'obodo. Oge ụfọdụ, a na-agbaba onye ahụ ọtọ ma kee ya ọmụ (ọmụnkwụ) n'ahụ niile, wee kpụgharịba ya. Ọ bụrụ onye jere ohi ji maọbụ ohi ihe dị añaa, a na-ebokwa onye ahụ ihe ahụ o zuru n'isi, wee na-akpụgharị ya n'obodo. Ọ bụ ndị obodo na-enupụta n'ìgwè wee kpụgharịa onye ahụ. 

Oge ụfọdụ, mmọnwụ na ndị mmọnwụ na-esòkwazị akpụgharị onye mere arụ n'obodo. Ọ bụrụ na a kpụgharịchaa onye ahụ, a na-achụpụkwazị ya n'obodo ahụ, ma chụtèé ya obodo tere aka. Mmọnwụ na ndị mmọnwụ na-esokwa eme nke a n'ọtụtụ obodo. Ụfọdụ na-eti onye ahụ ihe oge ụfọdụ ma mekwa ya àkàje dị iche iche oge a na-akpụgharị ya, ka nke ahụ wee bụrụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị ọzọ na-ezùbekwa ime ihe dị etu ahụ n'ọdịnihu. 

N'ụfọdụ obodo, n'oge gboo, a na-etigbukwa onye mere arụ etigbu, dịka ihe o mere siri wee dị. I ji maa atụ, ọ bụrụ n'oge gboo, n'obodo Ebenator dị n'okpuru ọchịchị 'Nnewi South' nke steeti Anambra, ọ bụrụ na mmadụ mee arụ, a na-akpụrụ onye ahụ wee gagharịa n'ihu àlà niile dị n'obodo ahụ, wee bịazie tigbuo ya n'ihu ala nke kacha wee bụrụ okenye, bụ nke dị n'Ụmụonyeukpa, nke bụ otu n'ime ógbè atọ dị n'obodo ahụ. Mana ka ọ dị taa, a naghị emezị ihe ndị ahụ ugbua, maka na égwú adagharịala, dịka o siri metụta etu ndị Igbo si eme ihe, tinyekwuoro na ndị ụka na gọọmentị bịazịrị were ọnọdụ ma wepụtazie iwu gọọmentị; ihe ndị ahụ wee na-alazị azụ. Ọ bụzị nchụpụ ka a na-achụpụkarị onye mere arụ ugbua n'obodo dị iche iche, maọbụkwanụ e nye onye ahụ ntaramahụhụ kwesiri ihe o mere.

Ọ bụrụ na ihe ndị a gachazie, a na-emekwazị ihe a na-akpọ ịkpụ arụ, maka na arụ a kpụghị akpụ na-agba ụmaradi n'ala Igbo. Ọ dị mma ime ka ị mara na arụ ọbụla e mere n'ala Igbo nwèrè mmụọ e mejọrọ, ya na ala e merụrụ. Ọ bụ n'ihi nke a ka ndị Igbo ji akpụ arụ akpụ.

Ịkpụ arụ, bụ mmemme/omenala a na-eme oge e mere arụ n'obodo, iji wee mee ka obi mmụọ maọbụ ala e mejọrọ/merụrụ dàjụọ ma kutuo, ka iwe ha wee ghara ịdịzị ọkụ n'ebe obodo ahụ maọbụ onye/ndị mere arụ ahụ nọ.

Ihe ọzọ dịkwa oke mkpa i kwesiri ịghọta bụ na ọ bụghị onye ọbụla nwere ike ịkpụ arụ n’ala Igbo. E nwere ndị ọ dịịrị. A bịa n'ala Igbo, n'oge gboo, ndị na-akpụkarị arụ bụ ndị Nri, bụ obodo dị n'okpuru ọchịchị ime obodo Anaọcha, na steeti Anambra, n'ihi na ọ bụ ebe ahụ ka Igbo bidoro wee gbasasịa. Ndị na-akpụkarị arụ ahụ oge ahụ bụ ndị àkàkpọ/àkàkpụ/akahịa, bụ ndị sụrụ mkpụmkpụ nke ukwuu, ma bụrụkwa oke dibịa kara aka. Mana ugbua, àgbụrụ Nri agbasasịala ebe niile n'ala Igbo, nke na ụfọdụ anaghịzị achọrọzị ndị Nri gaba na Nri kpọmkwem ka ha bịa kpụọ arụ, maka na ha na-emezị ya na ọ na-abụ ebe e zùtèrè dibịa, a gbara ya afa.

Ọ bụrụ na a chọba ịkpụ arụ, e nwègàsịrị ụfọdụ ihe dị iche iche e nwere ike ịsị ka e wèta, maka iji kpụọ ya bụ arụ, nke gụnyere ọjị Igbo, ji, ọkụkọ, ewu, ebule, ehi, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ. Ihe a ga-ana maka ịkpụ arụ ọbụla dàbèèrè n'ụdị arụ e mere. A naghị akpụ arụ na nzuzo, n'ihi na a na-enwe ndị akaebe na ndị ọnọmgbeomere, màkà echi. Onye ahụ mere arụ ga-ekwetekwa n'eziokwu na o mere arụ, tupu e nwee ike ịkpụ ya bụ arụ o mere.

Ọ bụrụ na a kpụchaa arụ oge ụfọdụ, a na-agbanyere ya mkpọala maọbụ mkpọnala (dịka ndị si asụ). Obodo na-enwekwa ọñụ na nkasiobi ma a kpụchaa arụ, maka na e bupùrula ha ihe ọdachi gaara ịdakwasa ha, ụmụ ha maọbụ àgbụrụ/ọgbọ na-abịa abịa ma ọ bụrụ na ha akpụghị arụ ahụ, maka na ọ na-abụ onye nyụọ nsị n'ụlọ ekpoghị ya ekpo, o jighị imi rie ya, o were ụkwụ maọbụ aka rie ya.

N'eziokwu, arụ bụ ajọ ihe, ma kwesikwa ka a gbaara ya ọsọ, n'ihi ọtụtụ ihe ọjọọ, ihe ichu aha na ihe ọghọm dị iche iche na-esi na ya apụta. Mgbada dara ada n'ugwu, bụ ya mekwàrànụ onwe ya. Ọ na-abụkwa agadi nwaanyị kachie ntị wụọ aja, ebute ozu ya n'ófète nke ọzọ. Onye a gwara kwe na-abụ a hụ ọzọ a gwakwa ya; mana onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ. Ya mere, arịọ m ụnụ niile, onye emekwala arụ.

Ndeewo.

**************************************************

Izunna Okafor bụ nwaafọ Ebenator dị n'okpuru ọchịchị Nnewi Sawụtụ nke steeti Anambra. Ọ bụ onye edemede iduazị na abụ, onye nta akụkọ na onye nkwàlite asụsụ Igbo. Ọ gụrụ na mahadum Nnamdị Azikiwe dị n'Awka, bụ ebe o mere maka ihe ọmụmụ nhazi ọhanaeze bụ 'Public Administration' n'olu bekee.

Dịka onye edemede, o nwetala ntúrú ùgò na nkwanye ùgwù karịrị iri abụọ na ise n'ihe gbasaara edemede, site n'ala anyị na n'ogoogo mba òfèsi. Nturu ùgò na nkwanye ùgwù ndị ahụ gụnyere: Nigerian Writers Award/Indigenous Writer of The Year 2015/2016; Pita Nwanna Award for Igbo Literature 2015; Nigerian Heritage Icon Award/Young Writer of the Year Federal Republic of Nigeria 2016; Anambra Exclusive Youth Choice Award/Youth Writer of The Year 2016; Future Award Africa 2016/African Prize For Education; SLAM Hero Youth International Award/Innovative Youth of the Year 2016;  Inspire Award/Outstanding Youth in Academics 2017; Ezenwa Ohaeto Prize for Young Nigerian Novelists 2015; Campus Best Writer/Journalist of The Year 2018, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Dịka onye nta akụkọ, ọ rụọla n'ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ dị iche iche, ma bụrụkwa onye edemede na onye ntaakụkọ n'Igbo Radio.

Izunna na-ede akwụkwọ n'asụsụ Igbo na n'asụsụ bekee, ma bụrụkwa onye e jìrì ịkwàlìtè asụsụ na omenala Igbo wee mara.
O deela akwụkwọ asatọ, ma nwekwa edemede karịrị narị asatọ n'ọnụ ọgụgụ o bipùtagòrò n'ìkùkù. Ọ bụ onye isi òtù jikọtara ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n'ala Nigeria, ngalaba steeti Anambra.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484